Isi nke 18
Mee Ka Ọ Bụrụ Nzube Gị Ijere Chineke Ozi Ruo Mgbe Ebighị Ebi
1, 2. Gịnị ka a chọrọ ma e wezụga inwe ihe ọmụma Chineke?
WERE ya na ị na-eguzo n’ihu ụzọ kpọchiri akpọchi nke na-eduba n’ọnụ ụlọ nke akụ̀ dị ukwuu dị n’ime ya. Ka anyị were ya na onye e nyere ikike enyewo gị mkpịsị ugodi ya ma gwa gị ka i mee ka afọ ju gị n’ihe ndị a bara uru. Mkpịsị ugodi ahụ agaghị abara gị uru ọ gwụla ma i ji ya mee ihe. N’otu aka ahụ, ị ghaghị iji ihe ọmụma mee ihe ma ọ bụrụ na ọ ga-abara gị uru.
2 Nke a bụ eziokwu karịsịa banyere ihe ọmụma Chineke. N’ezie, ezi ihe ọmụma Jehova Chineke na Jisọs Kraịst bụ ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Ma, a pụghị inweta olileanya ahụ site nanị n’inwe ihe ọmụma. Dị ka ị ga-eji mkpịsị ugodi bara uru mee ihe, ọ dị gị mkpa itinye ihe ọmụma Chineke n’ọrụ ná ndụ gị. Jisọs sịrị na ndị na-eme ihe Chineke na-achọ “ga-aba n’alaeze.” Ndị dị otú ahụ ga-enwe ihe ùgwù ijere Chineke ozi ruo mgbe ebighị ebi!—Matiu 7:21; 1 Jọn 2:17.
3. Gịnị bụ ihe Chineke na-achọ maka anyị?
3 Mgbe a mụtasịrị ihe Chineke na-achọ, ọ dị mkpa ime ya eme. Gịnị ka i chere bụ́ ihe Chineke na-achọ maka gị? A pụrụ ịchịkọta ya nke ọma n’okwu ndị a: Ṅomie Jisọs. Pita nke Mbụ 2:21 na-agwa anyị, sị: “A kpọrọ unu ime nke a: n’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ Ya nile.” Ya mere, iji mee ihe Chineke na-achọ, ọ dị gị mkpa ịgbaso ihe nlereanya Jisọs n’ụzọ chiri anya dị ka o kwere omume. Ọ bụ otú ahụ ka ị ga-esi tinye ihe ọmụma Chineke n’ọrụ.
ỤZỌ JISỌS SI JIRI IHE ỌMỤMA CHINEKE MEE IHE
4. N’ihi gịnị ka Jisọs ji mara ihe dị ukwuu banyere Jehova, oleekwa ụzọ o siworo jiri ihe ọmụma nke a mee ihe?
4 Jisọs Kraịst nwere ihe ọmụma bamiri abami karị banyere Chineke karịa otú ndị ọzọ nwere. O binyeere ma soro Jehova Chineke rụkọọ ọrụ n’eluigwe ruo ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ tupu ọ bịa n’ụwa. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Gịnịkwa ka Jisọs ji ihe ọmụma ahụ dum mee? O jughị ya afọ nanị inwe ya. Jisọs biri ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya. Ọ bụ ya mere o ji gosi obi ọma, ndidi, na ịhụnanya dị ukwuu ná mmeso o mesoro ụmụ mmadụ ibe ya. Jisọs si otú ahụ na-eṅomi Nna ya nke eluigwe ma na-eme ihe kwekọrọ n’ihe ọmụma ya nke ụzọ na ụdị onye Jehova bụ.—Jọn 8:23, 28, 29, 38; 1 Jọn 4:8.
