Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/11 p. 4
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
  • Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2011
km 9/11 p. 4

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Ọktoba

“N’oge a ihe siri ike, o nweghị ezinụlọ ga-asị na ha anaghị enwe nsogbu. Olee ihe i chere ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme ka ezinụlọ anyị na-enwe obi ụtọ?” Chere ka ọ zaa. Nyezie onye nwe ụlọ Ụlọ Nche Ọktoba 1, gị na ya tụleekwa ihe e dere n’okpuru otu n’ime ajụjụ ndị dị na peeji nke 16 na nke 17. Gụọkwanụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu amaokwu Baịbụl e dere ebe ahụ. Unu mechazie, nyekwuo ya otu Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ ndị nke ọzọ.

Ụlọ Nche Ọktoba 1

Gosi onye nwe ụlọ ihu magazin ahụ ma jụọ ya, sị: “Olee otú obi ga-adị gị ma ị chọpụta na ihe ndị a kụziiri gị gbasara Chineke abụghị eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Jizọs kwuru na ọ bụ ya ga-enyere anyị aka ịma ihe bụ́ eziokwu na ihe na-abụghị eziokwu. [Gụọ Jọn 17:17.] Ebe a na-ekwu na ọ bụ naanị Baịbụl ga-agwa anyị eziokwu gbasara Chineke. Magazin a kwuru ụzọ ụgha ise a na-aghagide Chineke. Ma, Baịbụl gwara anyị nke bụ́ eziokwu.”

Teta! Ọktoba–Disemba

“Anyị na-agakwuru ezinụlọ dị iche iche taa na-agwa ha ihe ndị ga-abara ha uru. Ka m jụgodị gị: Olee nsogbu ị ga-asị na ọ bụ ya kacha nsogbu niile ndị nne na nna na-enwe ma a bịa n’ịzụ ụmụ? [Chere ka ọ zaa.] Ọtụtụ ndị nne na nna na-agba mbọ ime ihe Baịbụl kwuru. Dị ka ihe atụ, ihe a Baịbụl kwuru ebe a na-enyere ndị nne na nna aka ịma otú ha ga-esi na-adọ ụmụ ha aka ná ntị. [Gụọ Ndị Efesọs 4:31.] Magazin a kọwara ihe Baịbụl kwuru gbasara otú ndị nne na nna ga-esi zụọ ụmụ ha malite mgbe e ku ha n’aka ruokwa mgbe ha ghọrọ dimkpa.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya