Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/98 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka March

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka March
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite March 2
  • Izu Na-amalite March 9
  • Izu Na-amalite March 16
  • Izu Na-amalite March 23
  • Izu Na-amalite March 30
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 3/98 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka March

Izu Na-amalite March 2

Abụ 3

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara site n’Ozi Alaeze Anyị.

15 min: “Na-emenụ Nke A Ka Unu Wee Na-echeta M.” Okwu onye okenye ga-ekwu. Kwuo okwu ná mkpirikpi site n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 80-81, na-emesi ike ịdị mkpa nke ịga Ememe Ncheta.

22 min: “Kụnye n’Ime Ndị Ọzọ Olileanya nke Ndụ Ebighị Ebi.” Isiokwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Kọwaa ná mkpirikpi ụzọ a pụrụ isi jiri ajụjụ gaa n’ihu ná mkparịta ụka n’ụzọ dị irè. Nye ihe atụ ụfọdụ nke ajụjụ ma ndị nke na-eduga n’ihe ma ndị nke njụpụta uche bụ́ ndị a pụrụ iji mee ihe n’iche ihe n’ihu mmadụ. (Lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 59-60, paragraf nke 10-12.) Mee ka onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi nke otu n’ime ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ mbụ a tụrụ aro ha ya na nletaghachi ya, na-egosi ka a na-amalite ọmụmụ Bible.

Abụ 88 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 9

Abụ 60

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kpọọ ndị nile nwere mmasị òkù ịbịa okwu ihu ọha pụrụ iche na March 29. A kpọrọ okwu ahụ “Ihe Ị Pụrụ Iji Tụkwasị Bible Obi.”

15 min: Isi Ihe Ndị Sitere na Broshuọ Ọhụrụ, bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile. Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee banyere ihe ndị mere ka Bible kwesị ekwesị anyị ịtụle ya. A kwadebere broshuọ a iji nyere ndị ọ pụrụ ịbụ na ha gụrụ oké akwụkwọ ma ha amachaghị banyere Bible aka. Kama ịnwa ime ka ha kwenye na Bible sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, broshuọ a na-eme ka ihe ndị mere eme gbaara onwe ha àmà. Anyị kwesịrị ịgụ ya ma soro ndị ọzọ kerịta ya, gụnyere ndị anyị na-amụrụ ihe.

22 min: “Ànyị Ga-eme Ya Ọzọ?” (Paragraf nke 1-11) Ajụjụ na azịza. Kọọ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ sitere ná mkpọsa ịsụ ụzọ inyeaka n’afọ gara aga, dị ka a kọrọ na 1998 Yearbook. Kwuo ọnụ ọgụgụ sụrụ ụzọ inyeaka n’ọgbakọ unu n’oge ahụ. Tụlee uru onwe onye ndị anyị na-erite ozugbo site n’ịsụ ụzọ, gosikwa ụzọ mgbalị a e tinyekwuru si etinye ihe n’ọganihu ọgbakọ. Kọwapụta ndokwa ije ozi a na-eme atụmatụ ya n’ọgbakọ n’April na May iji nyere ọtụtụ ndị karị aka ịsụ ụzọ. Ndị nkwusa pụrụ inweta akwụkwọ ndejupụta ma nzukọ gbasaa.

Abụ 195 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 16

Abụ 43

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

22 min: “Ànyị Ga-eme Ya Ọzọ?” (Paragraf nke 12-19) Ajụjụ na azịza. Tụleghachi iru eru ndị e setịpụrụ n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 113-114. Kọwaa ụzọ ịsụ ụzọ inyeaka si akwadebe mmadụ maka ozi ọsụ ụzọ oge nile. Kpọọ ụfọdụ sụrụ ụzọ inyeaka n’afọ gara aga òkù ka ha kọọ ụzọ ha si hazie usoro ihe omume ha iji ruo hour 60 a chọrọ. Olee usoro ihe omume ihe atụ dị na peji ikpeazụ nke ihe ntinye a nke kasị dịrị ha irè? Dị ka oge nyere ohere ya, kọọ ahụmahụ ndị sitere na 1987 Yearbook, peji nke 48-49, 245-246. Gbaa ndị nkwusa ume ịnara akwụkwọ ndejupụta ma nzukọ gbasaa.

Abụ 224 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 23

Abụ 94

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gbaa mmadụ nile ume ịmalite ịkpọ ndị nwere mmasị òkù ịbịa Ememe Ncheta, n’April 11. Gosi otu akwụkwọ ịkpọ òkù, gbaakwa mmadụ nile ume ịnata ụfọdụ na ịmalite ikesa ha n’izu a. Maa ọkwa aha ndị nile na-asụ ụzọ inyeaka n’April. Kọwaa na oge agachabeghị itinye akwụkwọ ndejupụta. Kọwapụta ndokwa dum maka nzukọ ije ozi ndị e mere atụmatụ ha maka April.

20 min: Kwadebe Ndị Ọhụrụ Maka Ije Ozi Ubi. Okwu na ntụle ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Ndị na-eduzi ọmụmụ ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma kwesịrị ịtụle ịkwadebe onye ha na-amụrụ ihe maka ikere òkè n’ije ozi ubi. Kọwapụta ihe e kwuru n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, peji nke 105-106, paragraf nke 14, na peji nke 179, paragraf nke 20. Tụleghachi usoro dị n’Ụlọ Nche, November 15, 1988, peji nke 16-17, paragraf nke 7-10, maka ndị ọhụrụ ịghọ ndị a nakweere dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism. Tụlee aro ndị dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996, paragraf nke 19, maka inyere ndị nkwusa ọhụrụ a na-emebeghị baptism aka ịmalite ije ozi.

15 min: Igbe Ajụjụ. Ajụjụ na azịza. Onye okenye atụleghachi ihe dị n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 131, paragraf nke 1 na 2.

Abụ 47 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 30

Abụ 29

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ubi ha maka March. Gosi mbipụta magazin ndị ọhụrụ, tụọ aro isiokwu ndị ị pụrụ ime ka ha pụta ìhè mgbe a na-enyefe ha, kwuokwa isi ihe ụfọdụ kpọmkwem a pụrụ iji kwuo okwu. Tụleghachi “Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta,” kọwapụtakwa ndokwa ọgbakọ maka Ememe Ncheta. Mmadụ nile kwesịrị ime atụmatụ ikpeazụ iji nyere ndị a na-amụrụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị aka ịbịa. Chetara mmadụ nile ijide n’aka na ha gbasoro usoro ọgụgụ Bible Ememe Ncheta e dokwara maka April 6-11, dị ka e gosipụtara n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị.

13 min: “Ụmụaka—Unu Bụ Ọṅụ Anyị!” Ajụjụ na azịza. Kọọ ahụmahụ sitere n’Ụlọ Nche (Bekee), August 1, 1987, peji nke 25.

20 min: Ụzọ Ụfọdụ A Pụrụ Isi Buso Ịda Mbà Ime Mmụọ Agha. Ndị okenye abụọ atụlee igbe dị n’Ụlọ Nche, May 15, 1986, peji nke 19. Maka nke ọ bụla n’ime “Mgbaàmà nke Ịda Mbà,” jiri Akwụkwọ Nsọ kọwaa ụzọ mmadụ pụrụ isi rite uru ‘n’Enyemaka Maka Ntachi Obi’ kwesịrị ya. Mgbe ahụ gbaa ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị ga-ekwu ụzọ itinye isi ihe ndị dị otú ahụ n’ọrụ si nyere ha aka ịnọgide na-enwe ume ime mmụọ ha.

Abụ 140 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya