A Ga-ebido n’Eprel 2 Kesawa Akwụkwọ Ịkpọ Òkù Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs
1. Olee mgbe anyị ga-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ a, oleekwa uru ọ bara ikesa akwụkwọ ịkpọ òkù a kwa afọ?
1 Malite n’Eprel 2 ruo Eprel 17, anyị ga-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù maka ihe kacha mkpa a ga-eme n’afọ a, ya bụ, Ncheta Ọnwụ Jizọs. N’afọ ọ bụla, ọtụtụ ndị nwere mmasị na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs ma anyị kesachaa akwụkwọ ịkpọ òkù. Dị ka ihe atụ, n’ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs, otu nwaanyị kpọrọ alaka ụlọ ọrụ na fon ma sị ha: “Alọtara m ugbu a, hụ akwụkwọ ịkpọ òkù a fanyere n’ọnụ ụzọ m. Achọrọ m ịga ma amaghị m oge ọ ga-ebido.” Nwanna nwoke zara fon ahụ gwara ya ebe e dere oge a ga-eji bido ya n’akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ. Nwaanyị ahụ kwuziri, sị, “Aga m abịarịrị ihe a unu kpọrọ m òkù ya ná mgbede a!”
2. Gịnị ka anyị nwere ike ikwu mgbe anyị na-enye mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ?
2 Otú Anyị Ga-esi Ekesa Ya: Ebe ọ bụ na oge anyị ga-eji kesaa akwụkwọ ịkpọ òkù a n’ókèala anyị ebughị ibu, ọ kacha mma igbu okwu nkenke. Ihe anyị nwere ike ikwu bụ: “Ndeewo. Akwụkwọ ịkpọ òkù a anyị na-enye gị na ezinụlọ gị bụ maka otu ihe dị ezigbo mkpa a na-eme kwa afọ. A ga-eme ya na Sọnde, Eprel 17 n’ụwa niile. [Nye onyenwe ụlọ otu akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ.] Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị a ga-echeta ọnwụ Jizọs. A ga-eji Baịbụl kọwaa otú anyị ga-esi rite uru n’ọnwụ Kraịst nwụrụ maka ịgbapụta anyị. E nweghịkwa onye a ga-ana ego. E depụtara oge na ebe a ga-anọ eme ya n’akwụkwọ ịkpọ òkù a.”
3. Olee ihe ndị anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịkpọ ọtụtụ mmadụ?
3 Ọ bụrụ na ókèala ọgbakọ unu buru ibu, ndị okenye nwere ike ịgwa ndị nkwusa ka ha na-edebe otu akwụkwọ ịkpọ òkù na nke ndị na-anọghị n’ụlọ. E kwesịrị idebe ya ebe ndị na-agafe agafe na-agaghị ahụ ya. Hụ na ị kpọrọ ndị ị na-agara nletaghachi, ndị ikwu gị, ndị ọrụ ibe gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, nakwa ndị ọzọ gị na ha ma. Mgbe a na-ekesa ya ná ngwụcha izu, nyefee magazin mgbe o kwesịrị ekwesị. Ì nwere ike ịrụ ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Eprel, ka i nwee ike iwepụtakwu oge soro kesaa akwụkwọ ịkpọ òkù a?
4. Gịnị mere anyị ji chọọ ka ndị nwere mmasị bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?
4 A ga-agbara ndị niile nwere mmasị ga-abịanụ ezigbo àmà! Ha ga-anụ otú ihe mgbapụta ahụ si gosi na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. (Jọn 3:16) Ha ga-amụta ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ. (Aịza. 65:21-23) A ga-agwakwa ha na ha nwere ike ịgakwuru ndị atendantị ma gwa ha na ha chọrọ ka a bịa mụwara ha Baịbụl. Ekpere anyị bụ ka ọtụtụ ndị nwere ezi obi zaa òkù a ma bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs!