Kpọọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs
1. Olee ihe anyị ga-amalite ime na Mach 17?
1 Kwa afọ, anyị na-eji oge Ncheta Ọnwụ Jizọs eme ka ndị mmadụ mara gbasara ọnwụ ya. (1 Kọr. 11:26) N’ihi ya, anyị chọrọ ka ndị mmadụ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, ka ha nụ otú Jehova si hụ anyị n’anya ma zitere anyị Ọkpara ya ka ọ gbapụta anyị. (Jọn 3:16) N’afọ a, anyị ga-amalite ịkpọ ndị mmadụ na Satọdee, Mach 17. Ọ̀ na-adị gị ka ụbọchị ahụ mee bịawa abịa?
2. Gịnị ka anyị nwere ike ikwu ma anyị nyewe mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù?
2 Ihe Anyị Nwere Ike Ikwu: Ọ ga-aka mma ka anyị gbuo okwu anyị nkenke. Anyị nwere ike ịsị: “Ndeewo. Anyị bịara na nke unu ka anyị gwa unu ka unu bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Anyị na-enwe ya kwa afọ n’ụwa niile. Nke afọ a ga-abụ n’Eprel 5. N’ụbọchị ahụ, a ga-eji Baịbụl kọwaa uru ọnwụ Jizọs nwụrụ baara anyị, kwuokwa ihe Jizọs na-eme ugbu a. O nweghị ụtụ a ga-ana ndị bịara gee okwu ahụ. E dere adres na oge a ga-enwe ya ná mpempe akwụkwọ a m chọrọ inye gị.” Ná ngwụcha izu, anyị hụ onye nwere mmasị anyị ga-enye magazin mgbe anyị na-ekesa mpempe akwụkwọ a, anyị kwesịrị inye ya ya.
3. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịkpọ ọtụtụ ndị ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?
3 Gbalịa Kpọọ Ọtụtụ Ndị: Ihe anyị kwesịrị ilekwasị anya bụ otú anyị ga-esi kpọọ ọtụtụ ndị ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. N’ihi ya, hụ na ị kpọrọ ndị ị na-amụrụ Baịbụl, ndị ị na-aga nletaghachi na nke ha, ndị ikwu gị, ndị ọrụ unu, ụmụ akwụkwọ unu, ndị agbata obi gị, na ndị ọzọ ị ma. Ndị okenye ọgbakọ unu ga-ahazi otú unu ga-esi jezuo ókèala unu. Òkù anyị na-akpọ ndị mmadụ kwa afọ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na-arụpụta ihe. N’afọ gara aga, mgbe otu ọgbakọ nọ na-enwe Ncheta Ọnwụ Jizọs, otu nwaanyị batara n’ebe ahụ, onye atendantị ajụọ ya aha onye kpọrọ ya ka o nwee ike ịkpọga ya ebe onye ahụ nọ. Nwaanyị ahụ agwa ya na ya amaghị onye ọ bụla n’ebe ahụ, na ọ bụ otu n’ime ndị pụtara ozi ọma n’ụbọchị ahụ gwara ya bịa.
4. Olee ihe mere anyị ga-eji jiri ịnụ ọkụ n’obi soro kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?
4 Onye i nyere akwụkwọ e ji akpọ ndị mmadụ òkù nwere ike ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ma, ọ bụrụgodị na o nweghị onye bịara n’ime ndị ị kpọrọ, mbọ ị gbara kpọọ ha bụ àmà n’onwe ya. Mpempe akwụkwọ ahụ ị ga-enye ha ga-eme ka ha mara na Jizọs bụ Eze dị ike ugbu a. Ọ bụrụ na i jiri ịnụ ọkụ n’obi kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, hanwa, ndị nkwusa ibe gị, na nke ka nke Jehova, ga-ama na obi dị gị ezigbo ụtọ ná nzite Jehova zitere Ọkpara ya ka ọ bịa gbapụta anyị.—Kọl. 3:15.