Abụ Ọma
Abụ Devid.
28 Jehova, Oké Nkume m, ọ bụ gị ka m na-akpọ mgbe niile.+
Ajụla ige m ntị.
2 Nụrụ arịrịọ m mgbe m na-ebesara gị ákwá ka i nyere m aka,
Mgbe m gbasara aka m chee ya n’Ebe Kacha Nsọ n’ụlọ nsọ gị.+
3 Akpụrụkọtala mụ na ndị ajọ omume nakwa ndị na-eme ihe ọjọọ,+
Ndị na-agwa mmadụ ibe ha okwu ọma, ma ya abụrụ na ha bu ihe ọjọọ n’obi.+
Kwụọ ha ụgwọ ọrụ ndị ha rụrụ,
Maka ihe dị iche iche ha merela.+
Ọ ga-akwada ha, ọ gaghịkwa ekulite ha.
6 Ka e too Jehova,
N’ihi na ọ nụla arịrịọ m na-arịọ ya ka o nyere m aka.
Ọ bụ ya ka m tụkwasịrị obi.+
O nyerela m aka. Obi na-atọzi m ụtọ.
N’ihi ya, m ga-eji abụ m na-abụ too ya.
8 Jehova bụụrụ ndị ya ike.
Ọ bụ ebe mgbaba. Ọ na-azọpụta onye o tere mmanụ.+
9 Zọpụta ndị gị, gọziekwa ndị i ketara.+
Zụọ ha otú e si azụ atụrụ, kurukwa ha n’aka gị ruo mgbe ebighị ebi.+