Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na February 16
IZU NA-AMALITE NA FEBRUARY 16
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 29-31
Nke 1: Jenesis 29:1-20
Nke 2: Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji ‘Kwụsị Ichegbu Onwe Anyị’ (Mat. 6:25)
Nke 3: Nrubeisi Na-echebe Gị (lr isi nke 7)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 172
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa February.
Nkeji 15: ‘Na-eme Ihe Niile n’Ihi Ozi Ọma.’ Ajụjụ na azịza.
Nkeji 15: Ì Nwere Ike Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka n’Oge Ncheta Ọnwụ Jizọs? Okwu onye nlekọta ije ozi ga-eji ịnụ ọkụ n’obi kwuo. Kwuo ihe ndị na-eme ka mmadụ ruo eruo ịbụ ọsụ ụzọ inyeaka. Kwuo ọṅụ na ngọzi ndị ọsụ ụzọ inyeaka na-enweta. Kwuo ndokwa ndị ọgbakọ unu mere maka ijekwu ozi ọma n’ọnwa March, April, na May. Gbaa ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’afọ gara aga ajụjụ ọnụ. Olee otú ha si hazigharịa ihe ndị ha na-eme iji nwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka? Olee ngọzi ndị ha nwetara? Gbaa ezinụlọ ọ bụla ume ka ha lee ma otu onye n’ime ha ma ọ bụ karịa ò nwere ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’oge a a ga-echeta ọnwụ Jizọs.
Abụ nke 151