Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite na February 11
Abụ nke 168
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa February. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche February 1 na Teta! January-March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro nke mbụ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi.
Nkeji 15: Ì Nwere Ike Ije Ozi n’Ebe E Nwere Mkpa Ka Ukwuu? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke July 15, 2003, peeji nke 20. Kwuokwa ihe e dere n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 111, paragraf nke 1, ruo na peeji nke 112, paragraf nke 1. Jiri nkeji ole na ole gbaa ndị kwagarala n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu ajụjụ ọnụ ma ọ bụrụ na unu nwere ndị dị otú ahụ. Olee nsogbu ndị ha nwere, oleekwa otú ha si merie ha? Olee ngọzi ndị ha nwetara?
Nkeji 20: Nyere Ndị Ọhụrụ Aka Inwe Ọganihu Dị Ka Ndị Ozi. Mgbe i kwusịrị okwu mmeghe nke na-erughị otu nkeji, jiri ajụjụ ndị dị n’Ụlọ Nche nke December 1, 2005, peeji nke 31, tụlee isiokwu a dị ka ajụjụ na azịza. Mgbe a zasịrị ajụjụ paragraf nke 18, mee ihe ngosi nke ebe onye nwe ụlọ jụrụ onye nkwusa ọhụrụ nke ya na onye nke nwere ahụmahụ na-arụ ajụjụ siiri ya ike. Ihe onye nkwusa ọhụrụ ahụ zara ejughị onye nwe ụlọ afọ, onye ahụ nwe ụlọ asịkwa ha lawa. Mgbe ha si n’ụlọ ahụ pụọ, onye nkwusa ahụ nwere ahụmahụ jara nnọọ onye nke ọhụrụ ahụ mma maka mgbalị ya ma gosizie ya otú o nwere ike isi jiri akwụkwọ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible zaghachi onye ahụ pụrụ ịbụ onye nkwụsị nkwurịta okwu n’oge ọzọ.
Abụ nke 50
Izu Na-amalite na February 18
Abụ nke 17
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 25: “Ihe Na-egosi na Anyị Nwere Okwukwe!”a Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Mechie site n’ịtụle ihe na-agba ume ọgbakọ unu rụzuru n’afọ ije ozi gara aga.
Abụ nke 194
Izu Na-amalite na February 25
Abụ nke 81
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa February. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi jiri akwụkwọ ịkpọ òkù Ncheta Ọnwụ Jizọs kpọọ onye ikwu ma ọ bụ onye agbata obi òkù.
Nkeji 20: “Iji Obi Ụtọ Echeta Ihe Mgbapụta Ahụ.”b Dabere n’oge e nwere, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu banyere amaokwu Baịbụl ndị a kpọtụrụ uche na ha.
Nkeji 15: Jikere Inyefe Magazin Ndị Ọhụrụ. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Mgbe i jisiri nkeji ole na ole kọwaa isi ihe ndị dị n’Ụlọ Nche nke March 1 na Teta! nke January-March, jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ndị nwere ike ịmasị ndị bi n’ókèala unu na ihe mere ha ji chee otú ahụ. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo kpọmkwem isi ihe ụfọdụ dị n’isiokwu ndị ahụ ha chọrọ iji enyefe magazin ndị ahụ. Olee ajụjụ e nwere ike iji malite nkwurịta okwu? Olee amaokwu Baịbụl dị na isiokwu ahụ bụ́ nke e nweziri ike ịgụ? Jiri aro ndị ahụ mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee Ụlọ Nche nke March 1 na Teta! nke January-March.
Abụ nke 119
Izu Na-amalite na March 3
Abụ nke 223
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee isi ihe ndị dị n’igbe bụ́ “Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs.”
Nkeji 20: Ị̀ Ga-enwe Ike Ịmalitere Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl na March? Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. N’ọnwa March, anyị ga-enyefe akwụkwọ Bible Na-akụzi, na-ebu n’obi ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Tụlee ihe ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ dị n’akwụkwọ ahụ. Kwuo otú e nwere ike isi nyefee ya mgbe anyị gara nletaghachi na nke onye gosiri mmasị mgbe anyị nyere ya akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs, mgbe anyị gaghachiri na nke onye anyị nyere magazin, na mgbe anyị na-enyefe ya n’ozi ụlọ n’ụlọ mgbe March 22 gasịrị. (Lee km-IB 8/07 p. 3; km-IB 3/06 p. 1, para. 3; km-IB 3/06 p. 3-6.) Mee ka e mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke otú a pụrụ isi nyefee ya.
Nkeji 15: Jiri Baịbụl Na-aza Ajụjụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke dabeere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 143-144. Mee ihe ngosi nke ebe a jụrụ onye nkwusa ajụjụ a na-ajụkarị n’ókèala unu, ya ejirikwa Baịbụl zaa ya.
Abụ nke 145
[Ihe odide ala ala peeji]
a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.