Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 15
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 15
Abụ nke 144
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl:Ndị Ikpe 15-18
Na 1: Ndị Ikpe 16:1-12
Na 2: Mmadụ Ò Kwesịrị Ịchọ Ịzọpụta Ndụ Ya n’Agbanyeghị Ihe Ọ Ga-ewe? (td 38B)
Na 3: Ihe Mere Jizọs Ji Kpọọ Ekwensu “Nna Ụgha” (Jọn 8:44)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 45
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 15: Jikere Inyefe Ụlọ Nche na Teta! Jiri nkeji ole na ole kwuo ihe ndị dị na magazin ndị ahụ, kwuokwa isiokwu ndị nwere ike ịmasị ndị bi n’ókèala unu. Gwa otu onye nkwusa ka o mee ihe ngosi ebe ọ na-ekwupụta ihe ọ na-eche n’obi ya ka ọ na-akwadebe otú ọ ga-esi enyefe magazin ndị ahụ. Ọ ga-ekwu isiokwu ndị o chere ga-akacha amasị ndị bi n’ókèala unu, chepụtakwa ajụjụ ọ ga-ajụ onye nwe ụlọ ma họrọ amaokwu Baịbụl ọ ga-agụ. Ọ ga-ekwuzi otú ọ ga-esi enyefe magazin nke ọ bụla.
Nkeji 15: ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M.’ Ajụjụ na azịza. Unu tụlechaa ya, jiri ihe e dere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 70, chetara ọgbakọ otú e kwesịrị isi na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe.
Abụ nke 224