Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp16 nke 5 p. 4-5
  • Otú Chineke Si Akasi Mmadụ Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Chineke Si Akasi Mmadụ Obi
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OTÚ JIZỌS SI KASIE NDỊ NA-ERU UJU OBI
  • “Ịkasi Ndị Niile Na-eru Uju Obi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Kasie Ndị Na-eru Újú Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ebee Ka A Pụrụ Ịchọta Ezi Nkasi Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Nweta Nkasi Obi n’Ike Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
wp16 nke 5 p. 4-5
Ebe Jizọs na-emetụ onye ekpenta aka tupu ya agwọ ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | ÒNYE GA-AKASILI GỊ OBI MA NSOGBU BỊARA GỊ?

Otú Chineke Si Akasi Mmadụ Obi

Pọl onyeozi kwuru na Jehovaa bụ “Chineke nke nkasi obi niile . . . onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” (2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4) Ihe a Baịbụl kwuru na-eme ka obi sie anyị ike na o nweghị onye Chineke na-agaghị enyeliri aka nakwa na o nweghị nsogbu ọ bụla bịaara anyị nke Nna anyị nke eluigwe na-agaghị akasili anyị obi na ya.

Ma, o nwere ihe anyị ga-emerịrị ma anyị chọọ ka Chineke kasie anyị obi. Dọkịta ọ̀ ga-agwọ onye na-abịakwuteghị ya ka ọ gwọọ ya? Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.

Olee ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na Chineke ga-abịaru anyị nso? Nke mbụ bụ na Chineke gwara anyị ugboro ugboro na ya chọrọ inyere anyị aka. (Gụọ ihe e dere n’igbe dị n’isiokwu a.) Nke abụọ bụ na e nwere ọtụtụ ndị n’oge ochie nakwa n’oge anyị a kwuru na Chineke nyeere ha aka mgbe ha nọ ná nsogbu.

Ọtụtụ ndị nwere nsogbu taa na-arịọ Chineke ka o nyere ha aka. Otú ahụkwa ka ọ dị Eze Devid n’oge ochie. N’otu oge ya na nsogbu na-alụ, ọ rịọrọ Jehova, sị: “Nụrụ olu arịrịọ m mgbe m na-etiku gị maka enyemaka.” Chineke ọ̀ zara ya? Ee. Devid kwuru, sị: “[O] nyewokwara m aka, nke mere na obi m na-enwe aṅụrị.”—Abụ Ọma 28:2, 7.

OTÚ JIZỌS SI KASIE NDỊ NA-ERU UJU OBI

Tupu Jizọs abịa n’ụwa, Chineke chọrọ ka ọ kasie ndị mmadụ obi ma ọ bịa. Ọ bụ ya mere na otu n’ime ọrụ ndị o nyere Jizọs bụ “ikechi ọnyá nke ndị e tiwara obi” na “ịkasi ndị niile na-eru uju obi.” (Aịzaya 61:1, 2) Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, o nyeere ndị ‘na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ’ aka otú ahụ e kwuru na ọ ga-eme.—Matiu 11:28-30.

E nwere ụzọ dị iche iche Jizọs si kasie ndị mmadụ obi. O nyere ha ndụmọdụ ga-abara ha uru. O ji obiọma meso ha ihe. Mgbe ụfọdụ, ọ gwọdịrị ha ọrịa ha. O nwere otu ụbọchị otu onye ekpenta gwara Jizọs, sị: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Jizọs metaara ya ebere ma gwazie ya, sị: “Achọrọ m. Dị ọcha.” (Mak 1:40, 41) Ekpenta ya ahụ lara ozugbo.

Ọ bụ eziokwu na Ọkpara Chineke anọghịzi n’ụwa taa nke ọ ga-abụ, onye nwee nsogbu, gakwuru ya, ya akasie onye ahụ obi. Ma, Jehova Nna ya, bụ́ “Chineke nke nkasi obi niile,” ka na-akasi ndị niile nwere nsogbu obi. (2 Ndị Kọrịnt 1:3) Ka anyị lee ụzọ anọ Chineke si akasi ndị mmadụ obi.

  • Baịbụl. “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.”—Ndị Rom 15:4.

  • Mmụọ Nsọ Chineke. Obere oge Jizọs nwụchara, Baịbụl kwuru na ọgbakọ Ndị Kraịst banyere n’oge udo. Maka gịnị? Maka na “ha na-eje ije n’egwu Jehova, na-adịkwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkasi obi ha na-enweta site na mmụọ nsọ.” (Ọrụ Ndịozi 9:31) Mmụọ nsọ Chineke na-akpa ike dị egwu. Chineke nwere ike iji ya kasie mmadụ obi n’agbanyeghị ụdị nsogbu onye ahụ nwere.

  • Ekpere. Baịbụl gwara anyị ka ‘anyị ghara ichegbu onwe anyị banyere ihe ọ bụla.’ Kama, ka anyị ‘mee ka Chineke mara ihe anyị na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi anyị na ike iche echiche anyị nche.’—Ndị Filipaị 4:6, 7.

  • Ndị Kraịst Ibe Anyị ga-akasili anyị obi n’oge anyị nọ n’ezigbo nsogbu. Pọl onyeozi kwuru na Ndị Kraịst ibe ya bụ ‘ndị na-enyere ya aka, na-eme ka ọ dị ike’ n’oge niile ọ nọ ná mkpa nakwa n’oge niile a na-akpagbu ya.—Ndị Kọlọsi 4:11; 1 Ndị Tesalonaịka 3:7.

Ebe Ndịàmà Jehova abụọ na-akasi Onyeàmà Jehova ibe ha obi

Ma i nwere ike ịna-eche ma ihe ndị a hà nwere ike ịkasi mmadụ obi n’eziokwu. Ka anyị lebazie anya n’otú ihe ndị a si kasie ndị ahụ anyị kwuburu gbasara ha n’isiokwu nke mbụ obi. I nwere ike ịchọpụta ihe hanwa chọpụtara, ya bụ, na Chineke ka na-emezu nkwa a o kwere. Ọ sịrị: “Dị ka nwoke nke nne ya na-akasi obi, otú ahụ ka mụ onwe m ga na-akasi unu obi.”—Aịzaya 66:13.

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

Otú Anyị Si Mara na Chineke Chọrọ Ịkasi Anyị Obi

  • “Gị onwe gị, Jehova, enyeworo m aka, kasiekwa m obi.”—Abụ Ọma 86:17.

  • “‘Kasienụ ndị m obi, kasienụ ha obi,’ ka Chineke unu kwuru.”—Aịzaya 40:1.

  • “Nke a bụ ihe Jehova kwuru: . . . ‘Dị ka nwoke nke nne ya na-akasi obi, otú ahụ ka mụ onwe m ga na-akasi unu obi.’”—Aịzaya 66:12, 13.

  • “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eru uju, n’ihi na a ga-akasi ha obi.”—Matiu 5:4.

  • “Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya