Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 9 p. 111-p. 114 para. 3
  • Mgbanwe Ụda Olu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbanwe Ụda Olu
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịgbanwe Ụda Olu
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Ụda Olu Kwesịrị Ekwesị
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ikwu Okwu Otú I Si Ekwu Okwu
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • N’ụzọ Mkparịta Ụka
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 9 p. 111-p. 114 para. 3

IHE ỌMỤMỤ NKE 9

Mgbanwe Ụda Olu

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Na-agbanwe ụda olu gị. N’ihe ọmụmụ a, anyị na-atụle mgbanwe ndị a na-enwe n’otú ụda olu si adasi ike, ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ n’okwu, na ọdịdị ụda olu.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Mgbanwe ụda olu kwesịrị ekwesị na-eme ka okwu na-ekpo ọkụ, na-akpali mmetụta uche, ma na-akwali mmadụ ime ihe.

Agbanweghị ụda olu gị pụrụ ime ka ọ dị ka i nwechaghị mmasị n’isiokwu gị.

GỊ IMESI echiche okwu ike n’ụzọ na-adịghị mgbagwoju anya na-enyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe ị na-ekwu. Ma mgbe i jiri mgbanwe nke otú ụda olu gị si adasi ike, ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ n’okwu, na ọdịdị ụda olu mee ihe n’ụzọ dị mma, okwu gị ga-adị ụtọ ngere karị. Ọzọkwa, ọ pụrụ ime ka ndị na-ege gị ntị mata echiche gị banyere ihe ị na-ekwu. Àgwà gị n’ebe ihe omume gị dị pụrụ inwe mmetụta n’ihe ha na-eche banyere ya. Nke a bụ eziokwu ma ị̀ nọ n’elu ikpo okwu na-ekwu okwu ma ọ bụ otu onye ka ị na-agwa okwu n’ozi ubi.

Ụda olu mmadụ bụ ihe ọrụ dị ebube, nke a pụrụ iji mee ihe n’ụzọ dịgasị nnọọ iche iche. Mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ pụrụ ime ka okwu kpoo ọkụ, na-eru n’obi, na-akpali mmetụta uche, ma na-akwali mmadụ ime ihe. Otú ọ dị, ị pụghị ịrụzu nke a nanị site n’ịkanye akara n’ihe ndị i deturu iji gosi ebe ị ga-ewelikwu ma ọ bụ wedaa ụda olu gị, gbanwee ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ n’okwu gị, ma ọ bụ gbanwee ọdịdị ụda olu gị. Mgbanwe ụda olu e mere n’ihi ihe mgbaàmà ndị dị otú ahụ ga-ada ka ihe na-esiteghị n’obi. Kama ime ka okwu gị kpoo ọkụ ma dị ụtọ, ọ pụrụ ime ka ahụ́ ghara iru ndị na-ege gị ntị ala. Ịgbanwe olu n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-esite n’obi.

Mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ amamihe, mgbanwe ụda olu agaghị adọrọ mmasị na-ekwesịghị ekwesị gaa n’ebe ọkà okwu nọ. Kama nke ahụ, ọ ga-enyere ndị na-ege ntị aka ịghọta isi ihe dị n’isiokwu ahụ a na-atụle.

Na-eweli Ma Na-eweda Olu Gị. Otu ụzọ isi na-agbanwe olu okwu gị bụ iweli olu gị elu na iwetulata ya. Ma nke a ekwesịghị ịbụ nanị iweli olu elu ma ọ bụ iwetulata ya site n’oge ruo n’oge n’otu ụzọ ahụ. Nke ahụ ga-agbanwe echiche dị n’ihe ị na-ekwu. Ọ bụrụ na ị na-eweli olu gị ọtụtụ ugboro gabiga ókè, ọ ga-enye echiche na-adịghị mma.

Ụda olu gị kwesịrị ikwekọ n’ihe omume gị. Ma ị̀ na-agụpụta iwu dị oké mkpa, dị ka nke ahụ dị ná Mkpughe 14:6, 7 ma ọ bụ ná Mkpughe 18:4, ma ọ bụ okwu na-egosi nkwenye siri ike, dị ka nke e dekọrọ n’Ọpụpụ 14:13, 14, ọ dị mma ka e jiri olu e weliri elu otú kwesịrị ekwesị gụọ ha. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị na-agụ nkatọ siri ike site na Bible, dị ka nke ahụ dị na Jeremaịa 25:27-38, iweli ma ọ bụ iweda ụda olu gị ga-eme ka okwu ụfọdụ pụta ìhè karịa ndị ọzọ.

