Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 9
IZU NA-AMALITE NA MACH 9
Abụ nke 44 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 21 ¶9-15 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Samuel 1-4 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Samuel 2:30-36 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Ka Baịbụl Buru n’Amụma Gbasara Mesaya?—igw p. 10 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke Okwukwe Anyị—Hib. 12:2 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Dị Njikere Ịrụ Ezi Ọrụ Ọ Bụla.”—Taị. 3:1.
Nkeji 10: “Dị Njikere Ịrụ Ezi Ọrụ Ọ Bụla.” Okwu dabeere n’isiokwu ọnwa a. Gụọ Ilu 21:5, Taịtọs 3:1, na 1 Pita 3:15. Kọwaakwa ha. Kọwaa otú ịkwado nke ọma tupu anyị agaa ozi ọma ma ọ bụ ọmụmụ ihe si abara anyị uru. Ná nkenke, kwuo okwu n’ụfọdụ n’ime ihe omume ndị a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa a ma gosi otú ha si gbasa isiokwu ọnwa a.
Nkeji 10: Gbaa Onye Nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ajụjụ Ọnụ. Gịnị ka onye nlekọta ụlọ akwụkwọ na-arụ n’ọgbakọ? Gịnị ka ị na-emegasị kwa izu iji kwadebe maka iduzi ụlọ akwụkwọ? Olee ihe mere ụmụ akwụkwọ ji kwesị ịna-akwadebe ihe omume e nyere ha nke ọma? Olee uru ọ na-abara mmadụ niile ma onye ọ bụla kwadebe ihe a ga-amụ n’ụlọ akwụkwọ tupu a bịa ọmụmụ ihe?
Nkeji 10: “Ị̀ Na-akwado Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri nkeji ole na ole tụlee ihe dị na peeji nke abụọ n’Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Mach 2013. A ga-eme ihe ngosi ebe onye nkwusa na-anabata onye bịara iso anyị cheta ọnwụ Jizọs.
Abụ nke 8 na Ekpere