Otú Anyị Ga-esi Kelee Chineke Maka Onyinye Kachanụ O Nyere Anyị
1. Gịnị mere anyị ji ekele Jehova mgbe niile?
1 Àjà mgbapụta Jizọs, onye Chineke hụrụ n’anya, bụ onyinye kachanụ ‘n’ezi onyinye’ niile Jehova nyere anyị. (Jems 1:17) Àjà ahụ mere ka anyị nwee ike inweta ọtụtụ ngọzi, ma mgbaghara mmehie. (Efe. 1:7) N’ihi ya, anyị na-ekele Chineke mgbe niile. N’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị na-aka echebara onyinye a pụrụ iche Chineke nyere anyị echiche.
2. Gịnị ka anyị na ndị ezinụlọ anyị ga-eme iji kelekwuo Jehova maka ihe mgbapụta ahụ?
2 Ihe Ga-enyere Ezinụlọ Unu Aka Ikelekwu Chineke: Iji nyere ndị ezinụlọ unu aka ikelekwu Jehova maka àjà ahụ, ì cheghị na ọ ga-adị mma ma unu jiri oge mgbede unu ji enwe Ofufe Ezinụlọ lebaghachi anya n’ihe ndị e kwuru banyere ihe mgbapụta ahụ? Unu nwere ike mee ya n’izu ndị ga-ebu ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs ụzọ, bụ́ nke a ga-eme n’abalị iri atọ nke ọnwa Mach. Ihe ọzọkwa unu nwere ike ime bụ ịgụ ọgụgụ Baịbụl pụrụ iche maka Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa ụbọchị. Onye ọ bụla n’ime unu kwesịrị iche echiche otú ihe mgbapụta ahụ sirila baara ya uru nakwa otú o sirila mee ka ọ na-ele ma Jehova, ma onwe ya, ma ndị ọzọ, ma ọdịnihu anya. Ọ ga-abakwara unu uru ma unu mụọ abụ ndị a ga-abụ n’ụbọchị ahụ a ga-echeta ọnwụ Jizọs.—Ọma 77:12.
3. Olee otú anyị ga-esi kelee Chineke maka ihe mgbapụta ahụ?
3 Ikwupụta Ekele Anyị: Otú anyị si jiri ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe ga-eme ka anyị kọọrọ ndị ọzọ gbasara Jehova na otú o si hụ anyị nnọọ n’anya nke na o zitere Ọkpara ya n’ụwa. (Ọma 145:2-7) Ụfọdụ ezinụlọ na-ahọpụta, ma ọ dịghị ihe ọzọ, otu onye n’ezinụlọ ha ka ọ sụọ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach, Eprel, na Mee, iji gosi na ha ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na unu agaghị emeli ya, gbalịanụ ‘zụtara onwe unu oge’ unu ga-eji gakwuo ozi ọma. (Efe. 5:16) Otú ọzọ anyị ga-esi kelee Chineke maka ihe mgbapụta ahụ bụ inyere ndị ọzọ aka ka ha soro anyị bịa cheta ọnwụ Jizọs. (Mkpu. 22:17) Bido ugbu a detuwe aha ndị ị ga-akpọ ka ha bịa, ma ndị ị na-agara nletaghachi, ndị ị na-eduziri ọmụmụ Baịbụl, ndị ikwu gị, ndị ọrụ ibe gị ma ndị agbata obi gị. Wepụtakwa ezigbo oge soro mee mkpọsa pụrụ iche, nke bụ́ ikesa akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs.
4. Olee otú anyị ga-esi jiri oge Ncheta Ọnwụ Jizọs mee ihe bara uru?
4 Oge Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ oge pụrụ iche anyị ji egosi Jehova otú anyị jiruru onyinye ahụ o nyere ụmụ mmadụ kpọrọ ihe. Ka anyị jiri oge ahụ kelekwuo Chineke maka ihe mgbapụta ahụ, gwakwa ndị ọzọ gbasara ya na ‘akụ̀ niile nke Kraịst nke a na-apụghị ịghọta aghọta.’—Efe. 3:8.