Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/03 p. 3-6
  • Na-anụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ihe!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-anụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ihe!
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Kwusaa Okwu Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu”
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • ‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma Ahụ’
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Nọgide Na-akọ Banyere Oké Ọrụ Nile nke Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Ànyị Pụrụ Ime April 2000 Ọnwa Kasị Mma Anyị Nwetụrụla?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 3/03 p. 3-6

Na-anụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ihe!

1 Ka anyị na-abanye n’oge Ememe Ncheta 2003, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji “na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ihe.” (1 Pita 3:13) Nke mbụ n’ime ihe ndị a bụ àjà mgbapụta nke Jizọs Kraịst. (Mat. 20:28; Jọn 3:16) Banyere nke a, Pita onyeozi dere, sị: “Ọ bụghị ihe ndị pụrụ ire ure, ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, ka e ji gbapụta unu n’ụdị omume unu nke na-adịghị amị mkpụrụ. . . . Kama ọ bụ ọbara dị oké ọnụ ahịa, dị ka nke nwa atụrụ na-enweghị mmerụ, nke na-enweghịkwa ntụpọ, ọbụna nke Kraịst.” (1 Pita 1:18, 19) Inwe ekele maka ngosipụta a na-enweghị atụ nke ịhụnanya ga-akwali anyị ịrụsị ọrụ ike n’ime ihe ọma, na-amata na Jizọs “nyere onwe ya maka anyị ka o wee gbapụta anyị n’ụdị mmebi iwu ọ bụla ma mee ka ndị bụ ndị nke ya n’ụzọ pụrụ iche dị ọcha nye ya, bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ.”—Taị. 2:14; 2 Kọr. 5:14, 15.

2 Mgbe anyị mere ihe na-atọ Chineke ụtọ, anyị na ya na-enwe mmekọrịta dị mma, anyị na-aghọkwa ndị o ji ịhụnanya na-elekọta. Pita kwukwara, sị: “Onye ga-ahụ ndụ n’anya ma hụ ezi ụbọchị, . . . ya gbakụta ihe ọjọọ azụ, meekwa ezi ihe; ya chọọ udo, chụsookwa ya. N’ihi na anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike.” (1 Pita 3:10-12) N’oge ndị a dị ize ndụ, lee ihe ngọzi ọ bụ ịmata na Jehova na-eche anyị nche na ọ dịkwa njikere ime ihe n’ihi anyị, ‘ichezi anyị dị ka nwantanta anya Ya.’—Deut. 32:10; 2 Ihe 16:9.

3 N’agbanyeghị na ha na-eche ọnwụnwa ihu, Ndị Kraịst oge mbụ, bụ́ ndị Pita degaara akwụkwọ ozi nwere ịnụ ọkụ n’obi nke a na-apụghị ịbịanyụ abịanyụ, ha kwusakwara ozi ọma ahụ ebe nile ruo n’ókè o kwere ha mee. (1 Pita 1:6; 4:12) Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Chineke taa. Ọ bụ ezie na anyị na-ebi ‘n’oge pụrụ iche nke sịrị ike obibi,’ inwe ekele maka ịdị mma Jehova na-akpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-eme uche Chineke. (2 Tim. 3:1; Ọma 145:7) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ezi ọrụ ndị anyị ga na-arụ n’oge Ememe Ncheta a.

4 Kpọọ Ndị Ọzọ Òkù Ịbịa Ememe Ncheta: Otu ụzọ anyị pụrụ isi gosi ekele anyị nwere maka onyinye pụrụ iche nke ihe mgbapụta ahụ bụ ịbịa ememe ncheta ọnwụ Jizọs a na-eme kwa afọ, bụ́ nke a ga-eme n’afọ a na Wednesday, April 16, mgbe anyanwụ dasịrị. (Luk 22:19, 20) N’afọ gara aga, site n’akụkọ ozi nke ọgbakọ 94,600 nyere n’ụwa dum, anyị nwere ngụkọta nke mmadụ 15,597,746 bịara Ememe Ncheta! Nke a ji 220,000 karịa ọnụ ọgụgụ ndị bịara n’afọ bu ya ụzọ.

5 Mmadụ ole ga-abịa n’afọ a? Ọ ga-adabere n’ụzọ dị ukwuu ná mgbalị anyị ji ịdị uchu mee ịgba ndị ọzọ ume isoro anyị zukọta. Malite site n’idepụta aha ndị nile ị ga-achọ ịkpọ òkù. Aha ndị òtù ezinụlọ gị kpọmkwem kwesịrị ịbụ ndị mbụ ga-adị n’ihe ndepụta ahụ. Ọ bụrụ na i nwere di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe, gwa ya na i ji obi gị dum chọọ ka o soro gị gaa. Otu di nke na-ekweghị ekwe kwuru na ya gara Ememe Ncheta n’afọ gara aga n’ihi na ya hụrụ otú ọbịbịa ya dịruru nwunye ya mkpa. Ndị ọzọ ị ga-edenye aha ha n’ihe ndepụta gị pụrụ ịbụ ndị ịkwụ gị, ndị agbata obi gị, ndị ọrụ ibe gị, ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe gị. Hụ na ị kpọrọ ndị nile ị na eduziri ọmụmụ Bible òkù.

6 Mgbe i depụtachara aha ha, wepụta oge gaa kpọọ onye ọ bụla n’ime ha òkù n’onwe gị. Jiri akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ememe Ncheta mee ihe. Iji nyere ndị mmadụ aka icheta oge na ebe a ga-anọ mee ememe ahụ, jiri ígwè typewriter ma ọ bụ aka gị denye n’ụzọ dị mma n’anya oge na ebe a ga-anọ mee Ememe Ncheta ahụ n’ala ala akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ. Ka April 16 na-akpụdewe, chetaghachiri ndị ahụ i denyere aha ha n’ihe ndepụta gị maka ememe ahụ, site n’ịga n’onwe gị ma ọ bụ ịkpọ ha na fon. Ka anyị nyere ọtụtụ ndị aka ruo n’ókè o kwere anyị omume ịbịa ememe a kasị nsọ.

7 Nyere Ndị Bịara Ememe Ncheta Aka: Abalị Ememe Ncheta na-abụkarị oge na-enye obi ụtọ. Anyị nwere ohere ịnabata ndị na-adịghị abịakebe nzukọ anyị. Mee ndokwa ịbịa n’oge nakwa ịnọgide mgbe e mechisịrị, dị ka ọnọdụ dị n’ógbè unu si dị. Buru ụzọ mee ihe iji mata ndị ọhụrụ bịaranụ. Nwee omume enyi nakwa nke ịnabata ndị ọbịa.—Rom 12:13.

8 À pụrụ inyere ụfọdụ ndị bịara Ememe Ncheta aka inwekwu ọganihu ime mmụọ site n’iduziri ha ọmụmụ Bible ebe obibi? Gbalịsie ike inweta aha na adres ndị ọbịa ọ bụla bịaranụ, bụ́ ndị na-enweghị onye na-aga eleta ha ugbu a ka i wee nọgide na-enyere ha aka. Site n’iji ịhụnanya nyere ha aka, ụfọdụ n’ime ndị a pụrụ inwe ọganihu ruo n’ókè nke ịghọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim tupu Ememe Ncheta nke afọ ọzọ. Mgbe ị na-eleta ndị bịara Ememe Ncheta, kpọọ ha òkù ịbịa gere okwu ihu ọha pụrụ iche nke a ga-ekwu n’April 27.

9 Ị̀ Pụrụ Ịsụ Ụzọ Inyeaka n’Oge Ememe Ncheta A? Kwa afọ, ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere maka Jehova na-akpali anyị ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu n’ozi n’ọnwa ndị e ji arụ ọrụ ọchịchị Chineke n’ụzọ pụrụ iche. N’afọ gara aga na Nigeria, e nwere ndị ọsụ ụzọ inyeaka dị 16,101 na March, nweekwa 13,487 n’April. Mgbalị ọgbakọ dum n’ozuzu ya jikọtara aka mee iji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ahụ n’oge Ememe Ncheta pụrụ ịrụpụta ihe ndị dị mma.

10 Otu ọgbakọ nke nwere ndị nkwusa 107 na ndị ọsụ ụzọ oge nile 9 kọrọ na April afọ gara aga bụ “ọnwa magburu onwe ya” nye ha. Ndị nkwusa 53 jere ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka, nke gụnyere ndị okenye nile na ndị ohu na-eje ozi nile. Olee otú ndị okenye si nwee ike iwulite ịnụ ọkụ n’obi maka ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ? Ha malitere n’oge, na-agba ọtụtụ ndị ume ruo n’ókè o kwere ha mee ka ha tinye akwụkwọ. E nwere nzukọ maka ozi ubi n’oge dị iche iche n’ụbọchị iji mee ka mmadụ nile nọ n’ọgbakọ nwee ike ikere òkè.

11 Otu nwanna nwanyị dị afọ 86, bụ́ onye na-adịghị agali ije n’ihi nsogbu ahụ́ ike, tinyere akwụkwọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Malite n’ụtụtụ, ọ na-anọdụ ala na tebụl dị na kichin ma jiri telifon gbaa àmà ruo awa ole na ole, zurutụ ike ruo awa ole na ole, mgbe ahụ ya alaghachite ma malite ọzọ. Otu onye ọ kpọtụụrụ bụ onye di ya na ụmụ ya ndị nwoke abụọ dị afọ iri na ụma nwụnahụrụ n’ime afọ abụọ tupu mgbe ahụ, ọ ghọtaghịkwa ihe mere Chineke ji ekwe ka ihe ọjọọ dị otú ahụ na-eme. Ọ gbaara ya àmà nke ọma, malitekwara ya ọmụmụ Bible. Nke a na-egosi na inwe ịnụ ọkụ n’obi maka Jehova pụrụ ịkpali ọbụna ndị ahụ́ na-adịchaghị ike ịdọgbu onwe ha n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu n’ozi n’ọnwa ndị a na-arụ ọrụ pụrụ iche. Ndị na-enweghị telifon pụkwara ịdọgbu onwe ha n’ọrụ. Ụfọdụ ndị na-agaghị agali ije pụrụ ịnọdụ ala otu ebe bụ́ ebe ha pụrụ ịnọ na-agbara ndị na-agafe agafe àmà.

12 Ndị okenye mechiri akụkọ ha site n’ikwu, sị: “Ọ tọgburu anyị atọgbu, anyị nwekwara ekele maka ihe ùgwù na ngọzi dị iche iche Jehova meworo ka onye ọ bụla n’ime anyị nwee ike inweta.” Site n’ime nhazi kwesịrị ekwesị, ọgbakọ unu pụkwara inweta ngọzi ndị dị otú ahụ.

13 Gbalịanụ Ịhụ na Mmadụ Nile Keere Òkè n’Ozi: Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe ndị agbata obi anyị nọ na-akpali anyị ịzụpụta oge kwa ọnwa iji soro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ. (Mat. 22:37-39) Ndị nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na ndị na-enyere ha aka kwesịrị ịgbalịsi ike inyere ndị nọ n’ìgwè ha aka ikere òkè n’ozi kwa ọnwa. Otu ụzọ dị mma isi mee nke a bụ ime ndokwa tupu oge eruo isoro ndị ụfọdụ kpọmkwem nọ n’ìgwè unu rụọ n’ozi. Kama ichere ruo mgbe ọnwa ga-agwụ tupu unu emee ya, malitenụ n’oge ka ha wee nwee ike inye akụkọ ozi n’ọkara ọnwa. Nke a ga-eme ka unu nwee ohere ka ukwuu iji nyere ha aka n’ụzọ ịhụnanya.

14 È nwere ndị nkwusa na-adịghị ike nọ n’ìgwè ọmụmụ akwụkwọ unu bụ́ ndị ọ na-esiri ike nke ukwuu ikere òkè n’ozi? Ọ bụrụ na ụfọdụ nọ n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ na ha apụghị isi n’ụlọ ha pụọ, o doro anya na ohere ha ga-enwe iji gbaa àmà ga-adị ntakịrị. Ma site n’iji ntakịrị ohere ndị ha nwere mee ihe iji mee ka ìhè ha na-enwu, ha pụrụ ịkpali ndị na-ahụ ọrụ ọma ha inwe ezi mmasị n’eziokwu ahụ. (Mat. 5:16) Ndị nlekọta ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ijide n’aka na ndị dị otú ahụ maara na ha pụrụ inye akụkọ ozi ubi ndị ruru minit 15. Ha inwe ike inye akụkọ ozi maka oge ha ji gbaa àmà na-agba ndị nkwusa ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi ume, ọ na-enyekwa ha ọṅụ na afọ ojuju. Ọ na-enyekwa aka iji hụ na akụkọ ozi ụwa nile maka ọrụ ndị Chineke na-arụ ziri ezi.

