Jiri Obi Ụtọ Na-akwado Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs
1. Olee otú obi kwesịrị ịdị anyị n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs?
1 Anyị ga-echeta ọnwụ Jizọs na Tuzdee, Mach 26. Anyị gaa ya, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jehova mere iji gbapụta anyị. (Aịza. 61:10) Anyị kwesịrị inwe obi ụtọ n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. Nke a ga-emekwa ka anyị malite ugbu a kwadowe maka ya. Olee otú anyị ga-esi akwado maka ya?
2. Olee ihe mere anyị ji akwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?
2 Otú Anyị Ga-esi Akwadebe: N’agbanyeghị na Nri Anyasị Onyenwe Anyị pụrụ iche, anyị anaghị emere ya oriri. Ma, anyị kwesịrị ibido ngwa ngwa kwadowe maka ya. Nke a ga-eme ka anyị ghara ileghara ihe ndị dị mkpa anya. (Ilu 21:5) Dị ka ihe atụ, e kwesịrị ịmata oge na ebe dị mma a ga-anọ eme ya, dowekwa ebe ahụ ọcha. E kwesịrị inweta achịcha na mmanya a ga-eji eme ya. Onye ga-ekwukwa okwu ncheta ọnwụ Jizọs n’ụbọchị ahụ ga-akwado nke ọma. E kwesịkwara inweta ndị ga-ebugharị achịcha na mmanya nakwa ndị atendantị ma gwa ha ihe ha ga-eme. Anyị ma na unu emeela ọtụtụ n’ime ihe ndị a anyị kpọrọ aha. Ọ bụrụ na anyị akwadebe nke ọma, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka otú Jizọs si gbapụta anyị.—1 Pita 1:8, 9.
3. Olee otú anyị ga-esi akwadebe obi anyị maka Nri Anyasị Onyenwe Anyị?
3 Otú Anyị Ga-esi Kwadebe Obi Anyị: Anyị kwesịkwara ịkwadebe obi anyị. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe mere anyị kwesịrị iji na-echeta ọnwụ Jizọs. (Ezra 7:10) N’ihi ya, anyị kwesịrị iwepụta oge gụọ amaokwu Baịbụl ndị a ga-agụ n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịkwara ichebara ihe ndị Jizọs mere mgbe ọ fọrọ ụbọchị ole na ole ka ọ nwụọ echiche. Ọ bụrụ na anyị echebara otú Jizọs si gbapụta anyị echiche, ọ ga-eme ka anyị na-eme ka ya.—Gal. 2:20.
4. Olee uru ọnwụ Jizọs baara anyị? Oleekwa nke kacha eme gị obi ụtọ n’ime uru ndị ahụ?
4 Ọnwụ Jizọs mere ka a mata na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. Ọ bụ ya ka e ji napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. (1 Jọn 2:2) O mere ka anyị na Chineke nwee ike ịdị ná mma, meekwa ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. (Kọl. 1:21, 22) Ihe ọzọ bụ na ọ na-enyere anyị aka ịnọgide na-efe Jehova ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla megharịa anyị anya. (Mat. 16:24) Anyị ga-enwekwu obi ụtọ ka anyị na-akwadebe maka Ncheta Ọnwụ Onyenwe anyị. Obi ga-adịkwukwa anyị ụtọ ma anyị gaa ya.