IHE ỌMỤMỤ NKE 13
Ile Ndị Ị Na-agwa Okwu Anya
ANYA anyị na-egosi àgwà na mmetụta uche anyị. Ha pụrụ igosi ihe ijuanya ma ọ bụ ụjọ. Ha pụrụ igosi ọmịiko ma ọ bụ ịhụnanya. Mgbe ụfọdụ, ha pụrụ igosi inwe obi abụọ ma ọ bụ nye ihe àmà nke mwute. Banyere ndị obodo ya, ndị taworo ahụhụ dị ukwuu, otu agadi nwoke kwuru, sị: “Anyị na-eji anya anyị ekwu okwu.”
Ndị ọzọ pụrụ iru nkwubi okwu banyere anyị na ihe anyị na-ekwu dabere n’ebe anyị na-ele anya. N’ọtụtụ ọdịnala, ndị mmadụ na-enwekarị ntụkwasị obi n’ebe ndị na-ele ha anya n’anya n’ụzọ enyi nọ. N’aka nke ọzọ, ha pụrụ inwe obi abụọ banyere ezi obi ma ọ bụ iru eru nke onye na-ele anya n’ụkwụ ya ma ọ bụ na-ele ihe ọzọ anya kama ịdị na-ele onye ọ na-agwa okwu anya. Ọdịnala ndị ọzọ na-ewere ilegide mmadụ anya n’anya dị ka enweghị nsọpụrụ, iwe, ma ọ bụ ịma aka. Nke a bụ eziokwu karịsịa mgbe gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị ma ọ bụ onyeisi ma ọ bụ onye ọzọ chiri echichi na-ekwu okwu. N’ebe ụfọdụkwa, ọ bụrụ na onye mmadụ tọrọ ana-ele onye tọrọ ya anya n’anya mgbe ọ na-agwa ya okwu, a ga-ewere nke a dị ka enweghị nkwanye ùgwù.
Otú ọ dị, n’ebe ọ na-adịghị eweta mkpasu iwe, ile mmadụ anya n’anya mgbe a na-ekwu ihe dị mkpa pụrụ imesikwu ihe a na-ekwu ike. A pụrụ iwere ya dị ka ihe àmà nke nkwenyesi ike n’akụkụ nke onye na-ekwu okwu. Rịba ama ihe Jizọs mere mgbe ndị na-eso ụzọ ya gosipụtara oké ihe ijuanya wee kwuo, sị: “Ònyezi ka a pụrụ ịzọpụta?” Bible na-akọ, sị: “Ka o lere ha anya n’ihu, Jizọs sịrị ha: ‘Nke a agaghị ekwe omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ma n’ebe Chineke nọ ihe nile kwere omume.’” (Mat. 19:25, 26) Akwụkwọ Nsọ na-egosikwa na Pọl onyeozi rịbara mmeghachi omume nke ndị so ná ndị ọ na-agwa okwu ama nke ọma. N’otu oge, otu nwoke nke dara ngwụrọ site n’ọmụmụ nọ mgbe Pọl kwuru okwu. Ọrụ 14:9, 10 na-ekwu, sị: “Nwoke a nọ na-ege Pọl ntị ka ọ na-ekwu okwu, bụ́ onye, ka ọ na-elegide ya anya ma hụ na o nwere okwukwe ịbụ onye a ga-eme ka ahụ́ dị mma, kwuru n’olu dara ụda, sị: ‘Guzo kwem n’ụkwụ gị.’”
Aro Dị Iche Iche Maka Ozi Ubi. Mgbe ị na-ekere òkè n’ozi ubi, nwee omume enyi mgbe ị na-agakwuru ndị mmadụ. N’ebe o kwesịrị ekwesị, jiri ajụjụ ndị na-akpali iche echiche malite mkparịta ụka n’ihe pụrụ ịmasị unu abụọ. Ka ị na-eme nke a, gbalịa ịdị na-ele onye ahụ anya n’anya—ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ na-ele onye ahụ anya n’ihu n’ụzọ nkwanye ùgwù na n’ụzọ obiọma. Mmụmụ ọnụ ọchị obiọma nke onye anya ya na-egosipụta ọṅụ nke dị ya n’obi bụ ihe na-adọrọ adọrọ. Ọdịdị ihu dị otú ahụ pụrụ ịgwa onye ahụ ihe dị ukwuu banyere ụdị onye ị bụ ma nyere ya aka inwekwu ahụ́ iru ala ka unu na-akparịta ụka.
Ịhụ otú anya onye ahụ dị, n’ebe o kwesịrị ekwesị, pụrụ igosi gị ihe ị ga-eme banyere otu ọnọdụ. Ọ bụrụ na iwe ji onye ahụ ma ọ bụ ọ bụrụ na o nwechaghị mmasị n’ezie, i nwere ike ịmata. Ọ bụrụ na ọ dịghị aghọta ihe ị na-ekwu, i nwere ike ịchọpụta ya. Ọ bụrụ na o nwekwaghị ndidi, ọtụtụ mgbe ị ga-enwe ike ịchọpụta. Ọ bụrụ na o nwere ezigbo mmasị, nke a kwa ga-apụta ìhè. Otú anya ya dị pụrụ ịgbara gị àmà banyere mkpa ọ dị ka ị gbanwee ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ n’okwu gị, imekwu mgbalị ka ọ na-etinye ọnụ ná mkparịta ụka ahụ, iweta mkparịta ụka ahụ ná njedebe, ma ọ bụ, ikekwe, igosi ya otú e si amụ Bible.
Ma ị̀ na-ekere òkè n’àmà a na-agbara ọha ma ọ bụ na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi, gbalịa ịdị na-ele onye gị na ya na-ekwurịta okwu anya n’anya n’ụzọ nkwanye ùgwù. Otú ọ dị, elegidela ya anya n’ihi na nke ahụ pụrụ imenye mmadụ ihere. (2 Eze 8:11) Ma na-ele onye ahụ anya n’ihu site n’oge ruo n’oge otú ị na-esi ele anya, dị ka enyi. N’ọtụtụ ala, nke a na-eme ka e nwee mmetụta nke inwe ezi mmasị. Otú ọ dị, mgbe ị na-agụ Bible ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ, ị ga-elekwasị anya n’ihe e biri ebi. Ma iji mesie otu isi ihe ike, ị pụrụ ịchọ ile onye ahụ anya kpọmkwem, ọ bụ ezie na ị ga-eme ya ruo nwa mkpirikpi oge. Ọ bụrụ na ị na-eweli isi gị elu site n’oge ruo n’oge, nke a ga-emekwa ka i nwee ike ịhụ mmeghachi omume ya n’ihe ị na-agụ.
Ọ bụrụ na ime ihere emee ka ile mmadụ anya siere gị ike na mbụ, adala mbà. Site n’ịdị na-eme ya mgbe nile, ile mmadụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-amara gị ahụ́, ọ pụkwara ime ka ị dịkwuo irè n’iso ndị ọzọ na-ekwurịta okwu.
Mgbe A Na-ekwu Okwu. Bible na-agwa anyị na tupu Jizọs amalite Ozizi Elu Ugwu ya, ‘o weliri anya ya lee ndị na-eso ụzọ ya.’ (Luk 6:20) Mụta ihe site n’ihe nlereanya ya. Ọ bụrụ na ị na-aga ikwu okwu n’ihu ìgwè mmadụ, lee ha anya ma chere ruo ntabi anya ole na ole tupu ị malite ikwu okwu. N’ọtụtụ ebe nke a ga-agụnye ile ndị ụfọdụ so na-ege ntị anya n’anya. Oge a i gbutụrụ pụrụ inyere gị aka imeri ahụ́ ịma jijiji ị ga-enwe ná mmalite. Ọ ga-enyekwara ndị na-ege ntị aka ikwekọ n’omume ma ọ bụ mmetụta uche ọ bụla ihu gị na-egosi. Ọzọkwa, gị ime nke a ga-enye ndị na-ege ntị ohere ịnọrọ jụụ ma dị njikere ịṅa gị ntị.
Mgbe ị na-ekwu okwu gị, na-ele ndị na-ege ntị anya. Elela ìgwè ahụ anya nanị n’ozuzu ha. Gbalịa ile ndị mmadụ so na ya anya n’otu n’otu. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ebe nile, a na-atụ anya na onye na-ekwu okwu n’ihu ọha ga na-eletụ ndị mmadụ anya n’anya.
