Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Ọktoba
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, sị ya: “Anyị bịara ka anyị na unu kwuo gbasara ọchịchị ga-eme ka nsogbu a na-enwe n’ụwa taa kwụsị. Ì chere na e nwere ọchịchị ga-emeli ka nsogbu ndị dị ka igbu ọchụ ma ọ bụ mmegbu kwụsị?” Chere ka ọ zaa. Gwaa ya na otu n’ime ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe n’ekpere mgbe ọ kụziiri ha Ekpere Onyenwe Anyị bụ ka Alaeze Chineke bịa. Gosi ya ihe dị n’azụ Ụlọ Nche Ọktoba 1, tụleenụ ihe dị n’okpuru ajụjụ nke mbụ. Gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl dị ebe ahụ. Nye ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, yiekwanụ mgbe ị ga-abịa ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Ọktoba 1
“Anyị na ndị agbata obi anyị na-ekwu banyere ekpere a Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. [Gụọ Matiu 6:9, 10.] Ị̀ ma ihe Alaeze Chineke pụtara na ihe mere Jizọs ji kwuo gbasara ya ọtụtụ ugboro mgbe ọ na-akụziri ndị mmadụ ihe? [Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa, gị asị ya:] Magazin a gosiri ihe Baịbụl kwuru gbasara Alaeze Chineke nakwa ihe ndị ọ ga-emere anyị.”
Teta! Septemba–Ọktoba
“Anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịchọta azịza ajụjụ a bụ́ ‘Olee otú anyị ga-esi na-adị n’udo?’ Gịnị ka i chere na ọ bụ ya na-eme ka ndị mmadụ na-adị n’udo? [Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa, sị ya:] E nwere ọtụtụ ihe na-akpata esemokwu, ọ bụghịkwa mmadụ niile na-achọ ime ihe ga-eme ka ha na ibe ha dị n’udo. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo ihe a. [Gụọ Ndị Rom 12:18.] Magazin a kwuru ihe ise ga-enyere anyị aka ịna-eme udo.” Gosi ya igbe dị na peeji nke 6.