IHE ỌMỤMỤ NKE 8
Ụda Olu Kwesịrị Ekwesị
Ọ BỤRỤ na ụda olu nke onye ọkà okwu ihu ọha adịghị adasi ike otú a chọrọ, ụra nwere ike ịmalite ịtụ ụfọdụ n’ime ndị na-ege ntị. Ọ bụrụ na onye nkwusa na-ekwu okwu n’olu dịbigara nro ókè n’ozi ubi, o yikarịrị ka ọ gaghị eme ka onye nwe ụlọ nọgide na-enwe mmasị n’ihe ọ na-ekwu. Ná nzukọ kwa, ebe ndị na-ege ntị na-adịghị eji ụda olu kwesịrị ekwesị aza ajụjụ, ndị bịaranụ agaghị enweta agbamume dị mkpa. (Hib. 10:24, 25) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ọkà okwu ewelie olu ya n’oge na-ekwesịghị ekwesị, ndị na-ege ntị nwere ike ịmalite inwe ahụ́ erughị ala—ọbụna wee iwe.—Ilu 27:14.
Chebara Ndị Na-ege Gị Ntị Echiche. Ole ndị ka ị na-agwa okwu? ọ̀ bụ otu onye? ọ̀ bụ ezinụlọ? ọ̀ bụ ntakịrị ìgwè mmadụ zukọrọ maka nzukọ ije ozi ubi? ọ̀ bụ ọgbakọ dum? ka ọ̀ bụ mgbakọ buru ibu? O doro anya na ụda olu kwesịrị ekwesị n’otu ọnọdụ nwere ike ọ gaghị ekwesị ekwesị n’ọnọdụ ọzọ.
N’oge dịgasị iche iche, ndị ohu Chineke agwawo ìgwè mmadụ ndị buru ibu okwu. Mgbe a raara ụlọ nsọ dị na Jeruselem nye n’oge Solomọn, e nweghị ígwè okwu. Ya mere Solomọn guzoro n’ikpo okwu e wuliri elu wee “were oké olu” gọzie ìgwè mmadụ ahụ. (1 Eze 8:55; 2 Ihe 6:13) Ọtụtụ narị afọ mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe a wụpụsịrị mmụọ nsọ na Pentikọst 33 O.A., oké ìgwè mmadụ—ụfọdụ ndị nwere mmasị, ndị ọzọ na-akwa emo—gbakọrọ gburugburu obere ìgwè Ndị Kraịst ahụ nọ na Jeruselem. N’iji ezi amamihe mee ihe, Pita “biliri ọtọ . . . o welikwara olu ya.” (Ọrụ 2:14) A gbara àmà dị ike.
Olee otú ị ga-esi mara ma ụda olu i ji ekwu okwu n’otu ọnọdụ ò kwesịrị ekwesị? Mmeghachi omume nke ndị na-ege ntị bụ otu n’ime ụzọ kasị mma isi chọpụta. Ọ bụrụ na ị chọpụta na ụfọdụ ndị so na-ege ntị na-adọgbu onwe ha iji nụ ihe ị na-ekwu, i kwesịrị ịgbalị ịgbanwe ụda olu gị.
Ma ànyị na-agwa otu onye okwu ma ọ̀ bụ ìgwè mmadụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya iche echiche banyere ndị so na-ege ntị. Ọ bụrụ na e nwere onye na-adịghị anụ ihe nke ọma, ọ pụrụ ịdị mkpa iwelite olu gị. Ma iti mkpu agaghị eme ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ebe ị nọ, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha adịchaghị emeghachi omume n’ụzọ dị gara gara n’ihi ime agadi. A pụrụ ọbụna iwere ya dị ka ihe àmà na-egosi enweghị nsọpụrụ. N’ebe ụfọdụ, a na-ewere iwelibiga olu ókè dị ka ihe àmà na-egosi na iwe ji mmadụ ma ọ bụ na o nweghị ndidi.
Chebara Mkpọtụ Ndị Na-adọpụ Uche Echiche. Mgbe ị nọ n’ozi ubi, ọnọdụ ndị ị na-ezute na-enwe mmetụta n’ezie n’ụda olu a chọrọ iji gbaa àmà. Ọ pụrụ ịbụ na ị ghaghị ịgba mgba megide mkpọtụ ụgbọala, ụmụaka na-akpa aghara, nkịta na-agbọ ụja, egwú na-adasi ike, ma ọ bụ telivishọn na-adachi ntị. N’aka nke ọzọ, n’ógbè ebe ụlọ dịdewere nnọọ ibe ha, ọ pụrụ imenye onye nwe ụlọ ihere ma ọ bụrụ na i kwuo okwu n’olu dara ụda nke na ị na-adọta mmasị ndị agbata obi ya.
Ụmụnna ndị na-ekwu okwu n’ọgbakọ ma ọ bụ ná mgbakọ dị iche iche aghaghịkwa ịnagide ọnọdụ dịgasị nnọọ iche iche. Ịgwa ndị na-ege ntị okwu n’èzí dị nnọọ iche n’ikwu okwu n’ime ụlọ nzukọ ebe a na-anụ ụda okwu nke ọma. Na Latin America, ndị ozi ala ọzọ abụọ kwuru okwu ihu ọha n’ogige nke otu onye nwere mmasị ka a nọ na-eme ememe oké mkpọtụ n’otu ámá obodo dị nso n’ebe ahụ, oké ọkpa nọkwa na-akwa n’akwụsighị akwụsị n’ebe dị nso!
Ka okwu nọ na-aga n’ihu, otu ihe pụrụ ime nke ga-achọ ka a kwụsịtụ ruo mgbe mkpọtụ ahụ dajụrụ ma ọ bụ ka e welitekwuo olu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a na-enwe nzukọ n’ụlọ nke e ji gbamgbam kụọ elu ya, oké mmiri ozuzo nke malitere na mberede nwere ike ime ka ọ fọ nke nta ka ndị na-ege ntị ghara ịnụ ihe ọkà okwu na-ekwu. Nwatakịrị nke na-ebe ákwá ma ọ bụ mkpọtụ nke ndị bịara n’azụ oge na-eme ga-abụrịrị ihe ịma aka. Mụta ime ihe iji merie ihe ndọpụ uche ndị ahụ ka ndị na-ege gị ntị wee nwee ike irite uru zuru ezu n’ihe ọmụma ị na-eche n’ihu ha.
Ígwè ọrụ nke na-eme ka ụda na-adasikwu ike ga-enye aka ma ọ bụrụ na e nwere ya, ma ọ dịghị akagbu mkpa ọ dị ka ọkà okwu welie olu ya mgbe ọnọdụ mere ka ọ dị mkpa. N’ebe ụfọdụ, ebe a na-ewekarị ọkụ, ndị ọkà okwu aghaghị ịga n’ihu n’okwu ha n’ejighị ígwè okwu.
Chebara Ihe Ọmụma Ị Na-atụle Echiche. Ụdị ihe ọmụma dị n’okwu gị na-enwekwa mmetụta n’ụda olu a ga-achọ. Ọ bụrụ na isiokwu ahụ chọrọ itinye ume, ebelatala ikike okwu ahụ site n’ikwu okwu n’olu dịbigara nro ókè. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-agụpụta ikpe ọmụma sitere n’Akwụkwọ Nsọ, ụda olu gị kwesịrị ịdị ike karịa mgbe ị na-agụpụta ndụmọdụ maka igosi ịhụnanya. Mee ka ụda olu gị kwekọọ n’ihe omume gị, ma lezie anya iji hụ na i mere ya n’ụzọ na-agaghị adọta mmasị n’ebe ị nọ.
Tụlee Ebumnobi Gị. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịkpali ndị na-ege gị ntị ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi mee ihe, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i jiri olu sitụrụ ike kwuo okwu. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgbanwe otú ha si eche echiche, ejila olu dị oké elu chụọ ha. Ọ bụrụ na ị na-agbalị ịkasi mmadụ obi, olu dị nro karị na-akakarị mma.
Iji Ụda Olu Dị Elu Ekwu Okwu n’Ụzọ Dị Irè. Mgbe ị na-anwa ịdọta mmasị nke onye ji ọrụ n’aka, olu dịtụ elu na-enyekarị aka. Ndị mụrụ ụmụ maara nke a, ya mere ha na-eweli olu ha kpọọ ụmụ ha ma oge ruo ka ha hapụ egwuregwu ma bata n’ụlọ. Ọ pụkwara ịdị mkpa iweli olu mgbe onyeisi oche na-achọ ka ọgbakọ ma ọ bụ ndị bịara mgbakọ nọrọ jụụ. Ka ndị nkwusa na-ekere òkè n’ozi ubi, ha nwere ike iweli olu kelee ekele ka ha na-agakwuru ndị nọ n’èzí na-arụ ọrụ.
Ọbụna mgbe ị dọtasịrị mmasị mmadụ, ọ dị mkpa ka ị nọgide na-ekwu okwu n’ụda olu kwesịrị ekwesị. Ụda olu dị nnọọ ala pụrụ ime ka e chee na ọkà okwu ahụ akwadoghị nke ọma ma ọ bụ na o kwenyeghị n’ihe ọ na-ekwu.
Mgbe e jikọtara ya na inye iwu, iweli olu elu pụrụ ịkwali ndị mmadụ ime ihe. (Ọrụ 14:9, 10) N’ụzọ yiri nke ahụ, iwu e ji iti mkpu nye pụrụ igbochi ọdachi. Na Filipaị, ọ fọrọ nke nta ka onye na-elekọta ụlọ nga gbuo onwe ya n’ihi na o chere na ndị mkpọrọ ya agbapụla. “Pọl tiri mkpu n’oké olu, na-asị, ‘Emerụla onwe gị ahụ́, n’ihi na anyị nile nọ n’ebe a!’” E si otú a gbochie mmadụ igbu onwe ya. Mgbe ahụ Pọl na Saịlas gbaara onye ahụ na-elekọta ụlọ nga na ezinụlọ ya àmà, ha nile nakwekwaara eziokwu ahụ.—Ọrụ 16:27-33.
Ụzọ Isi Mee ka Ụda Olu Gị Ka Mma. Nye ụfọdụ ndị, a chọrọ mgbalị pụrụ iche n’aka ha iji mụta otú ha ga-esi jiri ụda olu kwesịrị ekwesị na-eme ihe. Mmadụ pụrụ iji ụda olu na-ekwesịghị ekwesị na-ekwu okwu n’ihi na o nwere olu dị nro. Otú ọ dị, ọ bụrụ na o tinye mgbalị, ọ pụrụ imeziwanye ya, ọ bụ ezie na ọ ka nwekwara ike na-ekwu okwu n’olu dị ala. Chebara iku ume gị na otú i si anọ echiche. Mee ka ọ mara gị ahụ́ ịdị na-anọdụ ala ma na-eguzo ọtọ n’ụzo kwụ kwem. Na-ewela ubu gị azụ, na-ekurukwa ume ala. Jide n’aka na ị na-ekute ume n’ụzọ ga-eme ka ikuku jupụta n’akụkụ ala ala nke akpa ume gị. Ọ bụ ikuku a i kuuru, ma a chịkwaa ya nke ọma, na-eme ka o kwe gị omume ịchịkwa ụda olu gị mgbe ị na-ekwu okwu.
Nye ndị ọzọ, ihe bụ́ nsogbu bụ na ha na-ekwu okwu n’olu na-ada oké ụda. Ikekwe ha zụlitere àgwà ahụ n’ihi ịdị na-arụ ọrụ n’èzí ma ọ bụ na gburugburu ebe mkpọtụ dị. N’aka nke ọzọ, ọ pụrụ ịbụ na a zụlitere ha n’ebe onye ọ bụla na-adị na-eti mkpu na ebe a na-anapụkarị onye na-ekwu okwu okwu n’ọnụ. N’ihi ya, ha na-eche na ikwu okwu n’olu dara ụda karịa ndị ọzọ bụ nanị ụzọ isi kere òkè n’ihe a na-ekwu. Ka ha ji nwayọọ nwayọọ na-anakwere ndụmọdụ Bible bụ́ iyikwasị onwe ha “mmetụta dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi,” ha ga-agbanwe ụda olu ha na-eji eme ihe mgbe ha na ndị ọzọ na-akparịta ụka.—Kọl. 3:12.
Ime ezi nkwadebe, ahụmahụ nke na-abịa site n’ikerechi òkè anya n’ozi ubi, na ikpegara Jehova ekpere ga-enyere gị aka ikwu okwu n’ụda olu kwesịrị ekwesị. Ma ị̀ nọ n’elu ikpo okwu na-ekwu okwu ma ị̀ na-agwa otu onye okwu n’ozi ubi, gbalịa ime ka echiche gị dịgide n’otú a pụrụ isi nyere onye ị na-agwa okwu aka site na ya ịnụ ihe ị na-ekwu.—Ilu 18:21.