Ile ndị na-ege gị ntị anya gụnyere ihe karịri nanị ilegharị anya site n’otu akụkụ gaa n’ọzọ. Lee otu onye so ná ndị na-ege gị ntị anya n’ụzọ nkwanye ùgwù, ọ bụrụkwa na o kwesịrị ekwesị, gwa onye ahụ otu ahịrịokwu zuru ezu. Mgbe ahụ lee onye ọzọ anya, gwakwa onye ahụ otu ahịrịokwu ma ọ bụ abụọ. Elela onye ọ bụla anya ruo ogologo oge nke na ahụ́ agakwaghị eru ya ala, ya abụkwala nanị mmadụ ole na ole nanị ka ị na-ele anya ná ndị ahụ nile na-ege ntị. Nọgide na-ele ndị na-ege gị ntị anya otú a, ma ka ị na-agwa otu onye okwu, gwa onye ahụ okwu n’ezie ma hụ mmeghachi omume ya tupu ị gafere n’onye ọzọ.
I kwesịrị ịtụkwasị ihe ndị i deturu n’elu tebụl ikpo okwu, ijide ya n’aka gị, ma ọ bụ tinye ya n’ime Bible gị ka i wee nwee ike ile ha anya nanị site n’imegharị anya. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ihulata isi iji hụ ihe ndị i deturu, ị ga-akwụsị ile ndị na-ege ntị anya. E kwesịrị ichebara ma ugboro ole ị na-ele anya n’ihe ndị i deturu ma mgbe ị na-eji ele ha anya echiche. Ọ bụru na ị na-ele anya n’ihe ndị i deturu mgbe ị na-ewepụta isi ihe kasị mkpa n’okwu ahụ, ọ bụghị nanị na ị gaghị ahụ mmeghachi omume nke ndị na-ege gị ntị, kama ịdị ike nke okwu gị ga-ebelata. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị na-ele anya mgbe nile n’ihe ndị i deturu, ị gaghị na-ele ndị na-ege ntị anya.
Ọ bụrụ na ị tụọrọ mmadụ bọl, ị na-ele anya iji hụ ma ọ ghọtara ya. Echiche ọ bụla dị n’okwu gị bụ “bọl” dị iche ị tụụrụ ndị na-ege ntị. Mmeghachi omume ha—ikwe n’isi, ịmụmụ ọnụ ọchị, na ilegide gị anya, pụrụ igosi na ha “ghọtara” ya. Ọ bụrụ na ị nọgide na-ele ndị ị na-agwa okwu anya n’ụzọ dị mma, nke a pụrụ inyere gị aka ijide n’aka na ha “na-aghọta” echiche ndị ị na-ewepụta.
Ọ bụrụ na e kenyere gị ịgụpụtara ọgbakọ ihe, ì kwesịrị ịgbalị ile ndị na-ege ntị anya n’oge ị na-agụ ihe ahụ? Ọ bụrụ na ndị na-ege ntị na-esonye n’ọgụgụ Bible gị, ihe ka ọtụtụ n’ime ha agaghị ama ma i leliri anya ma ọ bụ na i lelighị. Ma ile ndị na-ege gị ntị anya pụrụ inye aka mee ka ịgụ ihe gị na-ekpo ọkụ n’ihi na ọ ga-eme ka ị mara mmeghachi omume ha nke ọma. Banyekwara onye ọ bụla, so ná ndị na-ege ntị, bụ́ onye na-ejighị Bible ya eme ihe, onye uche ya pụkwara ịdị na-awagharị, anya ya na anya onye ọkà okwu izute pụrụ ime ka uche ya lọghachi n’ihe a na-agụ. Otú ọ dị, ị ga-enwe ike ileli anya nanị ruo nwa oge, e kwesịghịkwa ime ya n’ụzọ ga-eme ka ị gụhie ihe. Iji mezuo nke ahụ, ọ kasị mma ijide Bible gị n’aka na iweli isi gị elu, ọ bụghị iwedata àgbà gị ala n’ebe obi gị dị.
Mgbe ụfọdụ, a na-akpọ ndị okenye ikwu okwu a na-agụpụta agụpụta ná mgbakọ. Ime nke a n’ụzọ dị irè na-achọ ahụmahụ, iji nlezianya mee nkwadebe, na mmụgharị ihe ugboro ugboro. Otú ọ dị, ikwu okwu a na-agụpụta agụpụta na-ebelata ile ndị na-ege ntị anya. Ma ọ bụrụ na ọkà okwu mere ezigbo nkwadebe, o kwesịrị inwe ike ịdị na-ele ndị na-ege ya ntị anya site n’oge ruo n’oge n’echefughị ebe ọ nọ. Ya ime otú ahụ ga-enye aka mee ka uche nke ndị na-ege ntị dịgide n’ihe a na-ekwu, meekwa ka ha nwee ike irite uru n’ụzọ zuru ezu ná ntụziaka ime mmụọ dị mkpa a na-enye.