Burukwa n’uche ihe bụ́ ebumnobi gị. Ị̀ chọrọ ịkwali ndị na-ege gị ntị ime ihe? Ị̀ chọrọ ime ka isi ihe ndị dị n’ihe ị na-ekwu pụta ìhè? Olu e welikwuru elu, mgbe e ji akọ mee ya, na-enye aka imezu ebumnobi ndị a. Otú ọ dị, nanị iweli olu gị elu nwere ike ime ka ị ghara imezu nzube gị. N’ụzọ dị aṅaa? Ihe ị na-ekwu pụrụ ịchọ ikpo ọkụ na mmetụta kama ịbụ olu e weliri elu. Anyị ga-atụle nke a n’Ihe Ọmụmụ nke 11.

Mgbe e ji nghọta mee ya, iwetulata olu pụrụ ime ka a tụwa anya ihe. Ma nke ahụ na-achọkarị iwelite ụda olu ozugbo e mesịrị nke ahụ. A pụrụ iji ụda olu dị ala ya na ikpo ọkụ ka ukwuu gosi nchegbu ma ọ bụ ụjọ. A pụkwara iji ụda olu dị ala gosi na ihe a na-ekwu adịghị oké mkpa ma e jiri ya tụnyere ihe ndị gbara ya gburugburu. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ụda olu gị na-adị ala mgbe nile, nke a pụrụ inye echiche bụ́ na i jighị ihe ị na-ekwu n’aka ma ọ bụ na obi esighị gị ike ma ọ bụkwanụ na i nwechaghị mmasị n’isiokwu gị. O doro anya na ọ dị mkpa ịdị na-eji ezi echiche eji ụda olu dị nnọọ ala na-ekwu okwu.

Na-agbanwe Ọ̀tụ̀tụ̀ Ịgba Ọsọ n’Okwu Gị. N’okwu a na-ekwu kwa ụbọchị, okwu na-apụtara onwe ya ka anyị na-ekwupụta echiche anyị. Mgbe a kpaliri mmụọ anyị, anyị na-ekwukarị okwu ọkụ ọkụ. Mgbe anyị chọrọ ka ndị ọzọ cheta kpọmkwem ihe anyị na-ekwu, anyị na-ejikwu nwayọọ nwayọọ na-ekwu okwu.

Otú ọ dị, ọ bụ nanị ndị ọkà okwu ole na ole bụ́ ndị ọhụrụ n’ikwu okwu ihu ọha na-agbanwe ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ n’okwu ha. N’ihi gịnị? Ha na-eji oké nlezianya akwadebe okwu ndị ha ga-eji eme ihe. Ha nwere ike idetu ihe nile edetu. Ọ bụrụgodị na ha ekwughị okwu ahụ dị ka okwu a na-agụ agụ, ọ ga-afọ nke nta ka ha buru mkpụrụ okwu ndị ahụ n’isi. N’ihi ya, a na-ekwu ihe nile n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ hà nhata. Ịmụta iji ihe ndepụta na-ekwu okwu ga-enye aka imeri adịghị ike a.

Zere ikwuwekwu okwu ọsọ ọsọ karị na mberede nke na ọ ga-echetara mmadụ banyere nwamba nke nọ na-akpagharịrị onwe ya ma mgbe ọ hụrụ nkịta ya agbapụ ọsọ. Ya adịkwala mgbe ị ga-ekwu okwu ọsọ ọsọ nke na ọ ga-emetụta otú i si akpọpụta okwu.

Iji nwee ike ịdị na-agbanwe ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ n’okwu gị, ya abụla nanị i kwutụ okwu ọsọ ọsọ i jiritụ nwayọọ site n’oge ruo n’oge. Kama ime ka ihe ị na-ekwu dịkwuo ụtọ, isi otú ahụ ekwu okwu ga-adọpụ uche na ya. Mgbanwe n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ nke okwu gị kwesịrị ịkwekọ n’ihe ị na-ekwu, mmetụta ị chọrọ iwepụta, na ebumnobi gị. Kwuo okwu gị n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ na-agabigaghị ókè. Iji gosi mkpali, kwuo okwu gị ọsọ ọsọ karị, dị nnọọ ka i si ekwu okwu kwa ụbọchị. Nke a kwesịkwara ekwesị mgbe ị na-ewepụta isi ihe ndị na-adịghị oké mkpa ma ọ bụ mgbe ị na-akọ akụkọ ndị ọ na-abụghị ihe nile merenụ dịcha mkpa na ya. Nke a ga-eme ka okwu gị gwatụ ọgwa ma nye aka mee ka okwu gị ghara ịda ike ike gabiga ókè. N’aka nke ọzọ, arụmụka ndị dị mkpa karị, ihe ndị bụ́ isi ihe, na ihe ndị kasị mkpa n’okwu na-achọkarị ka e kwuo ha nwayọọ nwayọọ karị.

Na-agbanwe Ọdịdị Ụda Olu Gị. Were ya na mmadụ na-akpọ otu ngwá egwú ruo ihe dị ka otu awa. N’oge ahụ nile, ọ bụ nanị otu ụda ka ọ na-ewepụta—o bu ụzọ na-adasi ụda ike, o mesịa dawa nke nta nke nta, mgbe ụfọdụ ọ̀ dawa ọkụ ọkụ, mgbe ahụzi nwayọọ nwayọọ. E nwere mgbanwe n’otú ọ na-adaru ụda na otú o si ada ọkụ ọkụ, ma ọ bụrụ na e nweghị mgbanwe n’ọdịdị ụda ya, “egwú” ahụ agaghị adịcha ụtọ. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na e nweghị mgbanwe n’ọdịdị ụda olu, ụda olu anyị agaghị adị ụtọ ná ntị.

A ghaghị ịrịba ama na mgbanwe n’ọdịdị ụda olu adịghị enwe otu mmetụta ahụ n’asụsụ nile. N’asụsụ nwere akara ụda olu, dị ka Igbo, ịgbanwe ọdịdị ụda olu pụrụ ịgbanwe ihe okwu pụtara. Ka o sina dị, ọbụna n’asụsụ dị otú ahụ, e nwegasịrị ihe mmadụ pụrụ ime iji gbanwee ụda okwu ya n’ụzọ dị ukwuu. Ọ pụrụ ịrụ ọrụ n’imeziwanye ọdịdị ụda olu ya inwe mmetụta ka ukwuu n’agbanweghị otú e si akpọ okwu. N’ụzọ dị otú a, ọ pụrụ ime ka ụda ndị dị elu dịkwuo elu, meekwa ka ụda ndị dị ala dịkwuo ala.

Ọbụna n’asụsụ ndị na-enweghị akara ụda olu, ịgbanwe ọdịdị ụda olu pụrụ inye echiche dịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, a pụrụ iji ịgbanwetụ ọdịdị ụda olu na iwelikwu olu elu otú dabara adaba mesie echiche okwu ike. Ma ọ bụkwanụ, ịgbanwe ọdịdị ụda olu pụrụ ịbụ otu ụzọ isi gosi otú ihe ha n’ibu ma ọ bụ otú o si dị anya. Ịgbanwetụ ụda olu laa elu ná ngwụsị ahịrịokwu pụrụ igosi na ọ bụ ajụjụ ka a na-ajụ. Asụsụ ụfọdụ pụrụ ịchọ ka e mee ka ụda olu lọtuo ala.

A pụrụ iji ọdịdị ụda olu dịtụ elu karị gosi mkpali na ịnụ ọkụ n’obi. (N’asụsụ nwere akara ụda olu, nke ahụ ga-achọ ụda olu dịtụ elu karị.) Mwute na nchegbu pụrụ ịchọ ọdịdị ụda olu dị ala karị. (Ma ọ bụ n’asụsụ nwere akara ụda olu, ọ ga-achọ ụda olu dị ala karị.) Mmetụta uche ndị e hotara n’ebe a bụ ndị nke na-enyere ọkà okwu aka iru n’obi ndị mmadụ. Mgbe ị chọrọ igosipụta ha, ya abụla nanị ikwupụta okwu ndị ahụ ekwupụta ka ị ga-eme. Jiri ụda olu gị mee ihe n’ụzọ ga-egosi na gị onwe gị kwa nwere mmetụta ndị ahụ.

