Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 25
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 25
Abụ nke 120 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 6 ¶1-6 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Mak 5-8 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: “Ị̀ Ga-ekwo na Ndị Ọzọ Alawala Gị Alawa?” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Nkeji 10: Ozi Anyị Na-aghaghị Ịkpọsa—“Ịgba Àmà Banyere Jizọs.” Okwu a ga-eji ịnụ ọkụ n’obi kwuo. Ọ ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, n’isiokwu nta dị na peeji nke 275 ruo ná ngwụcha peeji nke 278.
Nkeji 15: Jehova Na-enye Anyị Ike Anyị Ji Na-ekwusa Ozi Ọma. (Fil. 4:13) Gbaa ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ ndị nkwusa atọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị na-agachi ozi ọma anya n’agbanyeghị ọrịa ha na-arịa. Jụọ ha nsogbu ndị ha na-enwe. Gịnị na-enyere ha aka ka nsogbu ha ghara ime ka ha na-enwe obi ọjọọ mgbe niile? Olee otú ụmụnna sirila nyere ha aka? Olee uru ịgachi ozi ọma anya baarala ha?
Abụ nke 42 na Ekpere