Ebe Pita na Jọn na-akwadebe maka Ememme Ngabiga n’ọnụ ụlọ dị n’elu n’afọ 33 O.N.K.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ị̀ Na-akwadebe Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?
Ememme Ngabiga ikpeazụ Jizọs ga-eme tupu ọnwụ ya ga-apụ iche. Ebe ọ bụ na ọ na-aga ịnwụ n’oge na-adịghị anya, o mere atụmatụ ka ya na ndịozi ya soro mee Ememme Ngabiga ahụ ma hiwe ihe ọhụrụ a ga na-eme kwa afọ, ya bụ, Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. N’ihi ya, o zipụrụ Pita na Jọn ka ha gaa kwadebe ọnụ ụlọ ha ga-anọ eme ya. (Luk 22:7-13; lee ihe e sere n’ihu akwụkwọ a.) Ihe a na-echetara anyị na ọ dị mkpa ka anyị kwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs a ga-eme n’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Mach. O nwere ike ịbụ na ọgbakọ dị iche iche emeela ndokwa maka onye ga-ekwu okwu, achịcha na mmanya, na ihe ndị ọzọ. Ma, gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme iji kwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?
Kwadebe obi gị. Gụọ ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs, tụgharịakwa uche n’ihe ndị ị gụtara. Ị ga-ahụ usoro ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs n’akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Ị ga-ahụkwa ebe e depụtara ya nke ọma n’azụ Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ e degharịrị edegharị (nke Bekee) n’ebe e dere B12. (Leekwa akwụkwọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nke Eprel 2020.) Ezinụlọ dị iche iche nwere ike ịga na Watch Tower Publications Index ma ọ bụ n’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ chọọ isiokwu kwuru banyere uru àjà mgbabụta ahụ bara ma tụlee ya n’ofufe ezinụlọ ha.
Kpọọ ndị ọzọ ka ha bịa. Soro kpọọ ndị ọzọ ka ha bịa. Chọpụta ndị i nwere ike ịkpọ, dị ka ndị ị na-agara nletaghachi, ndị ị na-amụburu Baịbụl, ndị enyi gị, na ndị ikwu gị. Ndị okenye kwesịrị ijide n’aka na ha ga-aga kpọọ ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma. Cheta na ọ bụrụ na onye ị na-akpọ òkù ka ọ bịa ebighị n’ógbè unu, i nwere ike ịchọpụta oge na ebe a ga-anọ eme ya n’ebe o bi ma ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere GBASARA ANYỊ, pịzie “Ncheta Ọnwụ Jizọs.”
Olee ihe ọzọ anyị ga-eme iji kwadebe?