Ilu
23 Ị nọdụ ala ka gị na eze rie ihe,
Chebara ihe ị ga-eme echiche nke ọma.
3 Ekwela ka nri ya a kwọrọ aka sie gụọ gị agụụ,
Ka o wee ghara ịbụrụ gị ọnyà.
4 Adọgbula onwe gị n’ọrụ ka ị kpata akụ̀.+
Kwụsị ime otú ahụ, kama gosi na ị na-aghọta ihe.*
6 Erila nri onye aka ntagide.
Ekwela ka nri ya a kwọrọ aka sie gụọ gị agụụ,
7 N’ihi na ọ na-agbakọ ihe niile ị na-eri.
Ọ na-asị gị, “Rie nri, ṅụọkwa mmanya,” ma o sighị ya n’obi.
8 Ị ga-agbọ nri i riri,
Ekele niile i kelere ya ga-alakwa n’iyi.
11 N’ihi na Onye na-agbachitere* ha siri ike.
Ọ ga-ekpechite ọnụ ha ma mesie gị ike.+
12 Jiri obi gị nabata aka ná ntị m na-adọ gị,
Geekwa ntị n’okwu onye ma ihe na-ekwu.
13 Ahapụla ịdọ nwatakịrị aka ná ntị.+
Ọ bụrụ na ị pịa ya ụtarị, ọ gaghị anwụ.
17 Enwerela ndị mmehie anyaụfụ n’ime obi gị.+
Kama, na-atụ egwu Jehova mgbe niile.+
19 Nwa m, gee ntị ka i wee mara ihe,
Duziekwa obi gị ka i wee na-eme ihe dị mma.
20 Esola ná ndị na-aṅụ oké mmanya,+
Esokwala ná ndị na-atafe anụ ókè,+
21 N’ihi na onye aṅụrụma na onye na-eri oké nri ga-ada ogbenye,+
Ụra ha na-ehi ga-eyiwekwa ha nkịrịka ákwà.
24 Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ.
Onye ọ bụla bụ́ nna onye ma ihe ga-enwekwa obi ụtọ n’ihi nwa ya.
25 Nne gị na nna gị ga-aṅụrị ọṅụ,
Nwaanyị mụrụ gị ga-enwekwa obi ụtọ.
27 N’ihi na nwaanyị akwụna dị ka olulu miri emi,
28 Ọ na-echechi mmadụ n’ụzọ ka onye ohi.+
Ọ na-eme ka ụmụ nwoke ndị na-eme ihe ọjọọ na-adịkwu ọtụtụ.
29 Ònye na-ata ahụhụ? Ònye ka ahụ́ na-anaghị eru ala?
Ònye na-ese okwu? Ònye na-ekpesa mkpesa?
Ònye ka ọnyá juru ahụ́ mgbe a na-etighị ya ihe? Ònye ka anya ya na-ahụ inyoghi inyoghi?
30 Ọ bụ ndị na-aṅụte mmanya aka.+
Ndị na-achọ ebe mmanya a gwara agwa dị.
31 Ekwela ka otú mmanya si acha ọbara ọbara masị gị,
Ekwekwala ka otú o si egbuke egbuke n’iko na otú o si eji nwayọọ agbada n’akpịrị masị gị.
32 N’ihi na n’ikpeazụ, ọ na-ata ka agwọ,
Ọ na-atanyekwa mmadụ elò ka ajụala.
34 Ọ ga-adị gị ka ì dina ala n’etiti oké osimiri,
Ka à ga-asị na i dina ala n’elu osisi e ji ejide ákwà ụgbọ mmiri.
35 Ị ga-asị: “Ha etiela m ihe, ma o rughị m n’ahụ́.*
Ha kụrụ m ihe, ma amaghị m na ha kụrụ m ihe.
Olee mgbe m ga-eteta?+
M ka chọrọ ịṅụ ọzọ.”