Isi nke Iri na Abụọ
Ihe Baptizim Gị Pụtara
1. N’ihi gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iji nwee mmasị na baptizim ime mmiri?
N’AFỌ 29 O.A., e mere Jizọs baptizim, mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim mikpuru ya n’ime Osimiri Jọdan. Jehova n’onwe ya nọ na-ekiri ihe na-emenụ ma kwupụta nkwado ya. (Matiu 3:16, 17) Jizọs si otú a setịpụ ihe nlereanya nke ndị nile na-eso ụzọ ya ga-agbaso. Afọ atọ na ọkara ka e mesịrị, Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka a: “E nyewo m ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa. Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Matiu 28:18, 19) È mewo gị baptizim n’ikwekọ n’ihe Jizọs nyere n’iwu n’ebe ahụ? Ọ bụrụ na i mebeghị baptizim, ị̀ na-ejikere ime ya?
2. N’ihe banyere baptizim, ajụjụ dịgasị aṅaa ka ọ dị mkpa ka a zaa?
2 Ma è mewo gị baptizim ma ọ bụ na e mebeghị gị, ọ dị onye ọ bụla chọrọ ijere Jehova ozi ma dị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume ya mkpa ịghọta n’ụzọ doro anya ihe baptizim bụ. Ajụjụ ndị kwesịrị ka a zaa ha na-agụnye: Baptizim nke Ndị Kraịst na-eme taa na baptizim e mere Jizọs hà pụtara otu ihe? Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ” pụtara? Gịnị ka ịdị ndụ kwekọrọ n’ihe baptizim ime mmiri nke Ndị Kraịst pụtara na-agụnye?
Baptizim Ndị Jọn Mere
3. Ole ndị nanị ka baptizim Jọn mere dịịrị?
3 Ihe dị ka ọnwa isii tupu e mee Jizọs baptizim, Jọn Onye Na-eme Baptizim gara n’ala ịkpa nke Judia na-ekwusa, sị: “Chegharịanụ, n’ihi na alaeze nke eluigwe eruwo nso.” (Matiu 3:1, 2) Ndị mmadụ nụrụ ihe Jọn kwuru ma jiri ya mee ihe. Ha kwupụtara mmehie ha n’ihu ọha, chegharịa, wee bịakwutezie Jọn ka o mee ha baptizim n’Osimiri Jọdan. Baptizim ahụ bụ maka ndị Juu.—Luk 1:13-16; Ọrụ 13:23, 24.
4. N’ihi gịnị ka nchegharị ji dị ndị Juu nke narị afọ mbụ mkpa nke ukwuu?
4 Nchegharị dị ndị Juu ahụ mkpa nke ukwuu. N’Ugwu Saịnaị, n’afọ 1513 T.O.A., ndị nna nna ha sooro Jehova Chineke banye n’ọgbụgba ndụ—nkwekọrịta siri ike, nke e mere n’ihu ọha—dị ka otu mba. Ma n’ihi mmehie ha jọrọ nnọọ njọ, ha ebighị ndụ kwekọrọ n’ibu ọrụ dịịrị ha n’ọgbụgba ndụ ahụ, ya mere ọ mara ha ikpe. Ka ọ na-erule n’oge Jizọs, ọnọdụ ha ghọrọ nke dị oké njọ. “Oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova” nke Malakaị buru n’amụma dị nso. N’afọ 70 O.A., “ụbọchị” ahụ bịara mgbe ndị agha Rom bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya, gbuokwa ihe karịrị otu nde ndị Juu. E zipụrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim, bụ́ onye nwere ịnụ ọkụ n’obi maka ezi ofufe tupu mbibi ahụ ka o “jikeere Jehova ndị a kwadebere akwadebe.” Ọ dị mkpa ka ha chegharịa ná mmehie ha na-eme megide ọgbụgba ndụ Iwu Mozis ma dị njikere ịnabata Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, bụ́ onye Jehova na-ezitere ha.—Malakaị 4:4-6; Luk 1:17; Ọrụ 19:4.
5. (a) Mgbe Jizọs bịara ka e mee ya baptizim, gịnị mere Jọn jiri jụ? (b) Gịnị ka baptizim e mere Jizọs gosipụtara?
5 Jizọs n’onwe ya so ná ndị bịakwutere Jọn ka o mee ha baptizim. N’ihi gịnịkwanụ? Ebe ọ maara na Jizọs enweghị mmehie ọ bụla ọ ga-ekwupụta, Jọn sịrị: “Ọ bụ m ka ọ dị mkpa ka i mee baptizim, ọ̀ bụzi gị na-abịakwute m?” Ma baptizim e mere Jizọs gaje igosipụta ihe dị iche. Ya mere Jizọs zara ya, sị: “Ka ọ dị otú a, n’oge a, n’ihi na otú ahụ ka o kwesịrị ekwesị ka anyị wee mezuo ihe nile bụ ezi omume.” (Matiu 3:13-15) N’ihi na Jizọs emeghị mmehie, baptizim ya abụghị ngosipụta nke nchegharị n’ihi mmehie; ọ dịghịkwa ya mkpa ịrara onwe ya nye Chineke, ebe o so ná mba a rarawoororị nye Jehova. Kama nke ahụ, baptizim e mere ya mgbe ọ dị afọ 30 bụ nanị ya ka e mere ụdị ahụ, ọ bụkwa ngosipụta nke inye Nna ya nke eluigwe onwe ya iji mee uche Ya ndị ọzọ.
6. Olee otú Jizọs jiruru ime ihe bụ́ uche Chineke maka ya kpọrọ ihe?
6 Uche Chineke maka Kraịst Jizọs gụnyere ọrụ metụtara Alaeze ahụ. (Luk 8:1) Ọ gụnyekwara iji ndụ ya dị ka mmadụ zuru okè chụọ àjà dị ka ihe mgbapụta nakwa dị ka ihe ndabere maka ọgbụgba ndụ ọhụrụ. (Matiu 20:28; 26:26-28; Ndị Hibru 10:5-10) Jizọs jiri ihe baptizim ya n’ime mmiri gosipụtara kpọrọ ihe nke ukwuu. O kweghị ka a dọpụ uche ya gaa n’ihe ndị ọzọ. Ruo ná ngwụsị nke ndụ ya n’elu ala, ọ rapagidesiri ike n’ime uche Chineke, mee ka ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụrụ ọrụ bụ́ isi ọ rụrụ.—Jọn 4:34.
Baptizim Ime Mmiri nke Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Na-eso Ụzọ
7. Kemgbe Pentikọst 33 O.A., gịnị ka a gwara Ndị Kraịst ka ha na-eme n’ihe metụtara baptizim?
7 Jọn mere ndị mbụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs baptizim n’ime mmiri ma duzie ha gaa n’ebe Jizọs nọ dị ka ndị gaje ịbụ ndị òtù nke Alaeze eluigwe. (Jọn 3:25-30) N’ịgbaso nduzi Jizọs, ndị a na-eso ụzọ ya mekwara ụfọdụ ndị baptizim, bụ́ nke ya na baptizim Jọn pụtara otu ihe ahụ. (Jọn 4:1, 2) Otú ọ dị, malite na Pentikọst 33 O.A., ha malitere ịrụ ọrụ ahụ bụ́ ime baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Matiu 28:19) Ọ ga-abara gị nnọọ uru ịtụleghachi ihe nke ahụ pụtara.
8. Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim “n’aha nke Nna” pụtara?
