Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/15 p. 1
  • Ị̀ Na-akwado Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-akwado Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?
  • Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-akwadebe Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Jiri Obi Ụtọ Na-akwado Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta
    Ozi Alaeze Anyi—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2015
km 3/15 p. 1

Ị̀ Na-akwado Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

N’abalị iri na atọ n’ọnwa Naịsan afọ 33, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ejikere maka Ememme Ngabiga. Ọ ma na mgbede ụbọchị ahụ bụ mgbede ikpeazụ ya na ha ga-anọrị tupu e gbuo ya. Ha mechaa ememme ahụ, ya amalite Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ma, ha kwesịrị ịkwado ememme ahụ akwado tupu ha emewe ya n’ihi na ọ dị ezigbo mkpa. N’ihi ya, ọ gwara Pita na Jọn ka ha gaa dozie ebe ha ga-anọ eme ya. (Luk 22:7-13) Kemgbe ahụ, Ndị Kraịst na-akwado akwado tupu ha echeta ọnwụ Kraịst n’afọ ọ bụla. (Luk 22:19) Olee ihe ndị anyị kwesịrị ime iji kwadoo maka Ncheta Ọnwụ Kraịst a ga-eme n’abalị atọ n’ọnwa Eprel?

Ihe Ndị Okenye Ga-eme:

  • Ha ga-ekpebi ma à ga-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ebe ọzọ dị mma eme ya. Ebe ahụ kwesịrị ịba ndị niile ga-abịanụ. Ọkụ kwesịrị ịdị ya, ikuku kwesịkwara ịna-abata ya nke ọma. Ndị okenye ga-ahụkwa na ebe ahụ dị ọcha.

  • Ha ga-ahọpụta nwanna ruru eru ga-ekwu okwu n’ụbọchị ahụ, onyeisi oche, na ndị ga-ekpe ekpere tupu e bugharịwa achịcha na mmanya.

  • Ọ bụrụ na ihe karịrị otu ọgbakọ ga-anọ otu ebe eme ya, ndị okenye ga-ekpebi mgbe ọgbakọ nke ọ bụla ga-eme nke ha nakwa mgbe ha kwesịrị ịhapụ ebe ahụ. Ha ga-ahazikwa otú ụgbọala ga-esi na-abata na-apụ.

  • Ha ga-ahọpụta ndị atendantị na ndị ga-ebugharị achịcha na mmanya, gwakwa ha ihe ha ga-eme.

  • Ha ga-ahụ na e nwetara achịcha na mmanya a ga-eji eme ya. Ha ga-ahụkwa na e nwetara efere, iko mmanya, tebụl dị mma, na ákwà a ga-atụ n’elu ya.

Ihe Ndị Nkwusa Ga-eme:

  • Ha ga-agba ezigbo mbọ kesaa akwụkwọ anyị ji akpọ ndị mmadụ òkù.

  • Ha ga-ede aha ndị ha ga-akpọ òkù n’akwụkwọ, ma ndị ha na-amụrụ ihe ma ndị ikwu ha ma ụmụ akwụkwọ ibe ha ma ndị ọrụ ibe ha ma ndị ọzọ.

  • Ha ga-agụ amaokwu Baịbụl ndị a na-agụ n’oge a na-echeta ọnwụ Jizọs ma tụgharịa uche n’ihe ha gụrụ.

  • Ha ga-agba mbọ bịa n’oge n’ụbọchị ahụ ka ha nwee ike ịnabata ndị a kpọrọ òkù.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya