Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịdị Na-ele Onye Ị Na-agwa Okwu Anya n’Ihu
1 Mgbe anyị na-ezi ozi ọma n’ebe ọhaneze na-anọkarị nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anya anyị na-agakarị n’ihu ndị anyị chọrọ ịgwa okwu tupu anyị amalite ịgwa ha okwu. Anyị nwere ike iji obere oge a anya anyị gara n’ihu ha chọpụta otú ọbịbịa ahụ anyị bịara dị ha na ọbụna otú obi dị ha. Ha onwe ha kwa pụrụ ịchọpụta ọtụtụ ihe banyere anyị. Otu nwanyị kwuru banyere nleta otu Onyeàmà letara ya, sị: “Ihe m chetara banyere ihu ọchị ya bụ na ahụ́ ruru ya ala. Nke a kpaliri mmasị m.” Nke ahụ mere ka nwanyị ahụ gee ntị n’ozi ọma ahụ.
2 Ịdị na-ele onye ị na-agwa okwu anya n’ihu bụ ụzọ magburu onwe ya isi malite ozi ọma mgbe ị na-agba àmà n’okporo ámá ma ọ bụ mgbe ị na-ezi ozi ọma n’ebe ọhaneze na-anọkarị. Ihe otu nwanna nwoke na-eme bụ ilegide ndị na-abịa n’ihu ya anya. Mgbe anya ya na ha makọrọ, ọ na-amụmụ ọnụ ọchị ma nyefezie ha magazin. O ji otú a eso ọtụtụ mmadụ enwe mkparịta ụka dị ụtọ ma na-enyefe ọtụtụ akwụkwọ anyị.
3 Na-achọpụta Otú Obi Dị Ndị Mmadụ: Ịdị na-ele ndị anyị na-agwa okwu anya n’ihu ga-enyere anyị aka ịchọpụta otú obi dị ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ na-esiri mmadụ ike ịghọta ihe anyị na-ekwu ma ọ bụ na o kweghị n’ihe anyị kwuru, ọtụtụ mgbe, anyị ga-ahụ ya n’ihu ya. Ọ bụrụ na o ji ọrụ n’aka ma ọ bụ na ọ dị ya ka sị kwụsị, anyị ga-achọpụta ya site n’otú ihu dị ya. Anyị nweziri ike ime mgbanwe ụfọdụ ma ọ bụ igbu okwu anyị nkenke. Ịchọpụta otú obi dị ndị anyị na-agwa okwu ma mee ihe banyere ya bụ ụzọ magburu onwe ya isi gosi na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ.
4 Ọ Na-egosi na I Ji Obi Ọcha Ekwu Okwu Ma Na-ekwu Ihe Doro Gị Anya: N’ọtụtụ obodo, a na-ewere mmadụ ile onye ọ na-agwa okwu anya n’ihu dị ka ihe na-egosi na o ji obi ọcha agwa ya okwu. Rịba ama otú Jizọs si zaghachi mgbe ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: “Ònyezi ka a pụrụ ịzọpụta?” Bible na-ekwu, sị: “Ka o lere ha anya n’ihu, Jizọs sịrị ha: ‘Nke a agaghị ekwe omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ma n’ebe Chineke nọ ihe nile kwere omume.’” (Mat. 19:25, 26) Obi abụọ adịghị ya na anya Jizọs gosiri na ihe ọ na-ekwu doro ya anya. Nke a mekwara ka ha kwere n’ihe o kwuru. N’otu aka ahụ, ịdị na-ele ndị anyị na-agwa okwu anya n’ihu ga-enyere anyị aka iji obi ọcha na-ezi ozi ọma Alaeze ahụ, ọ ga-egosikwa na ihe anyị na-ekwu doro anyị anya.—2 Kọr. 2:17; 1 Tesa. 1:5.