Ịtọ Ntọala. Ọ bụrụ otú ahụ, olee ebe mgbanwe ụda olu na-amalite? Ọ bụ mgbe ị na-ahọrọ ihe ndị ị ga-ekwu n’okwu gị. Ọ bụrụ na ọ bụ nanị arụmụka ma ọ bụ nanị agbamume ka ị họọrọ, ị gaghị enwecha ohere ịgbanwe otú i si ekwu okwu. Ya mere nyochaa ihe ndepụta gị nke ọma, jidekwa n’aka na i nwere ihe ndị na-eme ka okwu dị ụtọ ma nwee ihe mmụta.

Ka e were ya na ka ị nọ na-ekwu okwu gị, ị hụrụ mkpa ọ dị inwekwu mgbanwe n’ihi na okwu gị jụrụ oyi. Gịnị ka ị ga-eme? Gbanwee ụzọ i si na-ekwu okwu gị. N’ụzọ dị aṅaa? Otu ụzọ bụ imeghe Bible, gwa ndị na-ege ntị ka ha meghee nke ha, ma gụọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ kama ịnọ na-ekwu nanị okwu. Ma ọ bụ ịgbanwe okwu ụfọdụ ka ha ghọọ ajụjụ, na-akwụsịtụ iji mesie okwu ike. Webata ihe atụ dị mfe. Ihe ndị a bụ ihe ndị ọkà okwu nwere ahụmahụ na-eme. Ma n’agbanyeghị otú i nweruru ahụmahụ, ị pụrụ iji otu echiche ndị a mee ihe mgbe ị na-akwadebe ihe omume gị.

A pụrụ ikwu na mgbanwe ụda olu bụ nnu na-eme ka okwu dị ụtọ. Ọ bụrụ na e jiri ụdị nke kwesịrị ekwesị mee ihe ma meruo ya otú kwesịrị ekwesị, ọ ga-ewepụtacha ịdị ụtọ nke ihe omume gị, meekwa ka ọ tọọ ndị na-ege gị ntị ụtọ.

ỤZỌ ISI MEE YA

  • Welie ma ọ bụ wetuo olu gị mgbe ị na-ekwupụta iwu ndị dị mkpa, nkwenye siri ike, ma ọ bụ okwu amamikpe. Jiri nlezianya chebara akụkụ dị iche iche nke okwu gị echiche bụ́ ndị chọrọ ka i welitekwuo olu na ha.

  • Gbanwee ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ n’okwu gị site n’ikwu okwu ọsọ ọsọ karị n’isi ihe ndị na-adịghị oké mkpa na ikwu okwu nwayọọ nwayọọ karị ma i rute n’arụmụka ndị gbara ọkpụrụkpụ na n’ihe ndị bụ́ isi ihe. Iji gosi mkpali, kwuo okwu ọkụ ọkụ.

  • Gbanwee ọdịdị ụda olu, ma ọ bụrụ na ọ kwesịrị ekwesị, iji gosipụta mmetụta uche ma ruo n’obi ndị mmadụ. N’asụsụ nwere akara ụda olu, mee ka ụda olu gị bukwuo ibu ma ọ bụ dịkwuo ntakịrị.

  • Mgbanwe ụda olu na-amalite mgbe ị na-ahọrọ ihe ị ga-ekwu n’okwu gị.

IHE OMUME: (1) Gụpụta 1 Samuel 17:17-53, na-arịba ama ohere ndị i nwere ịgbanwe n’ụzọ kwesịrị ekwesị otú olu gị si adasi ike, ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ n’okwu gị, na ọdịdị ụda olu gị. Mgbe ahụ gụpụta ya n’ụzọ ga-egosipụta mmetụta ma ọ gaghị abụ n’ụzọ gabigara ókè. Mee nke a ọtụtụ ugboro. (2) Iji mụta ịgbanwe ụda olu gị, gụpụta 1Sa 17 amaokwu nke 48-51 ọkụ ọkụ ruo n’ókè i nwere ike n’agụhieghị ihe ma laghachi azụ. N’ahapụghị ikwupụta okwu n’ụzọ doro anya, gụghachi ya ugboro ugboro, nọgide na-agụtụkwu ya ọsọ ọsọ karị. Jirizie nwayọọ, ruo n’ókè o kwere mee, gụọ ihe ahụ, na-akpọpụtacha okwu nile. Ọzọ, gụọ ya, ị gụtụ ya ọsọ ọsọ i jiritụ nwayọọ ruo mgbe ụda olu gị ga-eme ihe ị chọrọ ka o mee.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya