ISI NKE ISII
“Biko, Rube Isi N’ihe Jehova Kwuru”
1, 2. Olee ihe ndị na-eso ‘ụzọ ndị ọzọ na-eso’ na-echekarị, gịnịkwa mere i ji kwesị ịdị iche?
ỌTỤTỤ ndị taa anaghị achọ irube isi. Mgbe ha na-ekpebi ihe ha ga-eme, ha anaghị atụle ma ihe ha chọrọ ime ò ziri ezi ma ọ bụ na o zighị ezi. Kama nke ahụ, e nwere ike ikwu na ihe ha na-eche bụ ‘Mee ihe masịrị gị’ ma ọ bụ ‘Mee ihe a na-agaghị ejide gị na ya.’ I nwere ike ịhụ ụdị àgwà a mgbe ndị ọkwọ ụgbọala dara iwu okporo ụzọ, mgbe ndị oji ego achụ ego dara iwu ndị ọchịchị, mgbe ndị isi ọchịchị dara iwu ndị o nwere ike ịbụ na ha nyere aka mee. Ndị mmadụ na-emekwa ụdị omume ahụ n’oge Jeremaya, ya bụ, iso ‘ụzọ ndị ọzọ na-eso,’ n’agbanyeghị na ọ bụ ụzọ ọjọọ nke na-akpata nsogbu.—Jere. 8:6.
2 Ị ma na ndị chọrọ ime ihe dị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile mma ekwesịghị iso ‘ụzọ ndị ọzọ na-eso’ naanị n’ihi na ọtụtụ ndị na-eso ya. Jeremaya mere ka a mata otú ndị “na-erubeghị isi n’ihe Jehova kwuru” si dị iche ná ndị chọrọ irubere ya isi. (Jere. 3:25; 7:28; 26:13; 38:20; 43:4, 7) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịtụle ebe ọ kwụ n’okwu a. N’ihi gịnị? N’ihi na Setan ji obi ọjọọ na-alụso ezi ndị na-efe Chineke ọgụ ka ha kwụsị ime ihe Chineke chọrọ. Ọ na-eme ka agwọ nke na-eji nwayọọ ezo ma chebiri ihe ọ bụla ga-aghọrọ ya anụ oriri. Ọ na-esi ebe ahụ taa ya arụ ma tagbuo ya. Otú anyị si kpebisie ike irubere Jehova isi na-enyere anyị aka ka agwọ ahụ ghara ịta anyị. Ma olee otú anyị nwere ike isi kpebisikwuo ike irubere Jehova isi? Ihe Jeremaya dere nwere ike inyere anyị aka.
ONYE ANYỊ KWESỊRỊ IRUBERE ISI
3. Gịnị mere anyị ji kwesị irubere Jehova isi?
3 Gịnị mere anyị ji kwesị irubere Jehova isi? Jeremaya mere ka anyị mata otu ihe mere anyị ji kwesị irubere ya isi. Ọ kpọrọ ya “Onye ji ike ya kee ụwa, Onye jikwa amamihe ya mee ka elu ala guzosie ike.” (Jere. 10:12) Jehova bụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa. Anyị kwesịrị ịtụ egwu ya karịa ndị ọzọ niile na-achị achị. O ruru eru ịgwa anyị ka anyị na-edebe iwu amamihe ya, bụ́ ndị ga-abara anyị uru mgbe niile ma ọ bụrụ na anyị na-edebe ha.—Jere. 10:6, 7.
Ịṅụ “mmiri na-enye ndụ” nke Jehova na-enye ga-eme ka i kpebisikwuo ike irubere ya isi
4, 5. (a) Olee eziokwu ndị Juu mụtara n’oge ndị ahụ e nwere ụkọ mmiri ozuzo? (b) Olee otú ndị bi na Juda si jụ “mmiri na-enye ndụ” nke Jehova nyere ha? (ch) Olee otú ị ga-esi ṅụọ “mmiri na-enye ndụ” nke Chineke na-enye?