8 Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim “n’aha nke Nna” pụtara? Ọ pụtara ịnakwere aha ya, ọkwá ya, ikike ya, nzube ya, na iwu ya. Chee echiche ihe nke a gụnyere. (1) Banyere aha ya, Abụ Ọma 83:18 na-asị: “Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (2) Banyere ọkwá ya, 2 Ndị Eze 19:15 na-ekwu, sị: “Jehova . . . , Gị onwe gị bụ [ezi] Chineke, nanị Gị.” (3) Banyere ikike ya, Mkpughe 4:11 na-agwa anyị, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, ọbụna Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na i kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha ji dịrị, ka e jikwa kee ha.” (4) Anyị aghaghịkwa ikweta na Jehova bụ Onye Na-enye Ndụ, onye na-ezube ịzọpụta anyị ná mmehie na ọnwụ: “Jehova nwe nzọpụta.” (Abụ Ọma 3:8; 36:9) (5) Ọ dị anyị mkpa ikweta na Jehova bụ Onye Kachasịnụ nke Na-enye Iwu: “Jehova bụ onyeikpe anyị, Jehova bụ onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ eze anyị.” (Aịsaịa 33:22) N’ihi na ọ bụ ihe ndị ahụ nile, a na-agba anyị ume, sị: “Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”—Matiu 22:37.
9. Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim “n’aha . . . nke Ọkpara” pụtara?
9 Gịnị ka baptizim “n’aha . . . nke Ọkpara” pụtara? Ọ pụtara ịmata aha, ọkwá, na ikike Jizọs Kraịst. Aha ya, nke bụ́ Jizọs, pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” O nwetara ọkwá ya site n’eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, onye nke mbụ n’ihe nile Chineke kere. (Matiu 16:16; Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Banyere Ọkpara a, Jọn 3:16 na-agwa anyị, sị: “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta] n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” N’ihi na Jizọs nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi, Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ ma nye ya ikike ọhụrụ. Dị ka Pọl onyeozi si kwuo, Chineke “buliri [Jizọs] gaa n’ọkwá ka elu” n’eluigwe na ala, nke ọ bụ nanị nke Jehova karịrị ya. Ọ bụ ya mere “ikpere ọ bụla [ga-eji] gbuo n’ala n’aha Jizọs . . . ire ọ bụla ekwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.” (Ndị Filipaị 2:9-11) Nke a pụtara irube isi n’iwu Jizọs nyere, bụ́ ndị si n’aka Jehova n’onwe ya.—Jọn 15:10.
10. Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim “n’aha . . . nke mmụọ nsọ” pụtara?
10 Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim “n’aha . . . nke mmụọ nsọ” pụtara? Ọ pụtara ịmata ọrụ mmụọ nsọ na-arụ. Gịnịkwanụ bụ mmụọ nsọ? Ọ bụ ike Jehova nke nọ n’ọrụ, bụ́ nke o ji emezu nzube ya. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “M ga-arịọkwa Nna ahụ, ọ ga-enyekwa unu ihe inyeaka ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ.” (Jọn 14:16, 17) Gịnị ka nke a ga-eme ka ha nwee ike ime? Jizọs gwakwuru ha, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-agbakwa àmà banyere m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria dum nakwa ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Jehova jikwa mmụọ nsọ ahụ kpalie odide Bible: “Ọ dịghị mgbe e sitere n’uche mmadụ buo amụma, kama ndị mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.” (2 Pita 1:21) Ya mere anyị na-egosi na anyị matara ọrụ mmụọ nsọ ahụ na-arụ mgbe anyị na-amụ Bible. Ụzọ ọzọ anyị si egosi na anyị matara ọrụ nke mmụọ nsọ ahụ bụ site n’ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịmịpụta “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” ahụ, nke bụ́ “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.”—Ndị Galeshia 5:22, 23.
11. (a) Gịnị ka baptizim pụtara n’ezie n’oge anyị a? (b) Olee otú baptizim si yie ịnwụ na ịbụ onye e si n’ọnwụ kpọlite?
11 Ndị mbụ e mere baptizim n’ikwekọ ná ntụziaka Jizọs bụ ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu, malite n’afọ 33 O.A. Ntakịrị oge ka e mesịrị, e nyere ndị Sameria ihe ùgwù nke ịbụ Ndị Kraịst na-eso ụzọ. Mgbe ahụ, n’afọ 36 O.A., òkù ahụ gbasara wee gụnye ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù. Tupu e mee ha baptizim, ndị Sameria na ndị Jentaịl ahụ aghaghị ịrara onwe ha nye Jehova ijere ya ozi dị ka ndị na-eso ụzọ Ọkpara ya. Nke a nọgidere na-abụ ihe baptizim ime mmiri nke Ndị Kraịst na-egosipụta ruo n’oge anyị a. Mmikpu kpam kpam n’ime mmiri bụ ihe atụ dabara adaba nke nrara a mmadụ na-arara onwe ya nye, ebe baptizim bụ ili mmadụ n’ụzọ ihe atụ. Imikpu gị n’ime mmiri e ji na-eme gị baptizim na-anọchite anya gị ịnwụ n’ihe banyere ụzọ ndụ gị na mbụ. Ịbụ onye e si n’ime mmiri wepụta bụ ihe atụ nke ime ka ị dị ndụ ime uche Chineke. “Otu baptizim” a dịịrị ndị nile na-aghọ ezi Ndị Kraịst. N’oge baptizim ha, ha na-aghọ Ndịàmà Jehova bụ́ Ndị Kraịst, ndị ozi Chineke họpụtara.—Ndị Efesọs 4:5; 2 Ndị Kọrint 6:3, 4.
12. Na gịnị ka baptizim ime mmiri nke Ndị Kraịst kwekọrọ, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
12 Baptizim dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke n’ịzọpụta ndụ. Dị ka ihe atụ, mgbe o hotasịrị owuwu Noa wuru ụgbọ, bụ́ nke e chebere ya na ezinụlọ ya n’ime ya gabiga Iju Mmiri ahụ, Pita onyeozi dere, sị: “Ihe ahụ nke kwekọrọ na nke a na-azọpụtakwa unu ugbu a, ya bụ, baptizim, (ọ bụghị iwepụ unyi nke anụ ahụ́, kama arịrịọ a na-arịọ Chineke maka ezi akọ na uche,) site ná mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraịst.” (1 Pita 3:21) Ụgbọ ahụ bụ ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ na-egosi na Noa ji ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ Chineke nyere ya. Mgbe ọrụ iwu ụgbọ ahụ gasịrị, “ụwa nke oge ahụ bịara ná mbibi mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya.” (2 Pita 3:6) Ma e buuru Noa na ezinụlọ ya, ya bụ, “mkpụrụ obi asatọ, gabiga na mmiri ahụ n’enweghị mmerụ ahụ́.”—1 Pita 3:20.
13. Pụọ na gịnị ka a na-azọpụta Onye Kraịst site na baptizim ime mmiri?
13 Taa, a na-eme ndị na-arara onwe ha nye Jehova na-adabere n’okwukwe ha nwere na Kraịst ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie baptizim ná ngosipụta nke nraranye ahụ. Ha na-aga n’ihu n’ime uche Chineke maka oge anyị a, a na-azọpụtakwa ha pụọ n’ajọ ụwa a. (Ndị Galeshia 1:3, 4) Ha adịghịzi eso ajọ usoro ihe dị ugbu a eche ihu ná mbibi. A na-azọpụta ha pụọ na nke a, Chineke na-enyekwa ha ezi akọ na uche. Jọn onyeozi na-emesi ndị ohu Chineke obi ike, sị: “Ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.
Ịrụzu Ọrụ Dịịrị Anyị
14. N’ihi gịnị ka nanị baptizim na-ejighị eme ka nzọpụta bụrụ ihe e ji n’aka?
14 Ọ ga-abụ ihie ụzọ bụ ikwubi na nanị baptizim na-eme ka nzọpụta bụrụ ihe e ji n’aka. Ọ bara uru nanị ma ọ bụrụ na mmadụ ararawo onwe ya n’ezie nye Jehova site na Jizọs Kraịst ma na-eme uche Chineke malite mgbe ahụ gaa n’ihu, nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ. “Onye tachiworo obi ruo ọgwụgwụ bụ onye a ga-azọpụta.”—Matiu 24:13.
15. (a) Gịnị bụ uche Chineke taa maka Ndị Kraịst e mere baptizim? (b) Olee otú ịbụ Onye Kraịst na-eso ụzọ kwesịrị ịdịru mkpa ná ndụ anyị?
15 Uche Chineke maka Jizọs gụnyere otú o siri jiri ndụ ya mee ihe mgbe ọ bụ mmadụ. A gaje ịtọgbọ ya n’ọnwụ dị ka àjà. N’ihe banyere anyị, a gaje iche ahụ́ anyị n’ihu Chineke, anyị ga na-adịkwa ndụ nke ịchụ onwe onye n’àjà site n’ime uche Chineke. (Ndị Rom 12:1, 2) N’ezie anyị agaghị na-eme uche Chineke ma ọ bụrụ na anyị amara ụma na-akpa àgwà ka ụwa nke gbara anyị gburugburu, ọ bụrụgodị na ọ bụ mgbe ụfọdụ, ma ọ bụ ọ bụrụ na anyị emee ka ndụ anyị hiwe isi ná nchụso ọdịmma onwe onye nanị, na-ejere Chineke ozi nanị iji mezuo iwu. (1 Pita 4:1-3; 1 Jọn 2:15, 16) Mgbe otu onye Juu jụrụ ihe ọ na-aghaghị ime iji nweta ndụ ebighị ebi, Jizọs kwetara na ọ dị mkpa ịdị ndụ dị ọcha. Ma o zoziri aka n’ihe kadị mkpa: mkpa ọ dị ịbụ Onye Kraịst na-eso ụzọ, onye na-eso ụzọ Jizọs. Nke ahụ aghaghị ịbụ ihe mbụ ná ndụ. Nchụso ihe onwunwe agaghị ebutere ya ụzọ.—Matiu 19:16-21.
16. (a) Ọrụ dị aṅaa ka Ndị Kraịst nile nwere n’ihe metụtara Alaeze ahụ? (b) Dị ka e gosiri na peeji nke 116 na nke 117, olee ụzọ ụfọdụ ndị dị irè nke isi rụọ ọrụ Alaeze ahụ? (ch) Òkè anyị ji obi anyị dum na-ekere n’ọrụ ịgba àmà ahụ na-enye ihe àmà dị aṅaa?
16 E kwesịrị imesi ya ike ọzọ na uche Chineke maka Jizọs gụnyere ọrụ dị mkpa n’ihe metụtara Alaeze Chineke. E tere Jizọs n’onwe ya mmanụ ịbụ Eze. Ma n’oge ọ nọ n’ụwa, o jikwa ịnụ ọkụ n’obi gbaa àmà banyere Alaeze ahụ. Anyị nwere ọrụ ịgba àmà yiri ya, anyị nwekwara ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji jiri obi anyị dum na-arụ ya. Site n’ime otú ahụ, anyị na-egosipụta ekele anyị nwere maka ọbụbụeze Jehova tinyere ịhụnanya anyị maka ụmụ mmadụ ibe anyị. (Matiu 22:36-40) Anyị na-egosikwa na anyị na ndị anyị na ha na-efekọ ofufe n’ụwa nile dị n’otu, bụ́ ndị bụcha ndị mkpọsa Alaeze ahụ. N’ịdị n’otu zuru ụwa ọnụ, anyị nile jikọrọ aka na-agbalịsi ike iru ihe mgbaru ọsọ ahụ bụ́ ndụ ebighị ebi n’ógbè ụwa nke Alaeze ahụ.
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• Olee myirịta, oleekwa ọdịiche ndị dị n’agbata baptizim e mere Jizọs na baptizim ime mmiri taa?
• Gịnị ka ịbụ onye e mere baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ” pụtara?
• Gịnị ka imezu ibu ọrụ nke baptizim ime mmiri nke Ndị Kraịst gụnyere?
[Foto ndị dị na peeji nke 116, 117]
ỤZỌ ỤFỌDỤ NKE ISI KPỌSAA ALAEZE AHỤ
Site n’ụlọ ruo n’ụlọ
Nye ndị ikwu anyị
Nye ndị ọrụ ibe anyị
Nye ụmụ akwụkwọ ibe anyị
N’okporo ámá
Site n’ịgaghachi leta ndị nwere mmasị
N’ọmụmụ Bible ebe obibi