Akụkọ Ozi
Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na ndị nkwusa nyere akụkọ ozi ha n’ọnwa Ọgọst 2012 dị 344,342. Nke a bụ ọnụ ọgụgụ kacha elu anyị nwetụrụla. O ji 14,026 kara ndị nyere awa ha n’ọnwa Ọgọst 2011. N’ọnwa Ọgọst 2012, ndị nkwusa nyere awa 6,120,428. Nke a ji awa 512,607 kara awa ole ha nyere n’ọnwa Ọgọst 2011. Ihe a niile na-egosi na mmụọ Jehova na-enyere anyị aka n’ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ.—Ọrụ 1:8; 9:31.