5. N’ihi gịnị ka Jisọs ji mee baptism, oleekwa otú o si bie ndụ kwekọrọ n’ihe baptism ya pụtara?
5 Ihe ọmụma Jisọs nwere kwalikwara ya iwere otu nzọụkwụ dị oké mkpa. O si Galili bịa n’Osimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptism. (Matiu 3:13-15) Gịnị ka baptism Jisọs mere ihe atụ ya? Dị ka onye Juu, a mụnyere ya ná mba nke a raara nye Chineke. N’ihi ya, a rarawo Jisọs nye site n’ọmụmụ. (Ọpụpụ 19:5, 6) Site n’ikwenye ka e mee ya baptism, ọ na-egosi Jehova onwe ya ime ihe Chineke chọrọ maka ya n’oge ahụ. (Ndị Hibru 10:5, 7) Jisọs mezukwara ihe baptism ya pụtara. Ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ n’ije ozi Jehova, soro ndị ọzọ na-ekerịta ihe ọmụma Chineke n’ohere ọ bụla. Jisọs nwetara obi ụtọ n’ime ihe Chineke na-achọ, ọbụna na-ekwu na nke a dị ya ka nri.—Jọn 4:34.
6. N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si jụ onwe ya?
6 Jisọs matazuru na ime ihe Jehova na-achọ ga-efu oké ihe—na ọ ga-efu ya ọbụna ndụ ya. Ka o sina dị, Jisọs jụrụ onwe ya, na-etinye mkpa ndị nke onwe ya n’ọkwá nke abụọ. Ime ihe Chineke na-achọ butere ụzọ mgbe nile. N’akụkụ nke a, olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya zuru okè nke Jisọs?
NZỌỤKWỤ NDỊ NA-EDUBA NÁ NDỤ AGWỤGHỊ AGWỤ
7. Olee nzọụkwụ ụfọdụ mmadụ na-aghaghị iwere iji ruo eru maka baptism?
7 N’adịghị ka Jisọs, anyị ezughị okè, anyị pụkwara iru oké nzọụkwụ ahụ nke baptism nanị mgbe anyị weresịịrị nzọụkwụ ndị ọzọ dị mkpa. Nke a na-amalite site n’ịnara ezi ihe ọmụma Jehova Chineke na Jisọs Kraịst n’ime obi anyị. Ime nke a na-eme ka anyị gosipụta okwukwe ma nwee ịhụnanya miri emi maka Chineke. (Matiu 22:37-40; Ndị Rom 10:17; Ndị Hibru 11:6) Ime ihe kwekọrọ n’iwu, na ụkpụrụ nile nke Chineke kwesịrị ịkpali anyị ichegharị, igosipụta mwute nke nsọpụrụ Chineke n’ihi mmehie anyị ndị gara aga. Nke a na-eduga ná ntọghata, ya bụ, gaa ná nchigharị na mgbahapụ nke ụzọ ọ bụla na-ezighị ezi anyị gbasoburu mgbe anyị na-enweghị ihe ọmụma Chineke. (Ọrụ 3:19) Dị ka o doro anya, ọ bụrụ na anyị ka na-eme mmehie ụfọdụ ná nzuzo kama ime ihe ziri ezi, anyị a ka echigharịghị n’ezie, anyị aghọgbubeghịkwa Chineke. Jehova na-achọpụta ihu abụọ nile.—Luk 12:2, 3.
8. Olee ihe i kwesịrị ime mgbe ị chọrọ ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze?
8 Ugbu a ị nọworo na-anara ihe ọmụma Chineke, ọ̀ bụ na o kwesịghị ekwesị ịtụle ihe ime mmụọ dị iche iche n’ụzọ metụtara gị kpọmkwem? Ma eleghị anya ọ na-agụsi gị agụụ ike ịgwa ndị ikwu gị, ndị enyi gị, na ndị ọzọ ihe ị na-amụta. N’ezie, ị pụrụ ịdị na-emeworị nke a, ọbụna dị ka Jisọs so ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ n’ọnọdụ mberede dị iche iche. (Luk 10:38, 39; Jọn 4:6-15) Ugbu a ị pụrụ ịchọ ime karịa nke ahụ. Ndị okenye bụ́ ndị Kraịst ga-enwe obi ụtọ iso gị kwurịta okwu iji mata ma i ruru eru ma nwee ike ikere òkè ụfọdụ n’ọrụ nkwusa Alaeze Ndịàmà Jehova na-arụ mgbe nile. Ọ bụrụ na i ruwo, ndị okenye ga-eme ndokwa ka i sonyere otu Onyeàmà n’ozi. Ndị na-eso ụzọ Jisọs gbasoro ntụziaka ya dị iche iche iji jee ozi ha n’ụzọ dị n’usoro. (Mak 6:7, 30; Luk 10:1) Ị ga-erite uru site n’enyemaka yiri nke ahụ ka ị na-ekere òkè n’ịgbasa ozi Alaeze ahụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ na n’ụzọ ndị ọzọ.—Ọrụ 20:20, 21.
9. Olee otú mmadụ si eme nraranye nye Chineke, oleekwa ụzọ nraranye si emetụta ndụ mmadụ?
9 Ikwusa ozi ọma nye ụdị mmadụ nile n’ókèala ọgbakọ bụ ụzọ isi chọta ndị nwere obi ezi omume, o sokwa n’ọrụ ọma ndị na-anwapụta na i nwere okwukwe. (Ọrụ 10:34, 35; Jemes 2:17, 18, 26) Ịgachi nzukọ ndị Kraịst anya na ikere òkè bara uru n’ọrụ nkwusa ahụ bụkwa ụzọ isi gosipụta na i chegharịwo ma chigharịa ma kpebisie ike ugbu a ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ọmụma Chineke. Gịnị bụ nzọụkwụ nke na-esonụ nke ezi uche dị na ya? Ọ bụ ime nraranye nye Jehova Chineke. Nke a pụtara na n’ekpere sitere n’ala ala obi, ị ga-agwa Chineke na i ji ọchịchọ obi gị na obi gị dum na-enyefe ya ndụ gị ime ihe ọ na-achọ. Nke a bụ ụzọ isi rara onwe gị nye Jehova ma nakwere yoke na-adịghị egbu mgbu nke Jisọs Kraịst.—Matiu 11:29, 30.
BAPTISM—IHE Ọ PỤTARA NYE GỊ
10. N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji bụrụ onye e mere baptism mgbe ị rarasịịrị onwe gị nye Jehova?
10 Dị ka Jisọs kwuru, a ghaghị ime ndị nile ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya baptism. (Matiu 28:19, 20) N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa mgbe i mesịworo nraranye nye Chineke? Ebe ị rarawooro onwe gị nye Jehova, ọ maara na ị hụrụ ya n’anya. Ma ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-achọ imekwu ihe iji mee ka ndị ọzọ mara banyere ịhụnanya gị maka Chineke. Mgbe ahụ, baptism na-enye gị ohere ime ka ọha mmadụ mara nraranye gị nye Jehova Chineke.—Ndị Rom 10:9, 10.
11. Gịnị ka baptism pụtara?
11 Baptism bara ụba n’ihe ọ na-eme ihe atụ ya. Ka a na-emikpu, ma ọ bụ “na-eli,” gị n’ime mmiri, ọ bụ dị ka a ga-asị na ị nwụwo n’ihe banyere ụzọ ndụ gị na mbụ. Mgbe i si n’ime mmiri pụta, ọ bụ dị ka a ga-asị na ị na-abanye ná ndụ ọhụrụ, nke ihe Chineke na-achọ na-achịkwa, ọ bụghị ihe gị onwe gị na-achọ. Otú ọ dị, nke ahụ apụtaghị na ị gaghị ehiekwa ụzọ ọzọ, n’ihi na anyị nile bụ ndị na-ezughị okè, n’ihi ya anyị na-emehiekwa kwa ụbọchị. Otú ọ dị, dị ka ohu Jehova nke raara onwe ya nye, e meekwa ya baptism, gị na ya ga-abanyeworị ná mmekọrịta pụrụ iche. N’ihi nchegharị gị na gị iji obi dị umeala kwenye ka e mee gị baptism, Jehova dị njikere ịgbaghara mmehie gị ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs. Baptism si otú a na-eduga n’akọ na uche dị ọcha n’ihu Chineke.—1 Pita 3:21.
12. Gịnị ka ọ pụtara ịbụ onye e mere baptism (a) “n’aha nke Nna”? (b) ‘n’aha nke Ọkpara’? (ch) ‘n’aha nke Mmụọ Nsọ’?
12 Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu ime ndị ọhụrụ na-eso ụzọ baptism “n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ nsọ.” (Matiu 28:19) Gịnị ka Jisọs bu n’uche? Baptism “n’aha nke Nna” na-egosi na onye ahụ a na-eme baptism ga-eji obi ya dum nakwere Jehova Chineke dị ka Onye Okike na Ọkaaka ruru eru nke eluigwe na ala. (Abụ Ọma 36:9; 83:18; Eklisiastis 12:1) Ịbụ onye e mere baptism ‘n’aha nke Ọkpara’ pụtara na onye ahụ ga-anakwere Jisọs Kraịst—karịsịakwa àjà mgbapụta Ya—dị ka ụzọ e nwere nanị ya maka mgbapụta bụ́ nke Chineke mere ndokwa ya. (Ọrụ 4:12) Baptism ‘n’aha nke Mmụọ Nsọ’ na-egosi na onye a na-aga ime baptism ghọtara mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Jehova, dị ka ngwá ọrụ Chineke ji emezu nzube Ya nile na maka inye ndị ohu Ya ike ime ihe ezi omume ndị Ọ na-achọ n’ihe banyere nzukọ Ya mmụọ nsọ na-eduzi.—Jenesis 1:2; Abụ Ọma 104:30; Jọn 14:26; 2 Pita 1:21.
Ị̀ DỊ NJIKERE MAKA BAPTISM?
13, 14. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji tụọ egwu ịhọrọ ijere Jehova Chineke ozi?
13 Ebe baptism pụtara oké ihe otú a, bụrụkwa nzọụkwụ kasị mkpa ná ndụ mmadụ, ọ̀ bụ nzọụkwụ nke i kwesịrị ịtụ egwu? Ọ bụghị ma ọlị! Ọ bụ ezie na a gaghị eji mkpebi ịbụ onye e mere baptism gwurie egwu, ajụjụ ọ bụla adịghị ya na ọ bụ nke amamihe kasị dịrị na ya ị pụrụ iwere.
14 Baptism na-enye ihe àmà nke nhọrọ gị ijere Jehova Chineke ozi. Chee echiche banyere ndị ị na-ezute. N’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, ọ̀ bụ na nke ọ bụla n’ime ha enweghị onye nwe ya ọ na-ejere ozi? Ụfọdụ na-abụ ohu nye akụ̀. (Matiu 6:24) Ndị ọzọ ji ịdị uchu na-achụso ọrụ ha ma ọ bụ na-ejere onwe ha ozi site n’ime imeju ọchịchọ ndị nke onwe ha ihe kasị mkpa ná ndụ. Ndị ọzọkwa na-ejere chi ụgha dị iche iche ozi. Ma ị họrọwo ijere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova ozi. Ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ na-egosi obi ọma, ọmịiko, na ịhụnanya dị ukwuu dị ka ya. Chineke na-eji ọrụ nwere nzube nke na-eduga ha ná mgbapụta akwanyere ndị mmadụ ùgwù. Ọ na-eji ndụ ebighị ebi enyeghachi ndị ohu ya ụgwọ ọrụ. N’ezie, ịgbaso ihe nlereanya Jisọs na inye Jehova ndụ gị abụghị ụzọ nke a ga-atụ egwu ya. N’ezie, ọ bụ nanị ya bụ nke na-atọ Chineke ụtọ ma nwee isi n’ụzọ zuru okè.—1 Ndị Eze 18:21.
15. Olee ihe ụfọdụ na-egbochikarị baptism?
15 Ma, baptism abụghị nzọụkwụ a ga-ewere n’ihi nrụgide. Ọ bụ okwu dịịrị mmadụ n’etiti ya na Jehova. (Ndị Galetia 6:4) Ebe i nweworo ọganihu ime mmụọ, ị pụrụ ịjụwo sị: ‘Gịnị na-egbochi m ime baptism?’ (Ọrụ 8:35, 36) Ị pụrụ ịjụ onwe gị sị, ‘Mmegide ezinụlọ ọ̀ na-adọghachi m azụ? M̀ ka na-etinye aka n’ọnọdụ ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ na-emegide ma ọ bụ n’omume mmehie? Ọ̀ pụrụ ịbụ na ana m atụ egwu ịbụ onye na-enwekwaghị ihu ọma n’ógbè m?’ Ndị a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị a ga-atụle, ma tụlee ha site n’ezi uche.
