Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 15
IZU NA-AMALITE NA MACH 15
Abụ nke 192
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cf isi nke 1 ¶16-20, na igbe dị na peeji nke 13
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl:1 Samuel 5-9
Na 1: 1 Samuel 6:1-9
Na 2: Gịnị Ga-echebe Anyị n’Ọgụ Setan na Ndị Mmụọ Ọjọọ Ya Na-alụso Anyị?
Na 3: Ọ̀ Bụ Pita Bụ “Oké Nkume” ahụ? (td 8B)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 211
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 5: “Ì Jikerela Ịbụku Jehova Abụ n’Ọmụmụ Ihe Anyị?” Ajụjụ na azịza. Gwa mmadụ niile ka ha jiri akwụkwọ abụ ọhụrụ ha na-abịa ọmụmụ ihe malite n’izu Eprel 5, 2010.
Nkeji 10: Ime Nletaghachi. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke ga-esi n’akwụkwọ Ndị A Haziri, n’isiokwu nta malitere na peeji nke 96, paragraf nke 1-3. Gwa onye nkwusa ka o mee ihe ngosi otú e si agara onye natara akwụkwọ a na-enyefe n’ọnwa Mach nletaghachi.
Nkeji 15: “Ọrụ Kacha Mkpa Anyị Kwesịrị Ịrụ.” Ajụjụ na azịza. Unu tụlechaa paragraf nke 3, gbaa otu onye nkwusa ajụjụ ọnụ. Ọ ga-abụ onye nwere onye na-eme nke ọma ọ na-eduziri ọmụmụ Baịbụl. Olee mgbanwe ụfọdụ onye ahụ ọ na-amụrụ ihe mere? Olee otú nke ahụ si metụta onye nkwusa ahụ?
Abụ nke 1