Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Febụwarị 25, 2013. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
1. Gịnị mere Jizọs ji kwuo na “ndị na-eru uju” ga-enwe obi ụtọ? (Mat. 5:4) [Jen. 7, w09 2/15 p. 6 para. 6]
2. Olee ihe Jizọs bu n’obi mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ekwela ka anyị daba n’ọnwụnwa”? (Mat. 6:13) [Jen. 7, w04 2/1 p. 16 para. 13]
3. Gịnị mere Jizọs ji kwuo na ndị na-eso ụzọ ya agaghị agazu obodo niile “ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute”? (Mat. 10:23) [Jen. 14, w10 9/15 p. 9 para. 12; w87 8/1 p. 9 para. 1]
4. Olee ihe abụọ ihe atụ ahụ Jizọs ji mkpụrụ mọstad mee mere ka ha pụta ìhè? (Mat. 13:31, 32) [Jen. 21, w08 7/15 p. 17-18 para. 3-8]
5. Na Matiu 18:3 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu echigharịghị wee dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze eluigwe ma ọlị.” Gịnị ka Jizọs ji ihe ahụ ọ gwara ha kụziere ha? [Jen. 28, w07 2/1 p. 9-10 para. 3-4]
6. Gịnị ka ihe Jizọs kwuru nke bụ́ “ọ bụ gị kwuru ya” pụtara? (Mat. 26:63, 64) [Feb. 11, w11 6/1 p. 18]
7. Gịnị mere e ji kpọọ Jizọs “Onyenwe ụbọchị izu ike”? (Mak 2:28) [Feb. 18, w08 2/15 p. 28 para. 7]
8. Gịnị mere Jizọs ji kwuo ihe ahụ o kwuru banyere mama ya na ụmụnne ya? Oleekwa ihe nke ahụ na-akụziri anyị? (Mak 3:31-35) [Feb. 18, w08 2/15 p. 29 para. 5]
9. Mak 8:22-25 kwuru gbasara otu nwoke kpuru ìsì nke Jizọs mere ụzọ ihe abụọ tupu ya ahụwa ụzọ. Gịnị mere Jizọs ji si otú ahụ gwọọ ya? [Feb. 25, w00 2/15 p. 17 para. 7]
10. Mak 8:32-34 kwuru otú Pita si baara Jizọs mba. Olee ihe anyị mụtara n’ihe Jizọs mere mgbe ahụ ọ baara ya mba? [Feb. 25, w08 2/15 p. 29 para. 6]