Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 11
IZU NA-AMALITE NA MACH 11
Abụ nke 68 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 6 ¶13-18, igbe dị na peeji nke 74 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Mak 13-16 (Nkeji 10)
Nke 1: Mak 14:22-42 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Bụ Imehie Mmụọ Nsọ?—td 26D (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Bụ Mkpụrụ Obi?—td 24A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Matiu 10:7-10 na Luk 10:1-4. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Nkeji 10: Ụzọ Ndị Ị Pụrụ Isi Mụbaa Ozi Gị—Nkebi nke Mbụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 111, paragraf nke 1, ruo na peeji nke 112, paragraf nke 2. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị kwagara n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha mụrụ asụsụ ọzọ ka ha nwee ike izi ndị na-asụ asụsụ ahụ ozi ọma. Olee nsogbu ndị ha nwetara n’ebe ahụ? Oleekwa ihe ha mere ka nsogbu ndị ahụ ghara ime ka ha kwụsị ozi ha? Olee otú ezinụlọ ha ma ọ bụ ọgbakọ si nyere ha aka? Olee uru ha riterela?
Nkeji 10: “Jiri Obi Ụtọ Na-akwado Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs.” Ajụjụ na azịza. Kwuo ndokwa ndị unu mere maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Kwuokwa ebe ọgbakọ unu kesarala akwụkwọ ịkpọ òkù na ebe unu na-ekesabeghị ya.
Abụ nke 8 na Ekpere