Ngụgụ Obi Site n’Aka “Chineke nke Nkasi Obi Nile”
“Onye a gọziri agọzi ka Ọ bụ, bụ́ Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ́ Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile; Onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile.”—2 NDỊ KỌRINT 1:3, 4.
1, 2. Ụdị nkasi obi dị aṅaa dị ndị na-eru újú mkpa?
NDỊ na-eru újú chọrọ ezi nkasi obi—ọ bụghị okwu ndị a na-ejikarị eme ihe ma ọ bụ okwu na-adapụtakarị ndị mmadụ n’ọnụ. Anyị nile anụwo na ‘e mesịa ọ ga-adị mma,’ ma n’oge mmalite nke ịbụ onye mmadụ nwụnahụrụ, olee onye na-eru oké újú nke echiche dị otú ahụ na-akasi obi? Ndị Kraịst maara na Chineke ekwewo nkwa mbilite n’ọnwụ, ma nke ahụ adịghị egbochi oké ihe mgbu na nchegbu nke ọnwụ bịara ná mberede. N’eziekwa ọ bụrụ na nwa gị anwụnahụwo gị, ụmụ gị ndị ọzọ ka dị ndụ agaghị edochili anya onye nke ahụ dị oké ọnụ ahịa.
2 N’oge mmadụ nwụrụ, ezi nkasi obi na-enyere anyị aka karịsịa, nkasi obi nke nwere mgbakwasị ụkwụ siri ike ná nkwa Chineke. Ọmịiko dịkwa anyị mkpa. Nke a abụwo nnọọ eziokwu n’ebe ndị Rwanda nọ, karịsịakwa maka ọtụtụ narị ezinụlọ nke Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ bụ́ ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụworo ha ná mgbukpọsị agbụrụ dị oké njọ ahụ. Site n’aka ònye ka ndị nile na-eru újú pụrụ inweta nkasi obi?
Jehova—Chineke nke Nkasi Obi
3. Olee otú Jehova siworo setịpụ ihe nlereanya n’inye nkasi obi?
3 Jehova esetịpụwo ihe nlereanya n’inye anyị nile nkasi obi. O zitere Ọkpara ya ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Kraịst Jisọs, n’ụwa inye anyị nkasi obi na olileanya ebighị ebi. Jisọs kụziri, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karị nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) N’oge ọzọ o kwuru, sị: “Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi, ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Pọl kwukwara, sị: “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Ndị Rom 5:8) Site n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ, anyị na-aghọta ịhụnanya nke Chineke na nke Kraịst Jisọs.
4. N’ihi gịnị ka Pọl onyeozi ga-eji nye Jehova ekele karịsịa?
4 Pọl onyeozi makwaara banyere amara Jehova karịsịa. A dọpụtawo ya site n’ọnọdụ ọnwụ ime mmụọ, site n’ịbụ onye obi ọjọọ na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst gaa n’ịbụ onye Kraịst a na-akpagbu n’onwe ya. (Ndị Efesọs 2:1-5) Ọ kọwara ahụmahụ ya: “Mụ onwe m dịkarịsịrị nta n’etiti ndị ozi, ebe m na-erughị ka a kpọọ m onye ozi, n’ihi na esogburu m nzukọ Chineke. Ma site n’amara Chineke abụ m ihe m bụ: a hụkwara na amara Ya nke e nyere m abụghị ihe efu; kama adọgbubigara m onwe m ókè n’ọrụ karịa ha nile: ma ọ bụghị mụ onwe m, kama amara Chineke nke sooro m.”—1 Ndị Kọrint 15:9, 10.
5. Gịnị ka Pọl dere banyere nkasi obi sitere n’aka Chineke?
5 Ya mere n’ụzọ kwesịrị ekwesị, Pọl dere, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Ọ bụ, bụ́ Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ́ Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile; Onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile, ka anyị wee pụọ isite ná nkasi obi nke Chineke ji kasie anyị onwe anyị obi kasie ndị ahụ obi ndị nọ ná mkpagbu ọ bụla. N’ihi na dị ka ahụhụ nile Kraịst hụrụ na-ababiga ókè n’ebe anyị nọ, otú a ka nkasi obi anyị na-ababigakwa ókè site n’aka Kraịst. Ma ọ bụrụ na a na-akpagbu anyị, ọ bụ n’ihi nkasi obi unu na nzọpụta unu; ọ bụrụkwa na a na-akasi anyị obi, ọ bụ n’ihi nkasi obi unu, nke na-arụsi ọrụ ike n’ịtachi obi n’otu ahụhụ ahụ nke anyị onwe anyị na-ahụkwa: olileanya anyị banyere unu na-eguzosikwa ike; ebe anyị matara na, dị ka unu bụ ndị na-enwekọ ahụhụ nile, otú a ka unu na-enwekọkwa nkasi obi ahụ.”—2 Ndị Kọrint 1:3-7.
