Ì Jikerela Ịbụku Jehova Abụ n’Ọmụmụ Ihe Anyị?
1 Ọ bụrụ na mmadụ na-akwadebe ọmụmụ ihe, onye ahụ kwesịkwara ịkwadebe ịbụ abụ. Legodị ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka.
2 Ghọta Ihe Abụ ahụ Na-ekwu: Amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu abụ nke ọ bụla na amaokwu Baịbụl ndị e dere n’ala ala peeji ya bụ iji mee ka o doo anya na ihe abụ ahụ na-ekwu si n’Akwụkwọ Nsọ.
3 Mụọ Ya: N’izu ọ bụla n’oge Ofufe Ezinụlọ unu, unu nwere ike wepụta obere oge na-amụ abụ ọhụrụ ndị ahụ. Jirinụ siidi e ji pịano kụọ na-amụ abụ ndị a ga-abụ n’ọmụmụ ihe. Unu nwekwara ike ịmụta otú e si abụ ụfọdụ abụ ọhụrụ ndị ahụ na ihe ha na-ekwu ma unu gee nke Bekee e ji ọnụ bụọ (Sing to Jehovah—Vocal Renditions, Disc 1).
4 A ga-ebido iji akwụkwọ abụ anyị bụ́ Bụkuo Jehova Abụ na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe malite n’izu Eprel 5, 2010. Ị̀ ga-adị njikere iji ya na-abụ abụ mgbe ahụ? Ị ga-adị njikere ma ọ bụrụ na i wepụta oge mụọ ha ma ghọta ihe ha na-ekwu.