Ihe I Nwere Ike Ikwu
Otú I Nwere Ike Isi Nye Mmadụ Akwụkwọ Ịkpọ Òkù
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Anyị bịara ịgwa unu gbasara ihe dị mkpa anyị ga-eme n’abalị atọ n’ọnwa Eprel. N’ụbọchị ahụ, nde kwuru nde ndị mmadụ ga-agbakọ n’ebe dị iche iche icheta ọnwụ Jizọs. A ga-eji Baịbụl kọwaara anyị uru ọnwụ Jizọs nwụrụ baara anyị. O nweghị ụtụ a ga-ana ndị bịara ya. E dere ebe anyị ga-anọ eme ya na oge anyị ga-eme ya ná mpempe akwụkwọ a. Biko, gbalịa ka ị bịa.”
Ụlọ Nche Mach 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “A ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs Kraịst n’abalị atọ n’ọnwa Eprel. Ụfọdụ ndị bi n’ebe a ga-agbakọ n’ụbọchị ahụ cheta ya. Ma, e nwere ndị chere na ọnwụ Jizọs abaghị uru. Gịnị ka gịnwa chere? Ì chere na ọnwụ Jizọs na otú e si kpọlite ya n’ọnwụ baara anyị uru? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Baịbụl kwuru gbasara ya. [Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:22, 26.] Ụlọ Nche a kwuru na otu ụbọchị ndị mmadụ agaghịzi na-anwụ anwụ. Ihe a bụ otu n’ime uru ọnwụ Jizọs ga-abara anyị.”
Teta! Mach–Eprel
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Anyị bịara ka anyị gosi gị Teta! nke ọnwa a. E nwere otu ajụjụ dị mkpa a zara na ya. [Gosi ya ihu Teta! ahụ.] Gịnị ka i chere banyere ajụjụ a? [Gụọ Ilu 29:11.] Ì chere na ihe a Baịbụl kwuru ka bara uru taa? [Chere ka ọ zaa.] Teta! a kwuru ụzọ ihe anọ dị na Baịbụl na uru anyị ga-erite ma anyị mee ha.”