6. Gịnị ka okwu Grik ahụ a sụgharịrị “nkasi obi” gụnyere?
6 Lee okwu ndị na-akpali akpali ndị ahụ bụ! Okwu Grik a sụgharịrị ebe a ịbụ “nkasi obi” bụ nke e jikọrọ ya na “ọkpụkpọ òkù ịbịa nọrọ mmadụ n’akụkụ.” Ya mere, “ọ bụ iguzo n’akụkụ mmadụ iji gbaa ya ume mgbe ọ na-agafe ule siri ike.” (A Linguistic Key to the Greek New Testament) Onye ọkà mmụta Bible dere, sị: “Okwu ahụ . . . na-apụtakarị ihe karịrị ọmịiko na-adajụ obi. . . . Nkasi obi ndị Kraịst bụ nkasi obi na-eweta agbamume, nkasi obi nke na-enye mmadụ ume ịnagide ihe isi ike nile nke ndụ.” Ọ gụnyekwara okwu na-akasi obi ndị na-adabere ná nkwa na olileanya siri ike—nke mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.
Jisọs na Pọl —Ndị Nkasi Obi Nwere Ọmịiko
7. Olee otú Pọl si bụrụ onye na-akasi ụmụnna ya ndị Kraịst obi?
7 Lee ihe nlereanya magburu onwe ya Pọl bụ n’inye nkasi obi! Ọ pụrụ idegara ụmụnna nọ na Tesalọnaịka akwụkwọ, sị: “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nwanyị nke na-azụ nwa na-elezi ụmụ nke aka ya anya nke ọma: otú a, ebe unu dị anyị n’obi nke ukwuu, ọ dịrị anyị ezi mma ime ka unu keta, ọ bụghị nanị ozi ọma nke Chineke, kama ọ bụkwa mkpụrụ obi nke aka anyị, n’ihi na e mere ka unu bụrụ ndị anyị hụrụ n’anya. Ọbụna dị ka unu matara otú anyị meere mmadụ nile ọ bụla n’ime unu, dị ka nna si emere ụmụ nke aka ya, na-arịọ unu, na-akasikwa unu obi, na-agwasikwa unu okwu ike.” Dị ka nne na nna na-ahụ n’anya, ndị na-echegbu onwe ha, anyị nile pụrụ isoro ndị ọzọ kerịta ikpo ọkụ na nghọta anyị n’oge ha nọ ná mkpa.—1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8, 11.
8. N’ihi gịnị ka ozizi Jisọs ji bụrụ ihe nkasi obi nye ndị na-eru újú?
8 N’igosi ụdị nchegbu na obi ọma dị otú ahụ, Pọl nọ nanị na-eṅomi Onye Nlereanya ukwu ya, bụ́ Jisọs. Cheta ọkpụkpọ òkù ọmịiko nke Jisọs kpọrọ ndị nile dị ka e dekọrọ ya na Matiu 11:28-30: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” Ee, ozizi Jisọs na-enye ume ọhụrụ n’ihi na ọ na-enye olileanya na nkwa—nkwa nke mbilite n’ọnwụ. Nke a bụ olileanya na nkwa nke anyị na-eche n’ihu ndị mmadụ, dị ka ihe atụ, mgbe anyị hapụụrụ ha broshuọ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. Olileanya nke a pụrụ inyere anyị nile aka, ọbụna ọ bụrụ na anyị anọwo na-eru újú ruo ogologo oge.
Otú E Si Akasi Ndị Na-eru Újú Obi
9. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji bụrụ ndị na-enweghị ndidi n’ebe ndị na-eru újú nọ?
9 Iru újú abụghị nke a kpaara ókè n’oge a kara aka ngwa ngwa mgbe onye ahụ a hụrụ n’anya nwụsịrị. Ndị ụfọdụ na-ebu ibu arọ nke iru újú ha n’afọ ndụ ha nile, karịsịa ndị ụmụ ha nwụnahụworo ha. Nwa nwoke dị afọ 11 nke di na nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị Kraịst na Spain nwụnahụrụ ha n’afọ 1963 dị ka onye rịara ọrịa meningitis. Ruo taa, ha ka na-ebe ákwá mgbe ha na-ekwu banyere Paquito. Ememe mgbaafọ, foto, ihe ncheta dị iche iche, pụrụ ịkpalighachi ihe ncheta ndị dị mwute. Ya mere, anyị ekwesịghị ịbụ ndị na-enweghị ndidi ma chee na ndị ọzọ kwesịrị ịgbakewo site n’ọnwụ mmadụ ahụ ma ọ na-erule ugbu a. Otu akwụkwọ banyere ọgwụ na ahụ ike kwenyere, sị: “Ịda mbà na mgbanwe mmetụta uche pụrụ ịnọte aka ruo ọtụtụ afọ.” Ya mere, cheta na dị ka apa nkịtị n’elu ahụ pụrụ ịdịgide ruo ogologo afọ ndụ anyị nile, otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ apa mmetụta uche.
10. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nyere ndị na-eru újú aka?
10 Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị dị irè anyị pụrụ ime iji kasie ndị na-eru újú n’ọgbakọ ndị Kraịst obi? N’ezi obi nile anyị pụrụ ịgwa nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị nọ ná mkpa nke nkasi obi, sị, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ bụla m pụrụ ime iji nye aka, biko mee ka m mara.” Ma ugbo ole ka onye mmadụ nwụnahụrụ n’ezie na-akpọ anyị kwuo sị, “Echewo m banyere ihe ị pụrụ ime iji nyere m aka”? N’ụzọ doro anya, ọ dị anyị mkpa ịmalite ime ihe kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na anyị ga-akasi onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ obi. Ya mere, gịnị ka anyị pụrụ ime n’ụzọ bara uru? Ndị a bụ aro ole na ole ndị dị irè.
11. Olee otú anyị ige ntị pụrụ isi kasie ndị ọzọ obi?
11 Gee Ntị: Otu n’ime ihe ndị kasị mma ị pụrụ ime bụ isoro onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ kerịta ihe mgbu ya site n’ige ntị. Ị pụrụ ịjụ, “Ị̀ ga-enwe mmasị ikwu okwu banyere ya?” Kwe ka onye ahụ kpebie. Otu onye Kraịst chetara mgbe nna ya nwụrụ: “O nyeere m aka n’ezie mgbe ndị ọzọ jụrụ m ihe merenụ ma mgbe ahụ gee ntị nke ọma.” Dị ka Jemes dụrụ ọdụ, dị ngwa ige ntị. (Jemes 1:19) Jiri ndidi na ọmịiko gee ntị. “Na-esonụ ndị na-akwa ákwá n’ịkwa ákwá,” ka Bible na-atụ aro ya ná Ndị Rom 12:15. Cheta na Jisọs sooro Mata na Meri kwaa ákwá.—Jọn 11:35.
12. Ụdị mmesi obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inye ndị na-eru újú?
12 Nye ihe mmesi obi ike: Buru n’uche na onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ pụrụ inwe mmetụta obi amamikpe na mbụ, na-eche na ma eleghị anya na e nwekwuru ihe ọ gaara eme. Mesie onye ahụ obi ike na o yiri ka e mere ihe nile kwere omume (ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ị maara na ọ bụ eziokwu ma zie ezie). Mesie ya obi ike na mmetụta ọ na-enwe apụghị ịbụ ma ọlị ihe a na-adịghị ahụkebe. Gwa ya banyere ndị ọzọ ị maara bụ́ ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ịgbake site n’ọnwụ yiri nke a. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, nwee nghọta na ọmịiko. Enyemaka obi ọma anyị pụrụ ịrụzu ihe dị ukwuu! Solomọn dere, sị: “Mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ.”—Ilu 16:24; 25:11; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:11, 14.
13. Ọ bụrụ na anyị anọrọ nso, olee otú nke ahụ pụrụ isi nye aka?
