Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 16
IZU NA-AMALITE NA MACH 16
Abụ nke 65 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 21 ¶16-21, igbe dị na peeji nke 217 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Samuel 5-9 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Samuel 6:10-21 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Ụmụ Zelofehad?—Ọnụ Ọgụ. 36:10-12 (Nkeji 5)
Nke 3: Amụma Ndị Kraịst Mezuru—igw p. 11 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Dị Njikere Ịrụ Ezi Ọrụ Ọ Bụla.”—Taị. 3:1.
Nkeji 10: Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Taịwan. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche Ọktoba 15, 2014, peeji nke 3-6. Olee otú ndị nkwusa a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu ahụ si kwadebe ịga kwusaa ozi ọma n’ala ọzọ? Olee uru ndị ha riterela?
Nkeji 20: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Inwe Ndị Anyị Na-ewegara Magazin Ọ Bụla E Bipụtara.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Unu tụlechaa isiokwu a, a ga-eji nkeji ole na ole mee ihe ngosi ebe onye nkwusa na-agwa onye ọ na-adị ewegara magazin ka ya na ya mụwa ihe. E mechaa ya, gbaa onye nkwusa nwere onye ọ na-adị ewegara magazin ajụjụ ọnụ. Mmadụ ole ka ọ na-adị ewegara magazin? Olee otú o si akwadebe ihe ọ ga-ekwu tupu ya agawa na nke onye nke ọ bụla n’ime ha? Gwa ya ka ọ kọọ ahụmahụ ọ bụla dị ụtọ o nwere mgbe o wegaara mmadụ magazin.
Abụ nke 101 na Ekpere