Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 8
IZU NA-AMALITE NA MACH 8
Abụ nke 91
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl:1 Samuel 1-4
Na 1: 1 Samuel 2:18-29
Na 2: Gịnị Bụ Chọọchị Ndị Kraịst? (td 8A)
Na 3: Akwụkwọ Nsọ Gosiri na Jehova Hụrụ Ụmụaka n’Anya
□ Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 105
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Ị̀ Na-ekwusi Okwu Ike Ka Ndị Ị Na-ezi Ozi Ọma Nụ Ihe Ị Na-ekwu? Okwu ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, malite na peeji nke 109, paragraf nke 2 ruo na peeji nke 110, paragraf nke 2.
Nkeji 20: “Otú Anyị Ga-esi Kelee Chineke Maka Onyinye Kachanụ O Nyere Anyị.” Ajụjụ na azịza. Unu tụlechaa paragraf nke 3, kwuo ndokwa ọgbakọ unu mere gbasara ikesa akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche maka icheta ọnwụ Jizọs. Gwa onye ọsụ ụzọ inyeaka ka o mee ihe ngosi otú ọ ga-esi jiri akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ kpọọ mmadụ òkù. Ya mechaa ihe ngosi ahụ, jụọ ya otú o si hazie ihe ndị ọ na-eme n’ụbọchị iji nwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka nakwa uru o riterela.
Abụ nke 87