13 Nọrọ nso: Mee ka gị onwe gị nọrọ nso, ọ bụghị nanị n’ime ụbọchị ole na ole ndị mbụ mgbe ọtụtụ ndị enyi na ndị ikwu nọ ya, kama mgbe ọtụtụ ọnwa gasịrị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, mgbe ndị ọzọ laghachiworo n’usoro ihe omume ha. Oge iru újú ahụ pụrụ ịdị iche nke ukwuu, na-adabere n’onye ahụ. Mmasị na ọmịiko ndị Kraịst anyị pụrụ ịrụzu ihe dị ukwuu n’oge e nwere mkpa. Bible sịrị na “onye na-ahụ n’anya dị [nke] na-arapara n’ahụ karịa nwanne.” Ya mere, okwu ahụ bụ́, “Enyi ná mkpa bụ enyi n’ezie,” bụ nnọọ eziokwu anyị kwesịrị itinye n’ọrụ.—Ilu 18:24; tụlee Ọrụ Ndị Ozi 28:15.
14. Gịnị ka anyị pụrụ ikwu banyere ya iji kasie ndị mmadụ nwụnahụrụ obi?
14 Kwuo okwu banyere àgwà ọma nke onye ahụ nwụrụ anwụ: Nke a bụ ụzọ na-enye aka nke ukwuu mgbe e mere ya n’oge kwesịrị ekwesị. Kerịta akụkọ ziri ezi nke na-akpali mmasị bụ́ ndị i chetara banyere onye ahụ. Atụla ụjọ iji aha onye ahụ eme ihe. Emela ka a ga-asị na onye ahụ a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ enweghị mgbe ọ bụla ọ dịrị adị ma ọ bụ na ọ bụ onye na-adịghị mkpa. Ọ na-akasi obi ịmara ihe otu akwụkwọ sitere Harvard Medical School kwuru: “A na-agbaketụ mgbe onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ pụrụ n’ikpeazụ iche banyere onye ahụ nwụrụ anwụ n’enweghị mwute na-erikpu erikpu . . . Ka a na-anakwere ma na-aghọta ihe ọhụrụ merenụ, iru újú na-aghọ ihe ncheta dị oké ọnụ ahịa.” “Ihe ncheta dị oké ọnụ ahịa”—lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi icheta oge ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa e soro onye a hụrụ n’anya nọkọọ! Otu Onyeàmà nna ya nwụnahụrụ afọ ole na ole gara aga kwuru, sị: “Ihe ncheta pụrụ iche nye m bụ isoro papa m na-agụ Bible ntakịrị oge mgbe ọ malitesịrị ịmụ eziokwu ahụ. Nakwa idina ala n’ụsọ osimiri na-ekwurịta banyere ụfọdụ nsogbu m. M na-ahụ ya nanị afọ atọ ma ọ bụ afọ anọ ọ bụla, ya mere oge ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa.”
15. Olee otú mmadụ pụrụ isi buru ụzọ mee ihe iji nye aka?
15 Bute ụzọ n’ime ihe mgbe o kwesịrị ekwesị: Ndị ụfọdụ na-eru újú pụrụ ịnagide ya nke ọma karịa ndị ọzọ. Ya mere, na-adabere n’ọnọdụ ndị dịnụ, were nzọụkwụ ndị dị irè iji nye aka. Otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst na-eru újú chetara, sị: “Ọtụtụ ndị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ọ dị ihe m pụrụ ime, mee ka m mara.’ Ma otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst ajụghị. Ọ bakpuru n’ime ụlọ ihi ụra, sere ákwà a tọrọ n’elu àkwà, ma saa ákwà ndị ahụ metọrọ emetọ. Onye ọzọ buuru bọket, mmiri, na ihe ndị e ji asacha ihe ma sachapụ ihe a tọrọ n’ala ụlọ ebe di m gbọrọ ihe. Ndị a bụ ezi ndị enyi, agaghịkwa m echezọ ha ma ọlị.” Ebe e nwere mkpa pụtara ìhè maka enyemaka, buru ụzọ mee ihe—ma eleghị anya site n’ịkwado ihe oriri, inye aka n’ihichasị ihe, ma ọ bụ ịga ozi. Otú ọ dị, anyị kwesịrị ịkpachara anya ịghara ịdị na-amabanye mgbe onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ chọrọ ịnọ nanị ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị iburu n’obi okwu Pọl: “Ya mere dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ ndị a hụwokwara n’anya, yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” Obi ọma, ndidi, na ịhụnanya adịghị ada ma ọlị.—Ndị Kọlọsi 3:12; 1 Ndị Kọrint 13:4-8.
16. N’ihi gịnị ka akwụkwọ ozi ma ọ bụ kaadị pụrụ iji nye nkasi obi?
16 Dega akwụkwọ ozi ma ọ bụ ziga kaadị na-akasi obi: A na-elegharakarị abamuru nke akwụkwọ ozi ma ọ bụ kaadị ọmịiko mara mma anya. Gịnị bụ abamuru ya? A pụrụ ịgụghachi ya ọtụtụ ugbo. Ụdị akwụkwọ ozi ahụ adịghị mkpa ịdị ogologo, ma o kwesịrị igosi ọmịiko gị. O kwesịkwara inwe ihe ime mmụọ n’ime ya n’abụghị nke ime nkwusa. Nanị ozi bụ isi bụ́ “Anyị nọ gị nso” pụrụ ịbụ ihe ngụgụ obi.
17. Olee otú ekpere pụrụ isi weta nkasi obi?
17 Soro ha kpee ekpere: Elelịla abamuru nke ekpere i soro ndị Kraịst ibe anyị mmadụ nwụnahụworo kpee na ndị i kpere maka ha. Bible sịrị na Jemes 5:16: “Arịrịọ nke onye ezi omume dị ike nke ukwuu.” Dị ka ihe atụ, mgbe ndị na-eru újú nụrụ ka anyị na-ekpe ekpere maka ha, ọ na-enyere ha aka iwepụ echiche na-ezighị ezi dị ka ikpe ọmụma. N’oge ndị anyị na-adịghị ike, nke nkụda mmụọ, Setan na-anwa iji ‘ihe ndị ọ na-ezupụta,’ ma ọ bụ “ụzọ aghụghọ” bibie anyị. Nke a bụ mgbe anyị nwere mkpa nkasi obi na nkwado nke ekpere, dị ka Pọl kwuru: “Sitekwanụ n’ekpere na arịrịọ nile na-ekpe ekpere n’oge nile n’ime Mmụọ Nsọ, werekwa ịnọgidesi ike na ịrịọ arịrịọ nile banyere ndị nsọ nile na-amụ anya ime nke a.”—Ndị Efesọs 6:11, 18; tụlee Jemes 5:13-15.
Ihe A Ga-ezere
18, 19. Olee otú anyị pụrụ isi gosi akọ ná nkwurịta okwu anyị?
18 Mgbe mmadụ na-eru újú, e nwekwara ihe ndị a na-agaghị eme ma ọ bụ kwuo. Ilu 12:18 dọrọ aka ná ntị, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha: ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” Mgbe ụfọdụ, n’aghọtaghị ya, anyị adịghị egosi akọ. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịsị, “M ma mmetụta ị na-enwe.” Ma ọ̀ bụ otú ọ dị n’ezie? Ụdị ọnwụ dị otú ahụ kpọmkwem ọ̀ dakwasịtụwo gị? Ọzọkwa, ndị mmadụ na-emeghachi omume n’ụzọ dị iche iche. Otú i si meghachi omume na nke onye ahụ na-eru újú pụrụ ịbụ na ha eyighị. Ọ pụrụ ịdị na-egosi nghọta karị ịsị, “Enwere m ọmịiko n’ebe ị nọ n’ezie n’ihi na ọnwụ mmadụ yiri nke ahụ dakwasịrị m mgbe . . . nke m nwụrụ otu oge gara aga.”
19 Ọ gakwa egosi nghọta izere ikwu okwu banyere ma a ga-akpọlite onye ahụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ na a gaghị eme otú ahụ. Ụfọdụ ụmụnna nwoke na nwanyị abụrụwo ndị e merụrụ ahụ n’ụzọ dị omimi site n’okwu amamikpe ndị e kwuru banyere ihe ndị pụrụ ime n’ọdịnihu maka di ma bụ nwunye na-ekweghị ekwe nwụrụ. Anyị abụghị ndị ikpe nke onye a ga-akpọlite n’ọnwụ ma ọ bụ onye a na-agaghị. Anyị pụrụ inwe ahụ efe na Jehova, bụ́ onye na-ahụ obi, ga-eme ebere n’ụzọ dị nnọọ ukwuu karịa otú ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ga-eme mgbe ọ bụla.—Abụ Ọma 86:15; Luk 6:35-37.
Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Ndị Na-akasi Obi
20, 21. Gịnị bụ ụfọdụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị pụrụ ịgụgụ onye mmadụ nwụnahụrụ obi?
20 Otu n’ime isi iyi kasị ukwuu nke enyemaka, mgbe e nyere ya n’oge ya, bụ ntụle nke nkwa Jehova dị iche iche maka ndị nwụrụ anwụ. Echiche Bible ndị a ga-aba uru ma onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ ọ̀ bụrụworị Onyeàmà ma ọ bụ onye anyị zutere n’ozi. Gịnị bụ ụfọdụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a? Anyị maara na Jehova bụ Chineke nke nkasi obi nile, n’ihi na o kwuru, sị: “Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasi unu obi.” O kwukwara, sị: “Dị ka onye nke nne ya na-akasi obi, otú a ka Mụ onwe m ga-akasi unu obi.”—Aịsaịa 51:12; 66:13.
21 Onye ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Nke a bụ nkasi obi m n’ime mweda n’ala m: na okwu Gị emewo ka m dị ndụ. Echetawo m ikpe Gị nile site na mgbe ebighị ebi, Jehova, wee kasie onwe m obi. Biko, kwee ka ebere Gị bụrụ ihe ga-akasi obi m, dị ka okwu ọnụ Gị nke dịịrị ohu Gị si dị.” Rịba ama na okwu ahụ bụ́ “nkasi obi” bụ nke e ji mee ihe ọtụtụ ugbo n’akụkụ ihe odide ndị ahụ. Ee, anyị pụrụ ịchọtara onwe anyị na ndị ọzọ ezi nkasi obi site n’ichigharịkwuru Okwu Jehova n’oge anyị na-enwe ihe otiti. Nke a, tinyere ịhụnanya na ọmịiko nke ụmụnna, pụrụ inyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide ihe mgbu nke bịara n’ihi onye anyị nwụrụ anwụ ma jiri ọrụ na-enye ọṅụ n’ozi ndị Kraịst mejuo ndụ anyị ọzọ.—Abụ Ọma 119:50, 52, 76.
22. Olileanya dị aṅaa dị n’ihu anyị?
22 Anyị pụkwara imeri iru újú anyị ruo n’ókè ụfọdụ site n’iji ọrụ n’aka n’inyere ndị ọzọ nọ ná mkpagbu ha aka. Ka anyị na-eche ihu n’ebe ndị ọzọ nọ ná mkpa nọ, anyị na-enwetakwa ezi obi ụtọ nke inye ihe n’ụzọ ime mmụọ. (Ọrụ 20:35) Ka anyị soro ha kerịta ọhụụ nke ụbọchị mbilite n’ọnwụ mgbe ndị sitere ná mba ndị e nweburu na mbụ, site n’otu ọgbọ gaa n’ọgbọ ọzọ, ga na-anabataghachi ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ site n’ọnwụ baa n’ụwa ọhụrụ. Lee aha olileanya nke ahụ bụ! Lee anya mmiri ọṅụ a ga-agba mgbe ahụ ka anyị na-echeta na Jehova bụ n’ezie Chineke “nke na-akasi ndị dị ala obi”!—2 Ndị Kọrint 7:6.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú Jehova si bụrụ “Chineke nke nkasi obi nile”?
◻ Olee otú Jisọs na Pọl si kasie ndị na-eru újú obi?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị anyị pụrụ ime iji kasie ndị na-eru újú obi?
◻ Gịnị ka anyị kwesịrị izere mgbe anyị na-emeso onye mmadụ nwụnahụrụ omume?
◻ Gịnị bụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-amasị gị karịsịa maka nkasi obi n’oge mmadụ nwụrụ?
[Foto dị na peeji nke 15]
Jiri akọ buru ụzọ mee ihe iji nyere ndị na-eru újú aka