4 Ma, ọ bụghị naanị na Jehova bụ Onye na-achị eluigwe na ụwa. Ọ bụkwa ya ji anyị ndụ. E mere ka o doo ndị Juu bi n’oge Jeremaya anya nke ọma. Ọ bụ n’Osimiri Naịl ka ndị Ijipt si enweta mmiri, ma ọ bụghị n’osimiri ka ndị bi n’Ala Nkwa ahụ si enweta mmiri. Ihe na-enyekarị ndị Chineke mmiri bụ mmiri na-ezo n’oge ya. Ọtụtụ mgbe, ha na-egwu olulu mmiri, bụ́ ebe ha na-echekwa mmiri zoro ezo. (Diut. 11:13-17) Ọ bụ naanị Jehova nwere ike ime ka mmiri zoo ma dee ala ka o nwee ike ime nri. Ma, o nwere ike ime ka mmiri ghara izo. N’ihi ya, n’oge Jeremaya, e nwere ọtụtụ mgbe mmiri na-ataghị kpọm n’ala ndị Juu ahụ, bụ́ ndị nnupụisi, ruo mgbe ubi ha na ubi vaịn ha kpọrọ nkụ, mmiri dị n’olulu mmiri ha ataakwa.—Jere. 3:3; 5:24; 12:4; 14:1-4, 22; 23:10.
5 Ndị Juu ahụ ma uru mmiri nkịtị bara, ma ha jụrụ “mmiri na-enye ndụ” nke Jehova nyere ha. Ihe gosiri na ha anabataghị ya bụ na ha kpachaara anya nupụ isi n’Iwu Chineke, tụkwasịkwa mba ndị gbara ha gburugburu obi n’ihi na ha na ha gbara ndụ. Ndị Juu tara ahụhụ ihe ahụ ha mere n’ihi na ha yiri ndị nọ n’oge ụkọ mmiri ma na-awụnye mmiri ha n’olulu gbawara agbawa, nke na-enweghị ike ichedo mmiri. (Gụọ Jeremaya 2:13; 17:13.) Anyị ekwesịghị ime ụdị omume ahụ, nke bụ́ iji aka anyị kpatara onwe anyị ọdachi dị ukwuu. Jehova ka si n’Okwu ya e dere site n’ike mmụọ nsọ na-enye anyị ọtụtụ nduzi. O doro anya na naanị ihe ga-eme ka “mmiri ahụ na-enye ndụ” baara anyị uru bụ ịmụ ya mgbe niile na ịgbalịsi ike ime ihe anyị mụtara.
6. (a) Kọwaa otú Eze Zedekaya si lee irubere Jehova isi anya. (b) Gịnị ka i chere mere o ji bụrụ na eze ahụ amaghị ihe?
6 Ka ụbọchị Chineke ga-eme ka ndị bi na Juda zaa ajụjụ na-eru nso, ọ dị oké mkpa ka ha na-erube isi. Onye Juu ọ bụla nke chọrọ ka Jehova gọzie ya ma chebe ya kwesịrị ichegharị ma malite irubere ya isi. Eze Zedekaya kwesịrị ikpebi ihe ọ ga-eme n’ụdị ihe ahụ. Obi esighị ya ike ime ihe ziri ezi. Mgbe ndị ọ na-achị gwara ya na ha chọrọ igbu Jeremaya, obi akaghị ya igbochi ha. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Ise, Ibed-melek nyere aka napụta Jeremaya ka a ghara igbu ya. Onye amụma ahụ mechara gwa Zedekaya, sị: “Biko, rube isi n’ihe Jehova kwuru.” (Gụọ Jeremaya 38:4-6, 20.) O doro anya na ọ bụrụ na eze ahụ chọrọ ka ihe dịrị ya mma, o kwesịrị ikpebi irubere Chineke isi.
Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka Jeremaya gwa ndị Juu ugboro ugboro ka ha rubere Chineke isi?
IRUBERE JEHOVA ISI DỊ OKÉ MKPA
7. Olee mgbe ụfọdụ e nwere ike ịnwa anyị ọnwụnwa ka anyị nupụ isi?
7 Irube isi dị mkpa taa otú ahụ ọ dị n’oge Jeremaya. Ì kpebisiri ike irubere Jehova isi? Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-egosi ndị gba ọtọ n’Ịntanet, ị̀ ga na-ele ya, ka ị̀ ga-alụso ọnwụnwa ahụ ọgụ ma si n’ebe ahụ pụọ? Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe gị na ya na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe gị asị gị ka gị na ya kpapụ? Obi ọ̀ ga-aka gị ịjụ? Ọ bụrụ na ị hụ akwụkwọ ndị si n’ezi ofufe dapụ dere ma ọ bụ ihe ha debere n’Ịntanet, ị̀ ga-agụ ya ka ọ̀ ga-asọ gị oyi? Mgbe ụdị ihe ahụ mere, cheta ihe Jeremaya 38:20 kwuru.
8, 9. (a) Gịnị mere i ji kwesị ige ntị mgbe ndị okenye na-agbalị inyere gị aka? (b) Olee otú i kwesịrị isi na-ele ndụmọdụ ndị okenye na-enye gị ugboro ugboro anya?
8 Jehova zigara Jeremaya ugboro ugboro ka ọ dụọ ndị ya ọdụ, sị: “Biko, onye ọ bụla n’ime unu hapụ ụzọ ọjọọ ya, meekwanụ ka ụzọ unu na omume unu dị mma.” (Jere. 7:3; 18:11; 25:5; gụọ Jeremaya 35:15.) Ndị okenye ọgbakọ na-eme ihe yiri ya taa. Ha na-agbalịsi ike inyere ụmụnna ha aka izere ihe ga-emebi adịm ná mma ha na Chineke. Ọ bụrụ na ndị okenye enye gị ndụmọdụ ka ị hapụ àgwà ụfọdụ na-adịghị mma, gee ha ntị. Ha chọrọ ime otú ahụ Jeremaya mere.
9 Ndị okenye nwere ike ichetara gị ụkpụrụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị ha gwaburu gị. Cheta na inye mmadụ ndụmọdụ ugboro ugboro anaghị adị mfe, ma ọ na-aka esi ike ma ọ bụrụ na onye a na-enye ndụmọdụ na-akpa àgwà ka ọtụtụ n’ime ndị Juu ahụ Jeremaya gwara okwu. Ọ bụrụ na ndị okenye na-agba mbọ ugboro ugboro inyere gị aka, gbalịa ịghọta na ọ bụ otú Jehova si egosi na ọ hụrụ gị n’anya. Chetakwa na Jeremaya agaaraghị adọ ndị Juu aka ná ntị ọtụtụ ugboro ma a sị na ha mere ihe ọ gwara ha. N’ezie, onye na-achọghị ka e nye ya ndụmọdụ ugboro ugboro kwesịrị ime ihe a gwara ya n’egbughị oge.
Mgbe ndị okenye na-agbalị inyere gị aka, gee ha ntị
JEHOVA NA-AGBAGHARA MMEHIE KPAMKPAM, MA Ọ NAGHỊ AGBAGHARA N’ECHEGHỊ ECHICHE
10. Gịnị mere Jehova anaghị agbaghara mmehie n’echeghị echiche?
10 Otú ọ sọkwara anyị gbalịa, anyị enweghị ike irubere Jehova isi n’usoro ihe dị ugbu a n’emehieghị. Ọ bụ ya mere anyị ji ekele ya n’ihi na ọ na-agbaghara anyị mmehie anyị. Ma, ọ naghị agbaghara mmehie n’echeghị echiche. N’ihi gịnị? N’ihi na mmehie rụrụ arụ n’anya Jehova. (Aịza. 59:2) N’ihi ya, ọ na-achọ ịmara ma ànyị rukwara eru ka ọ gbaghara anyị.
11. Gịnị mere mmadụ ga-eji taa ahụhụ mmehie o mere na nzuzo?
11 Dị ka anyị hụrụla, ọtụtụ ndị Juu n’oge Jeremaya nupụụrụ Jehova isi ugboro ugboro, si otú ahụ were ndidi Chineke na ebere ya na-egwuri egwu. Ohu Chineke ò nwere ike ime ụdị ihe ahụ taa? O nwere ike ime ya ma ọ bụrụ na o leghara iwu Jehova anya ma malite ime mmehie. Ụfọdụ emeela ụdị ihe ahụ n’ezoghị ya ezo, dị ka mgbe mmadụ gara lụọ onye na-ekwesịghị ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye. Ma ọ bụrụgodị na o nweghị onye hụrụ mmadụ mgbe ọ na-eme mmehie, onye ahụ nupụụrụ Jehova isi ji ọkụ na-egwuri egwu. Onye na-ebi ndụ ihu abụọ nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ọ dịghị onye ga-achọpụta ihe m na-eme.’ Ma nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke ma ihe mmadụ na-eche nakwa ihe o bu n’obi. Ọ na-ahụkwa ihe na-eme na nzuzo. (Gụọ Jeremaya 32:19.) Ma olee ihe e kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmadụ nupụụrụ Chineke isi n’eziokwu?
12. Olee ihe ndị okenye na-eme mgbe ụfọdụ iji chebe ọgbakọ?
12 Mgbe Chineke si n’aka Jeremaya chọọ ugboro ugboro inyere ndị Juu aka, ọtụtụ n’ime ha kpọrọ ekwo nkụ. N’otu aka ahụ, onye mere mmehie dị oké njọ taa nwere ike jụ ichegharị, jụkwa enyemaka ndị okenye. Ụdị ihe ahụ mee, ndị okenye ga-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ka e mee iji chebe ọgbakọ, ya bụ, ịchụpụ onye ahụ mere ihe ọjọọ n’ọgbakọ. (1 Kọr. 5:11-13; gụọ igbe dị na peeji nke 73, bụ́ “Ibi Ndụ n’Enweghị Iwu Ọ Bụla.”) Ma ọ̀ pụtara na olileanya adịghịziri onye ahụ, na o nweghị ihe ga-eme ka Jehova meere ya ebere? Mbanụ. Ndị Izrel nupụụrụ Chineke isi ruo ogologo oge. N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke gwara ha, sị: “Lọghachinụ, unu ụmụ na-enupụ isi. M ga-agwọ nnupụisi unu.” (Jere. 3:22)a Jehova na-akpọ ndị mere ihe ọjọọ òkù ka ha lọghachikwute ya. N’eziokwu, ọ na-akpọ ha ka ha mee otú ahụ.
Ọ bụrụ na anyị emehie, gịnị mere anyị ji kwesị ịchọ ka Chineke gbaghara anyị?
RUBERE JEHOVA ISI MA LAGHACHIKWUTE YA
13. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịlaghachikwute Jehova, olee ihe o kwesịrị ịghọta?
13 Jeremaya kwuru na onye chọrọ ịlaghachikwute Chineke kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Gịnị bụ ihe a m mere?’ Onye ahụ kwesịkwara ịchọpụta ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ihe o mere, ma gwa onwe ya eziokwu. Ndị Juu ahụ na-ekweghị echegharị n’oge Jeremaya achọghị ịjụ onwe ha ajụjụ ahụ. Ha ekwetaghị na ha mere ihe jọgburu onwe ya. N’ihi ya, Jehova agbagharaghị ha n’ihi na o kwesịghị ịgbaghara ha. (Gụọ Jeremaya 8:6.) Ma onye mmehie nke chegharịrị ná mmehie ya na-aghọta na isi o nupụụrụ Jehova ewetarala aha Chineke na ọgbakọ Ndị Kraịst nkọcha. Ọ bụrụ na mmadụ echegharịa n’eziokwu, ọ ga na-ewute ya nke ukwuu na ya akpatarala ndị ọ na-enweghị ihe ha mere nsogbu. O kwesịrị ịmata na ọ bụ naanị mgbe ọ ghọtara ihe niile omume ọjọọ ya mebiri ka Jehova ga-anabata arịrịọ ọ na-arịọ ka a gbaghara ya. Ma e nwere ihe ndị ọzọ onye ahụ ga-eme ka Chineke meere ya ebere.
14. Olee otú mmadụ ga-esi ‘alaghachikwuru Jehova’? (Kwuo ihe dị n’igbe bụ́ “Gịnị Bụ Nchegharị?”)
14 Onye chegharịrị n’eziokwu na-enyocha ihe ndị o bu n’obi, ihe ndị na-amasị ya, na àgwà ya. (Gụọ Abụ Ákwá 3:40, 41.) Ọ ga-enyocha ebe o nwere nsogbu, n’ihe ndị dị ka otú ya na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya si akpa, ịṅụ sịga, otú o si aṅụ mmanya na-aba n’anya, ebe ndị ọ na-aga n’Ịntanet, ma ọ bụ otú o si achụ ego. Nwaanyị nwe ụlọ na-ehichasị ebe niile n’usekwu ya, ma ebe ndị zoro ezo, iji hụ na ụlọ ya dị ọcha. Otú ahụ ka onye chegharịrịnụ kwesịrị ịgbalịsi ike ime ka echiche ya na ihe ndị ọ na-eme na nzuzo dị ọcha. O kwesịrị ime ihe Jehova chọrọ ma na-edebe iwu ya, si otú ahụ ‘laghachikwuru ya.’ Ụfọdụ ndị Juu n’oge Jeremaya ‘ji aghụghọ’ laghachikwute Jehova. Ha mere ka à ga-asị na ihe ha mere wutere ha, ma ha agbanweghị obi ha ma ọ bụ otú ha si ebi ndụ. (Jere. 3:10) Onye ji obi ya dum na-arịọ ka Jehova gbaghara ya anaghị eme ka ha, nke bụ́ ịgbalị ịghọgbu Jehova na ọgbakọ ya. Mkpa ya abụghị ka o nwee aha ọma ma ọ bụ ka ndị ikwu ya ma ọ bụ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nabata ya. Ọ chọrọ ịhapụ ihe ọjọọ o mere kpamkpam, ka Chineke gbaghara ya ma meere ya ebere.
