Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme Iji Kpọọ Ndị Mmadụ Òkù Ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs!
1. Gịnị ka ndị nkwusa Alaeze ga-eme n’ụwa niile malite na March 21, 2009, ọ bụkwa maka gịnị?
1 Na Thursday, April 9, 2009, ndị na-efe Jehova Chineke n’ụwa niile ga-ezukọ iji cheta otú kachanụ Jehova si gosi ụmụ mmadụ na ya hụrụ ha n’anya. (Rom 5:6-8) Anyị na-atụsi anya ike na ọtụtụ nde mmadụ ndị nwere mmasị ga-abịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Malite na March 21, a ga-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche maka Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ụwa niile.
2. Olee ihe ndị i kwesịrị iburu n’uche mgbe ị na-enye mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ?
2 Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche: Kọwaara ndị mmadụ ihe osise dị n’akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ nke ọma, jụọ ha ajụjụ ndị dị na ya, gụọkwa amaokwu Baịbụl ndị dị na ya. Dị ka ihe atụ, i nwere ike igosi mmadụ ihe e sere n’ihu akwụkwọ ahụ ma kwuo, sị: “Achọrọ m ka ị bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs na Thursday, April 9, 2009.” Gụziere ya isiokwu nke akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ na ajụjụ ndị dị n’okpuru ya. Gwa onye ahụ na o nwere ike ịkpọ ndị ezinụlọ ya na ndị ọzọ ọ chọrọ ka ha soro ya bịa.
3. Olee ihe ọzọ i nwere ike ime mgbe i nyechara ndị mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù?
3 Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere ókèala buru ibu, ndị okenye nwere ike ịgwa unu ka unu fanye akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’ọnụ ụzọ ndị na-anọghị n’ụlọ. Ná ngwụsị izu, nyefekọta magazin na akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ. Hụ na ị kpọrọ ndị ị na-agara nletaghachi, ndị ị na-amụrụ Baịbụl, ndị ikwu gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị ọrụ ibe gị, ndị agbata obi gị, na ndị ọzọ ị maara. N’afọ gara aga, otu nwanna nwaanyị kpọrọ ndị ikwu ya iri atọ ka ha bịa, na-agakwa site n’oge ruo n’oge echetara ha mkpa ọ dị ịbịa. Obi dị ya nnọọ ụtọ na iri abụọ na ise n’ime ha bịara, anọ n’ime ha ekwetakwa ka e duziwere ha ọmụmụ Baịbụl!
4. Gịnị ka anyị kwesịrị ịhazi oge maka ya ugbu a, n’ihi gịnịkwa?
4 Malite Ugbu A Haziwe Oge Gị: Ọtụtụ ndị nkwusa nwere ike iwepụtakwu oge jee ozi ọma n’ọnwa March na April. Ọ bụrụ na i nwere ụmụ ma ọ bụ ndị ị na-eduziri ọmụmụ Baịbụl na-eme nke ọma, nke a nwere ike ịbụrụ ha ohere magburu onwe ya ịghọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. Anyị kwesịrị ịmalite ugbu a mewe ndokwa iso kpọọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa soro anyị cheta otú kachanụ Jehova na Jizọs si gosi na ha hụrụ anyị n’anya.—Jọn 3:16; 15:13.