Ị̀ Ga-eji Oge A Ga-echeta Ọnwụ Jizọs Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ?
1. Olee ihe anyị ga-eji oge anyị ga-echeta ọnwụ Jizọs mee?
1 Anyị ga-echeta ọnwụ Jizọs n’abalị iri na anọ n’ọnwa Eprel. Oge ahụ ga-abụ oge magburu onwe ya anyị ga-eji nwee obi ụtọ ma gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma o meere anyị. Akụkọ a kọrọ na Luk 17:11-18 na-egosi otú obi na-adị Jehova na Jizọs ma mmadụ gosi na obi dị ya ụtọ maka ihe e meere ya. Ma, n’akụkọ ahụ, ọ bụ naanị otu onye n’ime ndị ekpenta iri ahụ laghachiri kelee Jizọs. N’oge na-adịghị anya, àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ ga-eme ka ọrịa kwụsị, ndị mmadụ ga-amalitekwa ịdị ndụ ebighị ebi. Mgbe ahụ, anyị ga na-ekele Jehova kwa ụbọchị maka ihe ọma ndị o meere anyị. Ma, olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ n’oge anyị ga-echeta ọnwụ Jizọs?
2. Gịnị ka anyị ga-eme ka obi dị anyị ụtọ maka àjà Jizọs chụrụ?
2 Nwee Obi Ụtọ: Iche banyere ihe ọma e meere anyị na-eme ka obi dị anyị ụtọ. Na Kalenda nakwa n’akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị, ị ga-ahụ amaokwu Baịbụl ndị anyị ga-agụ n’oge a na-echeta ọnwụ Jizọs. Ịgụ ha ga-enyere anyị aka iche banyere ihe ọma Jehova na Jizọs meere anyị. Ọ ga-adị mma ma ezinụlọ unu gụkọọ ebe ahụ ọnụ. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, obi ga-adịkwu anyị ụtọ maka àjà ahụ Jizọs chụrụ. Ọ ga-eme ka anyị na-akpakwu àgwà ọma.—2 Kọr. 5:14, 15; 1 Jọn 4:11.
3. Olee ihe ndị anyị ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ n’oge a ga-echeta ọnwụ Jizọs?
3 Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ: Ihe anyị na-eme ma e meere anyị ihe ọma na-egosi na obi dị anyị ụtọ. (Kọl. 3:15) Onye ekpenta ahụ chọọrọ Jizọs gaa kelee ya iji gosi na obi dị ya ụtọ. Ọ ga-abụrịrị na o jikwa obi ụtọ kọọrọ ndị ọzọ otú Jizọs si gwọọ ya. (Luk 6:45) Ànyị ga-eji obi ụtọ soro na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù n’oge a ga-echeta ọnwụ Jizọs iji gosi na obi dị anyị ụtọ? Ihe ọzọ anyị nwere ike ime iji gosi na obi dị anyị ụtọ n’oge a bụ ịsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụkwanụ anyị ewepụtakwuo oge na-eje ozi ọma. Ihe ọzọ anyị ga-eme bụ ịnabata ndị bịara iso anyị cheta ọnwụ Jizọs tupu ihe omume amalite, zaakwa ajụjụ ọ bụla ha jụrụ anyị.
4. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịkwa mmakwaara ma oge a ga-echeta ọnwụ Jizọs gafee?
4 Nke a ọ̀ ga-abụ nke ikpeazụ anyị ga-echeta ọnwụ Jizọs? (1 Kọr. 11:26) Anyị amaghị. Ma, ihe doro anyị anya bụ na ọ bụ oge anyị ga-eji gosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà Jizọs chụrụ. Nke afọ a gaa, ọ gachaala. Ị̀ ga-eji oge a ga-echeta ọnwụ Jizọs gosi na obi dị gị ụtọ? Ka ihe anyị na-ekwu na ihe anyị na-atụgharị n’uche bụrụ ihe ga na-atọ Jehova ụtọ n’ihi na o ji nwa ya chụọ àjà.—Ọma 19:14.