Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/98 p. 1
  • Ụmụaka—Unu Bụ Ọṅụ Anyị!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụaka—Unu Bụ Ọṅụ Anyị!
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Onwe Onye Maka Afọ Ije Ozi Ọhụrụ
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ndị Ntorobịa—Gịnị Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Unu?
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Nwere Ike Isi Jekwuoro Jehova Ozi
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ka Obi Na-atọ Gị Ụtọ n’Ihe Ndị I Nwere Ike Imere Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 3/98 p. 1

Ụmụaka—Unu Bụ Ọṅụ Anyị!

1 Ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ, ùnu maara iwu Chineke nke bụ ka a gụnye unu n’ihe omume nke ọgbakọ? (Deut. 31:12; Abụ Ọma 127:3) Ọ bụ ihe ọṅụ ịhụ unu n’akụkụ anyị ka anyị na-efekọ Jehova ọnụ! Unu na-eme anyị obi ụtọ mgbe unu na-anọdụ nwayọọ ná nzukọ wee na-ege ntị nke ọma. Ọ na-eme anyị obi ụtọ karịsịa mgbe unu na-agbalị ịza ajụjụ n’okwu nke aka unu. Ọgbakọ dum na-enwe obi ụtọ mgbe unu na-eme ihe omume e kenyere unu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, mgbe unu na-eji ịnụ ọkụ n’obi soro anyị n’ozi ubi, na mgbe anyị na-anụ na unu ji nkwuwa okwu na-agbara ụmụ akwụkwọ ibe unu na ndị nkụzi unu àmà.—Abụ Ọma 148:12, 13.

2 Anyị chọrọ ka unu mara na anyị ji unu eme ọnụ mgbe anyị na-ahụ àgwà ọma unu, ọdịdị unu dị ọcha, àgwà unu dị ọcha, na ùgwù unu na-akwanyere ndị toro eto. Ọṅụ anyị na-adị ukwuu karịsịa mgbe unu na-egosi na unu ‘na-echeta Onye Keworo unu’ site n’isetịpụrụ onwe unu ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke.—Ekli. 12:1; Abụ Ọma 110:3.

3 Gwa Anyị Ihe Mgbaru Ọsọ Unu: Otu nwatakịrị gbara afọ asatọ gwara otu onye nlekọta distrikti, sị: ‘Nke mbụ aga m achọ ka e mee m baptism, mgbe ahụ aga m achọ inye aka n’ọgbakọ site n’ilekọta ígwè okwu microphone, ịbụ onye atendantị, inye aka n’ilekọta akwụkwọ, ịgụ ihe n’ọmụmụ akwụkwọ na n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Mgbe ahụ aga m achọ ịbụ ohu na-eje ozi, mgbe ahụzi okenye. Aga m achọkwa ịbụ ọsụ ụzọ wee gaa ụlọ akwụkwọ ndị ọsụ ụzọ. Mgbe ahụ aga m achọ ịga Betel, bụrụ onye nlekọta sekit ma ọ bụ onye nlekọta distrikti.’ Lee ụdị obi ekele mara mma o gosiri maka ihe ùgwù nke ijere Chineke ozi!

4 Ka unu na-eto n’anụ ahụ na n’ime mmụọ, anyị na-enwe ọṅụ ịhụ ka unu na-eru ihe mgbaru ọsọ unu. (Tụlee Luk 2:52.) Kwa afọ, ọtụtụ puku n’ime unu na-aghọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptism, mgbe ahụkwa ruo eru maka baptism dị ka ndị ohu Jehova raara onwe ha nye. Ọṅụ anyị na-aka ukwuu mgbe anyị na-ahụzi ka unu na-eru eru ịsụ ụzọ inyeaka, ọbụnakwa banye n’ozi oge nile. N’ezie, ụmụaka, unu bụ ọṅụ anyị na isi iyi magburu onwe ya nke otuto nye Nna anyị nke eluigwe. Ka Jehova gọzie unu n’ụba!—Ilu 23:24, 25.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya