Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Disemba 29, 2014.
Diuterọnọmi isi iri na anọ amaokwu mbụ kwuru na anyị ekwesịghị ibekasị ahụ́ anyị n’ihi onye nwụrụ anwụ. Olee otú anyị si ele ihe a amaokwu Baịbụl a kwuru anya? [Nọv. 3, w04 9/15 p. 27 para. 4]
Gịnị mere Chineke ji nye ndị eze Izrel iwu ka ha depụtara onwe ha Iwu ya ha ‘ga na-agụ n’ụbọchị niile nke ndụ ha’? (Diut. 17:18-20) [Nọv. 3, w02 6/15 p. 12 para. 4]
Diuterọnọmi isi iri abụọ na abụọ amaokwu iri kwuru na e kwesịghị ijikọta ehi na ịnyịnya ibu jiri ha na-akọ ihe. Gịnị mere Chineke ji nye ụmụ Izrel iwu a? Olee otú iwu a si gbasa Ndị Kraịst? [Nọv. 10, w03 10/15 p. 32]
Gịnị mere Chineke ji nye ndị Izrel iwu ka ha ghara ‘iburu nkume igwe nri ma ọ bụ aka nkume igwe nri dị ka ihe ibé’? (Diut. 24:6) [Nọv. 17, w04 9/15 p. 26 para. 2]
Olee ụdị obi ụmụ Izrel kwesịrị iji na-erubere Chineke isi? Gịnịkwa kwesịrị ịbụ ihe mere anyị ga-eji na-ejere Jehova ozi? (Diut. 28:47) [Nọv. 24, w10 9/15 p. 8 para. 4]
Olee ihe atọ Diuterọnọmi 30:19, 20 kwuru anyị kwesịrị ime ka anyị wee dị ndụ? [Nọv. 24, w10 2/15 p. 28 para. 17]
Ọ̀ bụ iwu na anyị ga-ewetu olu ala mgbe anyị na-agụpụta ihe niile e dere na Baịbụl malite na Jenesis ruo Mkpughe? Kọwaa. (Jọsh. 1:8) [Dis. 8, w13 4/15 p. 7 para. 4]
Ònye bụ “ọchịagha nke ụsụụ ndị agha Jehova” e kwuru okwu ya na Jọshụa 5:14, 15? Oleekwa otú amaokwu a si agba anyị ume? [Dis. 8, w04 12/1 p. 9 para. 1]
Gịnị mere Ekan ji zuo ohi? Gịnịkwa ka anyị mụtara n’ihe o mere? (Jọsh. 7:20, 21) [Dis. 15, w10 4/15 p. 20-21 para. 2, 5]
Olee otú akụkọ banyere Keleb si agba anyị ume taa? (Jọsh. 14:10-13) [Dis. 29, w04 12/1 p. 12 para. 2]