Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 3
IZU NA-AMALITE NA MACH 3
Abụ nke 112 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 3 ¶19-21, igbe dị na peeji nke 34 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 36-39 (Nkeji 10)
Nke 1: Jenesis 37:1-17 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ịsụ Asụsụ Dị Iche Iche Ọ̀ Bụ Ihe Na-egosi na Mmadụ na Chineke Dị ná Mma?—td 19D (Nkeji 5)
Nke 3: Ndị Ọzọ Dị Elu Karịa Anyị—lr isi nke 8 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Mach. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi enye mmadụ magazin. A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi a. E mechaa ya, tụlezienụ ihe dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.” Ná mmechi, gwa ụmụnna ka ha kwuo otú ha ga-esi enyekọta mmadụ magazin na akwụkwọ ịkpọ òkù na Satọdee nakwa na Sọnde.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kwuo otú ha si mee ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ide Ihe Ụfọdụ Gbasara Onye Anyị Ziri Ozi Ọma.” Gwakwa ha ka ha kọọ ahụmahụ ọ bụla dị ụtọ ha nwere.
Abụ nke 95 na Ekpere