15 Ndị Ntorobịa Ndị Na-arụsị Ezi Ọrụ Ike! Lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ ịhụ ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst ka ha na-eji ike ha na ume ha eme ihe n’ozi Jehova! (Ilu 20:29) Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, olee otú ị pụrụ isi gosipụta ịnụ ọkụ n’obi gị maka Jehova n’ọnwa ndị a pụrụ iche a ga-eji rụọ ọrụ?

16 Ọ bụrụ na ị ghọbeghị onye nkwusa a na-emebeghị baptizim n’ọgbakọ, ị̀ pụrụ ime mgbalị iji ruo eru maka ihe ùgwù ahụ? Jụọ onwe gị ajụjụ ndị na-esonụ: ‘Àmaara m eziokwu bụ́ isi nke Bible? M̀ chọrọ ikere òkè n’ozi Alaeze? M̀ na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’àgwà m? Ènwere m ike ikwupụta ihe m kwenyere site n’izi ndị ọzọ ozi ọma ahụ? Èji m obi m na-achọ ime otú ahụ?’ Ọ bụrụ na ị pụrụ ịza ee n’ajụjụ ndị ahụ, mgbe ahụ mee ka ndị mụrụ gị mata na ị chọrọ ịghọ onye nkwusa. Ndị mụrụ gị pụrụ ijekwuru otu n’ime ndị okenye so na kọmitii ije ozi.

17 Ọ bụrụ na ị ghọọlarị onye nkwusa nke ozi ọma ahụ, ị̀ pụrụ iji oge ezumike, mgbe ị na-adịghị aga akwụkwọ mụbaa òkè ị na-ekere n’ozi? Site n’ime ezi nhazi nakwa site n’enyemaka nke ndị nne na nna na ndị ọzọ, ọtụtụ ndị ntorobịa e meworo baptizim enwewo ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ọ bụrụ na nke ahụ agaghị ekwe omume, mgbe ahụ kpebisie ike ịmụba òkè ị na-ekere n’ozi ubi. Setịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ. Tụkwasị n’isetịpụ ihe mgbaru ọsọ awa ole ị ga-etinye n’ozi, setịpụ ihe mgbaru ọsọ ọzọ n’ihe metụtara ịdị irè nke ozi gị. Ikekwe, ị pụrụ ịgbalịsi ike ịgụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’ọnụ ụzọ ọ bụla, imeziwanye otú i si aga nletaghachi, ịmalite ọmụmụ Bible, ma ọ bụ ịmụba ozi gị ka ọ gụnye iji telifon na-agba àmà ma ọ bụ akụkụ ọ bụla ọzọ nke ozi ahụ. Olee maka ihe mgbaru ọsọ nke ime ka onye agbata obi unu, nwa akwụkwọ ibe gị, ma ọ bụ onye ịkwụ gị soro gị bịa Ememe Ncheta n’afọ a? Ikere òkè zuru ezu n’ọrụ ọchịchị Chineke ga-ewetara gị ụgwọ ọrụ, ọ ga-agbakwa ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ume n’ezie.—1 Tesa. 5:11.

18 Nyere Ndị Ọhụrụ Aka Inwe Ọganihu: N’ime afọ ije ozi gara aga, ná nkezi e duziri ọmụmụ Bible ebe obibi dị 407,243 kwa ọnwa na Nigeria. Ka oge na-aga, ọtụtụ n’ime ndị a a na-eduziri ọmụmụ ihe ga-enwe ọganihu ruo n’ókè nke ịrara onwe ha nye na ịbụ ndị e mere baptizim. Otú ọ dị, tupu ha eruo ihe mgbaru ọsọ ahụ, ọ dị mkpa ka anyị nyere ha aka iru eru dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ. Nke a bụ nzọụkwụ dị mkpa n’ịkụziri ndị ọhụrụ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. (Mat. 9:9; Luk 6:40) Ị̀ nwere onye ị na-eduziri ọmụmụ Bible nke dị njikere iwere nzọụkwụ ahụ?

