Abụ Ọhụrụ Ndị Anyị Ga-eji Na-efe Jehova
1 N’abalị anọ n’ọnwa iri n’afọ a ka Watch Tower Bible na Tract Society nke Pensụlvenịa nwere nnọkọ ha na-enwe kwa afọ. Ná nnọkọ ahụ, a mara ọkwa na a ga-edegharị ụfọdụ ihe n’akwụkwọ abụ ọhụrụ anyị. Ọkwa ahụ mere mmadụ niile obi ụtọ. E chatakwaara ndị niile bịara nnọkọ ahụ uru abụ anyị bara n’ofufe Jehova.—Ọma 96:2.
2 Ma, i nwere ike ịna-eche ihe mere e ji chọọ idegharị ụfọdụ ihe n’akwụkwọ abụ anyị. Otu n’ime ihe mere e ji edegharị ha bụ na ka oge na-aga, anyị na-aghọtakwu ihe ndị dị na Baịbụl nke ọma. N’ihi ya, anyị kwesịrị idegharị otú e si kọwaa ha n’abụ ụfọdụ. (Ilu 4:18) Ihe ọzọ bụ na n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ, ebe e si nweta ụfọdụ okwu dị n’akwụkwọ abụ anyị bụ na Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke ochie. E kwesịkwara idegharị ha ka ha daba n’ihe dị na Baịbụl nke ọhụrụ a. Ebe ọ bụ na ọrụ dị n’idegharị abụ ndị ahụ abụghị obere ọrụ, e kpebikwuru na a ga-etinyekwu ụfọdụ abụ ọhụrụ n’akwụkwọ abụ anyị.
3 Ànyị ga-echere ka e wepụta akwụkwọ abụ ọhụrụ tupu anyị amalite ịbụ abụ ndị ọhụrụ ahụ n’ọmụmụ ihe? Mba. Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na n’ime ọnwa ndị na-abịa abịa, a ga-ewepụta ụfọdụ abụ ọhụrụ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ya bụ, na jw.org. E wepụta abụ ọhụrụ, a ga-etinye ya ka e jiri ya mechie Nzukọ Ije Ozi. A ga-edekwa “abụ ọhụrụ” n’ebe ahụ.
4 Otú Anyị Ga-esi Mụta Abụ Ọhụrụ Ndị Ahụ: Ịmụta abụ ọhụrụ anaghị adịcha mfe. Ma, dị ka Devid, anyị chọrọ ịna-abụku Jehova abụ n’ọmụmụ ihe, ma ‘ghara ịgba nkịtị.’ (Ọma 30:12) Ime ihe ndị a ga-enyere anyị aka ịmụta abụ ọhụrụ ọ bụla.
E tinye nke e ji pịano kụọ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, gee ya ugboro ugboro. Ime otú a ga-enyere gị aka ịmụta otú e si abụ ya.
Mụọ abụ ahụ, gbalịakwa buru ya n’isi.
Ị kpọnye nke pịano, ị na-abụ ya. Na-amụ ya otú ahụ ruo mgbe ị mụtara ya.
Na-amụgharịnụ abụ ndị ọhụrụ ma unu nwewe Ofufe Ezinụlọ ruo mgbe unu mụtachara ha.
5 Ọ bụrụ na e kwuo na a ga-eji abụ ọhụrụ mechie Nzukọ Ije Ozi, a ga-ebu ụzọ kpọnye nke pịano ka ndị bịara ọmụmụ ihe gegodị ya. Ọ kpọchaa, a kpọnyezie ya ọzọ ka onye ọ bụla soro bụọ ya otú ahụ anyị na-eme ma a bụwa abụ ndị ọzọ.
6 Anyị kwesịrị icheta na ịbụ abụ n’ọmụmụ ihe na-eme ka anyị jiri ọṅụ soro ụmụnna anyị na-eto Jehova. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịkpachara anya na-apụ n’èzí ma a bụwa abụ.
7 E nwekwara otú ọzọ anyị ga-esi gosi na anyị ma uru abụ anyị bara. A na-akpọnye abụ olu ụtọ ná mgbakọ tupu a malite ihe omume. Ugboro abụọ n’afọ, ụfọdụ ụmụnna na-esi obodo dị iche iche gbaara onwe ha ụgbọ gaa Patasịn dị na Niu Yọk ka ha kụọ egwú ndị ahụ anyị ji efe Jehova. N’ihi ya, mgbe ọ bụla onyeisi oche nnọkọ gwara anyị ka anyị gaa nọrọ n’oche anyị gere abụ olu ụtọ, anyị kwesịrị ime otú ahụ. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị kwadebe obi anyị maka ihe omume nnọkọ ahụ.—Ezra 7:10.
8 Anyị ga-eji otu abụ ọhụrụ mechie ọmụmụ ihe taa. Isiokwu abụ ahụ bụ “Alaeze Chineke Achịwala—Ya Bịawa!” A bụrụ abụ a ná nnọkọ Watch Tower Bible na Tract Society nke Pensụlvenịa nwere n’abalị anọ n’ọnwa Ọktoba afọ a. E ji ya echeta na o meela otu narị afọ Kraịst malitere ịchị n’eluigwe.
9 Abụ ọhụrụ ndị a so ‘n’ihe ọma’ Jehova nyere anyị. (Mat. 12:35a) Ka anyị niile kpebie na anyị ga-amụta ha ma jiri obi anyị niile na-abụ ha, si otú a na-enye Chineke anyị otuto.—Ọma 147:1.