16. Olee otú ị ga-esi rite uru site n’ijere Jehova ozi?
16 Ezi uche adịghị n’ịgba ọghọm ghara ịgba uru ndị dị n’ijere Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, tụlee okwu nke mmegide ezinụlọ. Jisọs kwere nkwa na ọbụna ma ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ ya enwee mfu nke ndị ikwu ha n’ihi iso ya n’azụ, ha ga-enweta ezinụlọ ime mmụọ ka ibu. (Mak 10:29, 30) Ndị a kwere ekwe ibe gị ga-egosi gị ịhụnanya ụmụnna, nyere gị aka ịnagide mkpagbu, ma kwado gị n’ụzọ na-eduba ná ndụ. (1 Pita 5:9) Karịsịa, ndị okenye ọgbakọ pụrụ inyere gị aka ịnagide nsogbu na imeri ihe ịma aka ndị ọzọ. (Jemes 5:14-16) Banyere enwekwaghị ihu ọma nke ụwa nke a, ị pụrụ nnọọ ịjụ onwe gị sị, ‘Gịnị ka a pụrụ iji tụnyere inwe nnwapụta nke Onye Okike nke eluigwe na ala, na-eme ka ọ ṅụrịa n’ihi ụzọ ndụ m họrọwooro?’—Ilu 27:11.
IBI NDỤ KWEKỌRỌ NÁ NRARANYE NA BAPTISM GỊ
17. N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji lee baptism anya dị ka mmalite kama ịbụ ọgwụgwụ?
17 Ọ dị mkpa icheta na baptism abụghị ọgwụgwụ nke ọganihu ime mmụọ gị. Ọ na-aka akara mmalite nke ogologo ndụ nke ijere Chineke ozi dị ka onye ozi a họpụtara ahọpụta na otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ezie na baptism dị oké mkpa, ọ bụghị ihe na-eme ka e jide nzọpụta n’aka. Jisọs asịghị: ‘Onye ọ bụla e mere baptism ka a ga-azọpụta.’ Kama, ọ sịrị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ya mere, ọ dị oké mkpa na i bu ụzọ chọọ Alaeze Chineke site n’ime ya ihe bụ isi nchegbu ná ndụ gị.—Matiu 6:25-34.
18. Mgbe baptism gasịrị, olee ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ a ga-achụso?
18 Iji nọgide n’ozi ị na-ejere Jehova, ị ga-achọ isetịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ dị iche iche. Otu ihe mgbaru ọsọ bara uru bụ ịga n’ihu n’ihe ọmụma gị nke Chineke site n’ọmụmụ ihe onwe onye nke Okwu ya mgbe nile. Mee atụmatụ maka ọgụgụ Bible kwa ụbọchị. (Abụ Ọma 1:1, 2) Na-aga nzukọ ndị Kraịst mgbe nile, n’ihi na mkpakọrịta ị ga-enweta n’ebe ahụ ga-enye aka inye gị ume ime mmụọ. N’akụkụ nke gị, gịnị ma i mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ịza ajụjụ ná nzukọ ọgbakọ wee si otú ahụ na-eto Jehova ma na-achọ iwulite ndị ọzọ elu? (Ndị Rom 1:11, 12) Ihe mgbaru ọsọ ọzọ pụrụ ịbụ ime ka ọdịdị nke ekpere gị ka mma.—Luk 11:2-4.
19. Àgwà dịgasị aṅaa ka mmụọ nsọ pụrụ inyere gị aka igosipụta?
19 Ọ bụrụ na ị ga-ebi ndụ kwekọrọ n’ihe baptism gị pụtara, ọ dị gị mkpa ileru ihe ị na-eme anya mgbe nile, na-ekwere ka mmụọ nsọ Chineke na-amịpụta n’ime gị àgwà ndị dị ka ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè. (Ndị Galetia 5:22, 23; 2 Pita 3:11) Cheta, Jehova na-enye ndị nile na-ekpe ekpere maka ya ma na-erubere ya isi dị ka ndị ohu ya mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13; Ọrụ 5:32) Ya mere kpegara Chineke ekpere maka mmụọ ya ma rịọ ya maka enyemaka n’igosipụta àgwà ndị na-atọ ya ụtọ. Àgwà ndị dị otú ahụ ga-apụtawanye ìhè n’okwu ọnụ na omume gị ka ị na-emeghachi omume n’ihi mmetụta nke mmụọ nsọ Chineke. Otú ọ dị, onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst na-agbalịsi ike ịzụlite “mmadụ ọhụrụ” ahụ ka o wee dịkwuo ka Kraịst. (Ndị Kọlọsi 3:9-14) Onye ọ bụla n’ime anyị na-eche ihe ịma aka dị iche iche ihu n’ime nke a n’ihi na anyị nọ n’ọnọdụ dị iche iche nke ọganihu ime mmụọ. Ebe ị na-ezughị okè, ị ghaghị ịrụsi ọrụ ike inwe ọdịdị yiri nke Kraịst. Ma obi adala gị mbà ma ọlị n’akụkụ nke a, n’ihi na o kwere omume site n’enyemaka Chineke.
20. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ị pụrụ iṅomi Jisọs n’ozi ahụ?
20 Iṅomi ihe nlereanya nke ọṅụ Jisọs n’ụzọ chiri anya karị kwesịrị ịbụ otu n’ime ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ gị nile. (Ndị Hibru 12:1-3) Ọ hụrụ ozi ahụ n’anya. Ọ bụrụ na i nwere ihe ùgwù nke ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, mgbe ahụ, ekwela ka ọ bụrụ ihe omume mmeghachi efu. Gbalịa inweta afọ ojuju n’ịkụziri ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke dị ka Jisọs mere. Tinye n’ọrụ ntụziaka ndị ọgbakọ na-enye iji nyere gị aka imeziwanye ihe dị ka onye nkụzi. Jidekwa n’aka na Jehova pụrụ inye gị ume ije ozi gị.—1 Ndị Kọrint 9:19-23.
21. (a) Olee otú anyị si mara na Jehova na-ewere ndị na-ekwesị ntụkwasị obi e mere baptism dị ka akụ̀? (b) Gịnị na-egosi na baptism dị mkpa maka nlanarị anyị ná mmezu ihe Chineke kpere n’ikpe n’isi ajọ usoro ihe nke a?
21 Onye raara onwe ya nye, nke e mere baptism nke ji ikwesị ntụkwasị obi na-agbalịsi ike iso Jisọs n’azụ pụrụ iche nye Chineke. Jehova na-enyocha obi ọtụtụ ijeri mmadụ nile ma mara otú ndị dị otú ahụ si dị ụkọ. Ọ na-ewere ha dị ka akụ̀, “ihe a na-achọsi ike.” (Hagaị 2:7) Amụma dị iche iche nke Bible na-egosi na Chineke na-ele ndị dị otú a anya dị ka ndị a kara akara ịlanarị mmezu ihe o kpere n’ikpe nke ga-abịakwasị ajọ usoro ihe nke a n’isi nso. (Ezikiel 9:1-6; Malakaị 3:16, 18) È ‘doro gị ịnata ndụ ebighị ebi’? (Ọrụ 13:48) Ọ̀ bụ ọchịchọ gị sitere n’obi ịbụ onye a kara akara dị ka onye na-ejere Chineke ozi? Nraranye na baptism bụ akụkụ nke akara ahụ, ha dịkwa mkpa maka nlanarị.
22. Olileanya dịgasị aṅaa ka “oké ìgwè mmadụ” ahụ pụrụ ịtụ anya ha?
22 Mgbe Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ gasịrị, Noa na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta banye n’ala e mere ka ọ dị ọcha. N’otu aka ahụ taa, “oké ìgwè mmadụ” ndị na-etinye ihe ọmụma Chineke n’ọrụ ná ndụ ha ma nweta nnwapụta Jehova nwere olileanya nke ịlanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe ọjọọ a na ịnụ ụtọ ndụ ebighị ebi n’ụwa e mere ka ọ dị ọcha ruo mgbe nile. (Mkpughe 7:9, 14) Gịnị ka ndụ ahụ ga-adị ka ya?
NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ
Olee otú Jehova si chọọ ka i jiri ihe ọmụma gị banyere ya na-eme ihe?
Olee nzọụkwụ ụfọdụ na-eduje na baptism?
N’ihi gịnị ka baptism na-ejighị bụrụ ọgwụgwụ kama mmalite?
Olee otú anyị pụrụ isi bie ndụ kwekọrọ ná nraranye na baptism anyị?
[Foto dị na peeji nke 172]
Ì mewo nraranye nye Chineke n’ekpere?
[Foto ndị dị na peeji nke 174]
Gịnị na-egbochi gị ịbụ onye e mere baptism?