19 Ọ bụrụ na ọganihu nke onye ị na-eduziri ọmụmụ ihe edochaghị gị anya, rịọ onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ unu ma ọ bụ onye nlekọta ije ozi ka o nyere gị aka. Ikekwe, ị pụrụ ịgwa ya ka o sonyere unu n’ọmụmụ ihe ahụ. Ụmụnna ndị a nwere ahụmahụ bara uru nke a pụrụ iji mee ihe n’ịtụle ọganihu ime mmụọ nke onye ahụ ị na-eduziri ọmụmụ ihe. Ha pụkwara ịtụ aro ndị ga-enyere onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe aka ịnọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ.

20 Mgbe onye ị na-eduziri ọmụmụ ihe kwupụtara na ya ga-enwe mmasị ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ọ bụrụkwa na i chere na o ruru eru, mee ka onyeisi oche ndị nlekọta mata. Ọ ga-eme ndokwa ka ndị okenye abụọ soro gị na onye ahụ ị na-eduziri ọmụmụ ihe nọkọọ iji tụlee ma o ruru eru, na-eji ihe ọmụma dị na peeji 98-99 nke akwụkwọ Ozi Anyị eme ihe. (Lee Ụlọ Nche nke November 15, 1988, peeji nke 17.) Ọ bụrụ na a kwadoo ka onye ahụ a na-amụrụ ihe ghọọ onye nkwusa, i kwesịrị ịmalite ịzụ ya ozugbo. Ozugbo o nyere akụkọ ozi ubi, a ga-agwa ọgbakọ na onye ahụ a na-amụrụ ihe bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Anyị nwere olileanya na ọtụtụ puku ndị nkwusa ọhụrụ, ma nwata ma okenye, ga-eru ihe mgbaru ọsọ a dị mkpa n’ọnwa ndị a pụrụ iche a ga-eji rụọ ọrụ.

21 Ime Atụmatụ Na-enye Aka Ịrụzu Ihe Kasị Ukwuu: Ime atụmatụ tupu oge eruo ga-eme ka ọrụ ọchịchị Chineke anyị ga-arụ n’oge Ememe Ncheta nwee ihe ịga nke ọma. (Ilu 21:5) E nwere ọtụtụ ihe ndị ọ dị mkpa ka ndị okenye lebara anya.

22 Iji nyere ọgbakọ aka ịrụzu ihe kasị ukwuu n’ozi ubi, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa ndị dị irè maka inwe nzukọ maka ozi ubi n’ụbọchị nile n’ime izu nakwa ná ngwụsị izu. Onye nlekọta ije ozi kwesịrị ibute ụzọ n’ime ndokwa ndị a. À pụrụ ime ndokwa inwekwu nzukọ ndị ọzọ n’isi ụtụtụ, ná ngwụsị oge ehihie, ma ọ bụ ná mmalite oge uhuruchi? E kwesịrị ịgwa ọgbakọ ndokwa ndị e mere. Ọ pụrụ inye aka ịmapawa usoro ihe omume ahụ na bọọdụ ịma ọkwa.

23 Ndị okenye kwesịrị ijide n’aka na e mechara ndokwa nile maka Ememe Ncheta n’ezi oge tupu April 16 eruo. Nke a na-agụnye ime nhazi otú ọgbakọ dị iche iche ndị pụrụ izukọ n’ebe ahụ ga-esi jiri Ụlọ Nzukọ Alaeze mee ihe, idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, ịhọrọ ndị atendantị na ndị ga-ebugharị ihe nnọchianya ndị ahụ, na inweta ihe nnọchianya ndị ahụ. E kwesịrị ịgwa ọgbakọ oge na ebe a ga-anọ mee Ememe Ncheta ahụ nakwa mgbanwe ọ bụla e mere n’otú a ga-esi nwee nzukọ n’izu ahụ. Iji ịdị uchu hụ maka ihe ndị a nile ga-eme ka ememe ahụ “were ọnọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị.”—1 Kọr. 14:40.

24 Ndị isi ezinụlọ pụrụ iji oge ụfọdụ n’ime oge ọmụmụ ihe ezinụlọ ha kwurịta otú ezinụlọ ha pụrụ isi kere òkè n’ọrụ a ka ukwuu a ga-arụ n’oge Ememe Ncheta. Ndị nile nọ n’ezinụlọ gị, hà pụrụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka? Ka ezinụlọ gị hà pụrụ ịkwado otu onye ma ọ bụ karị ime otú ahụ? Ọ bụrụ na nke ahụ agaghị ekwe omume, setịpụnụ ihe mgbaru ọsọ ndị a kapịrị ọnụ dị ka ezinụlọ iji kerekwuo òkè n’ozi. È nwere obere nwa n’ezinụlọ bụ́ onye pụrụ iru eru ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ma e nye ya ntakịrị agbamume na enyemaka? Mmadụ ole ka ezinụlọ gị pụrụ ịkpọ òkù ka ha bịa Ememe Ncheta n’afọ a? Ime ezi atụmatụ ga-ewetara ezinụlọ gị ọtụtụ ngọzi na ọṅụ.

25 Jiri Oge Fọdụrụnụ Mee Ihe n’Ụzọ Zuru Ezu: Mgbe ọ na-edegara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwụkwọ ozi, Pita onyeozi chetaara ha ịdị ngwa nke oge ndị ahụ n’ihi na ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu eruwo nso. (1 Pita 4:7) Taa, ihe àmà nile na-egosi na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke ụwa a eruwo nso. Kwa ụbọchị, ụzọ ndụ anyị kwesịrị ịdị na-egosipụta nkweta ahụ. Dị ka ndị ohu Jehova na-anụ ọkụ n’obi, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ọrụ ahụ dị ngwa nke ikwusa ozi ọma ahụ.—Taị. 2:13, 14.

26 Ugbu a bụ oge iji gosipụta ịnụ ọkụ n’obi na ime ihe! Tụgharịa uche n’ihe Jehova mewooro gị, ezinụlọ gị, nakwa ọgbakọ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe anyị ga-enwe ike ịkwụghachi ya maka ọtụtụ ụzọ ndị o siworo meere anyị ihe ndị baara anyị uru, anyị pụrụ iji mkpụrụ obi anyị dum na-efe Jehova ofufe. (Ọma 116:12-14) A ga-eji ngọzi si n’elu kwụghachi anyị ụgwọ maka mgbali anyị ji ịdị uchu tinye. (Ilu 10:22) Ka anyị nile “na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ihe” n’oge a pụrụ iche nke ịrụ ọrụ ka ukwuu, “ka e wee nye Chineke otuto n’ihe nile site na Jizọs Kraịst.”—1 Pita 3:13; 4:11.

Igbe dị na peeji nke 3]

Ndị Bịara Ememe Ncheta n’Ụwa Nile

199914,088,751

200014,872,086

200115,374,986

200215,597,746

Igbe dị na peeji nke 4]

Ònye Ka Ị Ga-akpọ Òkù Ka Ọ Bịa Ememe Ncheta?

□ Ndị ezinụlọ gị kpọmkwem na ndị ikwu gị

□ Ndị agbata obi gị na ndị ị maara

□ Ndị ọrụ ibe gị na ụmụ akwụkwọ ibe gị

□ Ndị nletaghachi gị na ndị ị na-amụrụ Bible

[Igbe dị na peeji nke 5]

Nyere Ndị Bịara Ememe Ncheta Aka

□ Nabata ha n’ụzọ na-ekpo ọkụ

□ Gaa leta ha mgbe e mesịrị

□ Gwa ha ka i duziere ha ọmụmụ Bible

□ Kpọọ ha òkù ịbịa gere okwu ihu ọha pụrụ iche

Igbe dị na peeji nke 6]

Gịnị Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ Gị Maka Oge Ememe Ncheta?

□ Ime ka onye ị kpọrọ òkù bịa Ememe Ncheta

□ Iru eru dị ka onye nkwusa nke ozi ọma

□ Itinye ọnụ ọgụgụ awa ụfọdụ n’ozi

□ Imeziwanye otu akụkụ nke ozi ahụ

□ Ije ozi dị ka ọsụ ụzọ inyeaka

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya