Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Mach
Gwa onye ị bịara na nke ya, sị: “Anyị bịara ka anyị gwa unu ihe ga-eme n’abalị iri na anọ n’ọnwa Eprel. A ga-echeta ọnwụ Jizọs n’ụbọchị ahụ. Ihe mere ụfọdụ ga-eji cheta ọnwụ Jizọs n’ụbọchị ahụ bụ na ha ma na ọnwụ ya baara ha uru. Ọtụtụ ndị ọzọ amaghị ma ọnwụ Jizọs ò nwere uru ọ bara. Ì chere na ọnwụ Jizọs baara anyị uru?” Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, gosi ya isiokwu dị n’azụ Ụlọ Nche Mach 1. Gị na ya tụlee ajụjụ nke mbụ, gụọkwa ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl e dere n’ebe ahụ. Nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ọzọ ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Mach 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya na Chineke akwụsịbeghị ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata n’ụwa a. Ì chere na ọ bụ maka na Chineke ahụghị anyị n’anya ka ọ̀ bụ na ọ chọrọ ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ? [Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, gụọ Jọn 3:16.] Ọtụtụ na-eji amaokwu Baịbụl a egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya, ma ha amaghị otú ọnwụ Jizọs si baara anyị uru. Ụlọ Nche a kwuru otú ọnwụ Jizọs ga-esi eme ka ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata n’ụwa a kwụsị.”
Teta! Mach–Eprel
“Ì chere na udo dị n’ọtụtụ ezinụlọ taa? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl gwara anyị ihe nne na nna na ụmụ ha ga-eme ka udo dị n’ezinụlọ ha. [Gụọ Ilu 24:3.] Ọtụtụ ndị achọpụtala na ime ihe Baịbụl kwuru na-enyere ha aka imeri nsogbu ọ bụla ha nwere. Teta! a kwuru gbasara ebe pụrụ iche n’Ịntanet nke ga-enyere ezinụlọ aka ịna-ebi n’udo. Ihe ndị e kwuru ebe ahụ si na Baịbụl. Anaghịkwa akwụ ụgwọ iji nweta ha.”