Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 8
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 8
Abụ nke 47
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
lv isi nke 16 ¶15-22, igbe dị na peeji nke 194
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl:Ndị Ikpe 11-14
Na 1: Ndị Ikpe 13:1-14
Na 2: Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Okwu Jizọs E Dere na Luk 16:9-13?
Na 3: Mmịnye Ọbara Na-emebi Ịdị Nsọ nke Ọbara (td 38A)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 67
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Ịza Ajụjụ Gbasara Ememme Okpukpe. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke ga-esi n’akwụkwọ Bible Na-akụzi, peeji nke 222 ruo peeji nke 223, malite n’isiokwu sị: “Ànyị Kwesịrị Ime Ememe Okpukpe?” Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: Olee ememme ndị bi n’ókèala unu na-emekarị? Olee mgbe i nwere ike ịgbara mmadụ àmà gbasara ememme okpukpe? Gwa otu nne ma ọ bụ nna ka o mee ihe ngosi ebe ọ na-akọwara nwa ya ihe nwa ya nwere ike ikwu ma mmadụ jụọ ya, sị: “Gịnị mere ị naghị agba Ista?
Nkeji 20: “Akwụkwọ Ịkpọ Òkù A Ga-ekesa n’Ụwa Niile Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs!” Ajụjụ na azịza. Tupu unu atụlewe paragraf nke 2, hụ na e nyere onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe otu akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ ma ọ bụrụ na ọgbakọ unu enwetala ya. Kọwazie otú a ga-esi jiri ihe osise na amaokwu Baịbụl dị na ya dọta mmasị mmadụ. Unu tụlechaa paragraf nke 2, gwa onye nkwusa ka o mee ihe ngosi otú e nwere ike isi jiri akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ kpọọ mmadụ òkù. Gbaa onye nlekọta ije ozi ma ọ bụkwanụ okenye ọzọ ajụjụ ọnụ ka ọ kọwakwuo ndokwa ndị e mere maka otú a ga-esi akpọsa Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ókèala unu.
Abụ nke 114