15. Olee ụdị ekpere onye chegharịrị n’eziokwu na-ekpeku Chineke?
15 Ekpere bụ otu n’ime ihe ga-enyere mmadụ aka ichegharị ná mmehie ya. N’oge ochie, ndị mmadụ na-achịlikarị aka elu mgbe ha na-ekpe ekpere. Taa, mgbe onye chegharịrị n’eziokwu na-ekpe ekpere, Jeremaya kwuru na onye ahụ ‘na-agbasapụrụ Chineke obi ya na ọbụ aka ya.’ (Ákwá 3:41, 42) Ọ bụrụ na onye mmehie akwaa ụta n’ihe o mere, ọ ga-eme ka ọ hapụ omume ọjọọ ahụ ọ na-ekpe ekpere ka Chineke gbaghara ya. Ekpere ọ na-ekpe ga-esi ya n’ala ala obi.
‘Gịnịdị mere m ji kpọchie ntị?’
16. Gịnị mere onye mmehie ji kwesị ịlaghachikwuru Chineke?
16 O doro anya na ị ghọtara na ọ bụrụ na onye mmehie ekweta n’eziokwu na ya mere ihe ọjọọ, o nwere ike ịdị mkpa ka ọ hapụ mpako ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịlaghachikwuru Chineke. Ma otu eziokwu dị mkpa bụ na Jehova chọrọ ka ndị mmehie laghachikwute ya. Ọ bụrụ na Chineke ahụ onye na-akwa ezigbo ụta n’obi ya n’ihi ihe o mere, ọ na-emetụ ya n’obi. Ọ na-enwere ya ọmịiko n’ihi na ọ chọrọ ịgbaghara ndị niile chegharịrị ná mmehie ha, ọbụna otú ahụ ọ gbaghaara ndị Izrel si n’obodo ndị dọọrọ ha n’agha lọta. (Jere. 31:20) Ọ na-emesi anyị obi ike ịmara na Chineke na-eme ka ndị na-erubere ya isi nwee udo na olileanya! (Jere. 29:11-14) Ha nwere ike iso ndị ohu Chineke ndị ọzọ na-ejere ya ozi.
NRUBEISI NWERE IKE ICHEBE GỊ
17, 18. (a) Ole ndị bụ ndị Rikab? (b) Dị ka e sere na peeji nke 77, gịnị ka e ji echeta ha?
17 Irubere Jehova isi mgbe niile bara ezigbo uru. Akụkọ banyere ndị Rikab n’oge Jeremaya gosiri na ọ bụ eziokwu. Nna nna ha bụ Jehọnadab onye Kenaịt nke ji obi ya dum kwado Jihu. Ihe karịrị narị afọ abụọ tupu oge Jeremaya, Jehọnadab nyere ndị Rikab iwu ma gwa ha ihe ụfọdụ ha na-agaghị eme. Otu n’ime iwu o nyere ha bụ na ha agaghị aṅụ mmanya. Jehọnadab anwụọla kemgbe, ma ndị Rikab ka nọ na-erubere ya isi. Jeremaya lere ha ule. Ọ kpọbara ha n’otu n’ime ụlọ iri ihe dị n’ụlọ nsọ ma dọba mmanya n’ihu ha, sị ha ṅụọ. Ha gwara ya, sị: “Anyị agaghị aṅụ mmanya.”—Jere. 35:1-10.
18 Ndị Rikab weere na irubere nna ha ochie nwụrụ kemgbe isi dị mkpa. Ezi ndị na-efe Chineke dị ndụ kwesịrị ịgbalịsi ike irube isi n’iwu ya karịa otú ahụ ndị Rikab rubeere nna nna ha. Otú ndị Rikab si kpebisie ike irube isi tọrọ Jehova ụtọ. O mere ka ha dị iche ná ndị Juu ahụ bụ́ ndị nnupụisi. Chineke kwere ndị Rikab nkwa na ya ga-echebe ha mgbe a ga-ebibi Jeruselem. E jiri ihe anyị mụtara n’akụkọ ahụ kọwaa ihe ga-eme n’oge anyị a, ọ̀ bụ na o kwesịghị ekwesịghị na Jehova na-eme ka obi sie ndị na-erubere ya isi mgbe niile ike na ọ ga-echebe ha n’oké mkpagbu na-abịanụ?—Gụọ Jeremaya 35:19.
Gịnị mere ichegharị ná mmehie dị oké njọ ji dị mkpa ma ọ bụrụ na mmadụ chọrọ irubere Chineke isi? Olee otú irubere Chineke isi ga-esi eme ka mmadụ ghara ime mmehie nke ga-eme ka nchegharị dị ya mkpa?
JEHOVA NỌNYEERE NDỊ NA-ERUBERE YA ISI
19. Olee otú Chineke ga-esi echebe gị ma i rubere ya isi?
19 Anyị ekwesịghị iche na ọ bụ naanị n’oge ochie ka Chineke chebere ndị ya. Jehova na-echebekwa ndị na-erubere ya isi taa ka ihe ọ bụla ghara imebi adịm ná mma ha na ya. Iwu Chineke na-echebe ndị na-amụ ya ma na-eme ihe ha mụtara, otú ahụ mgbidi dị elu si chebe obodo ndị dị n’oge ochie mgbe a bịara ibuso ya agha. Ị̀ ga na-erube isi n’iwu Chineke nyere banyere omume, nke yiri ịnọ n’obodo nke nwere mgbidi? Ka obi sie gị ike na ọ ga-adịrị gị mma ma i mee otú ahụ. (Jere. 7:23) Ọtụtụ akụkọ mere eme na-egosi na ọ bụ eziokwu.—Gụọ igbe bụ́ “Irubere Jehova Isi Na-echebe Mmadụ.”
20, 21. (a) Ka ị na-ejere Jehova ozi, olee ihe kwesịrị imesi gị obi ike? (b) Olee ihe Eze Jehoyakim mere mgbe Chineke si n’ọnụ Jeremaya zie ya ozi?
20 Ndị mmegide nwere ike ịbụ ndị ezinụlọ gị, ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ, ụmụ akwụkwọ ibe gị ma ọ bụ ndị na-achị ebe i bi. Ha na-eme ka o siere anyị ike ijere Chineke ozi. Ma, ka obi sie gị ike na ọ bụrụ na ị na-erubere Jehova isi mgbe niile, ọ ga na-akwado gị ọbụna n’oge ihe siri oké ike. Echefula na Chineke kwere Jeremaya nkwa na ya ga-akwado ya n’agbanyeghị na ndị mmadụ ga-eji obi ọjọọ na-emegide ya. Jehova mezuru nkwa ya. (Gụọ Jeremaya 1:17-19.) Otu n’ime oge Chineke chebere ya bụ n’oge Eze Jehoyakim.
21 N’ime ndị eze chịrị Izrel, o siri ike ịhụ onye ji obi ọjọọ megide ndị ozi Chineke otú Jehoyakim mere. Ihe Jehoyakim mere onye amụma bụ́ Yuraịja, onye ya na Jeremaya jere ozi n’otu oge, gosiri na ọ bụ eziokwu. Ajọ Eze Jehoyakim zigara ndị ozi ya, ha achụrụ ya gaa ná mba ọzọ ọ gbagara. Mgbe ha kpụlatara onye amụma Jehova bụ́ Yuraịja, eze gburu ya. (Jere. 26:20-23) N’afọ nke anọ nke ọchịchị Jehoyakim, Jehova nyere Jeremaya iwu ka o were akwụkwọ mpịakọta dee ihe niile ọ gwara ya ruo mgbe ahụ nakwa ka ọ gaa gụpụta ya n’ụlọ nsọ. Jehoyakim weere akwụkwọ mpịakọta ahụ Jeremaya dere ma gwa onye na-ejere ya ozi ka ọ gụpụtara ya ihe o dere na ya. Ka a na-agụrụ ya eze, ọ chabiiri nke ọ bụla a gụụrụ ya tụba n’ọkụ, n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị isi rịọrọ ya ka ọ ghara ịgba ya ọkụ. O mechara ziga ndị ozi ka ha gaa kpụta Jeremaya na Barọk. Gịnịzi mere? “Jehova zoro ha.” (Jere. 36:1-6; gụọ Jeremaya 36:21-26.) Jehova ekweghị ka Jehoyakim mee ndị ikom abụọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ihe ọ bụla.
22, 23. Gịnị ka ihe a kọrọ banyere otu Onyeàmà bi n’otu obodo dị n’etiti Eshia mere ka ị ghọta banyere otú Chineke si akwado ndị ya?
22 Jehova nwekwara ike izo ndị ohu ya taa mgbe nsogbu bịara ma ọ bụrụ na ọ chọpụta na ọ dị mkpa. Ma ọtụtụ mgbe, ọ na-enye ha obi ike na amamihe ha ga-eji na-erubere ya isi ma na-ekwusa ozi ọma. E nwere otu nwaanyị anyị ga-akpọ Giulistan. Ọ bụ naanị ya na-azụ ụmụ ya anọ. Jehova kwadoro ya. E nwere mgbe naanị ya bụ Onyeàmà n’obodo ndị dị n’etiti Eshia, bụ́ ebe ndị ọchịchị na-emegide ozi ọma Alaeze. Isi n’ebe o bi ruo ọgbakọ kacha dịrị ya nso karịrị narị kilomita anọ. N’ihi ya, ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-ahụ Ndị Kraịst tozuru okè ha na ya ga-anọkọ. N’agbanyeghị mmegide na nsogbu ndị ọzọ, ọ na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọtụtụ ndị na-enwekwa mmasị n’ozi ya. Akụkọ anyị nwetara n’oge na-adịbeghị anya gosiri na ọ na-amụrụ ihe ruru iri mmadụ abụọ Baịbụl ma na-elekọta ìgwè atụrụ Jehova nke na-amụba n’ike n’ike.
23 Chineke dị njikere inyere gị na ndị ohu ya ndị ọzọ na-erubere ya isi aka otú ahụ o nyeere Jeremaya na Ndịàmà dị ka Giulistan. Kpebisie ike irubere ya isi dị ka Onye Na-achị Achị karịa mmadụ. I mee otú ahụ, mmegide na nsogbu ndị ọzọ agaghị egbochi gị ito onye naanị ya bụ ezi Chineke n’ihu ndị nọ n’ókèala unu.—Jere. 15:20, 21.
24. Olee uru ndị ị ga-erite ugbu a ma i rubere Chineke isi?
24 Anyị agaghị enwe ezigbo obi ụtọ na ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị anaghị erubere Onye Okike anyị isi. (Jere. 10:23) Ugbu a ị mụchara ihe Jeremaya dere banyere irubere Chineke isi, è nwere ebe ndị i chere i kwesịrị ikwe ka Jehova duzikwuo nzọụkwụ gị? Ọ bụ naanị iwu ya ga-eduzi mmadụ ibi ụdị ndụ ga-eme ka o nwee ezigbo obi ụtọ, ihe agakwaara ya nke ọma. Jehova na-arịọ anyị, sị: “Rubenụ isi n’ihe m kwuru, . . . ka ihe wee gaziere unu.”—Jere. 7:23.
Olee otú ị ga-esi jiri ihe ị mụtara banyere nrubeisi n’akwụkwọ Jeremaya mee ka mmekọrịta gị na Chineke ka mma?
a Ọ bụ alaeze ebe ugwu nke Izrel ka Jehova gwara okwu ahụ. Mgbe Jeremaya ziri ndị bi n’alaeze ebo iri ozi ahụ, ha anọọla ihe dị ka otu narị afọ n’obodo ndị dọọrọ ha n’agha. O kwuru na ruo n’ụbọchị ya, mba ahụ echegharịbeghị. (2 Eze 17:16-18, 24, 34, 35) Ma, onye ọ bụla n’ime ha nwere ike ịlaghachikwute Chineke, nke ga-eme ka o si n’obodo ndị dọọrọ ha n’agha lọta.