Isi nke Iri na Atọ
Oké Ìgwè Mmadụ Ndị Nọ n’Ihu Ocheeze Jehova
1. (a) Tupu ndị ohu Chineke dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst ma ọ bụ 144,000 ahụ anata ụgwọ ọrụ ha, olee ihe na-aghaghị ime ha? (b) Olee ihe ga-ekwe omume nye “oké ìgwè mmadụ” ahụ ndị dị ndụ ugbu a?
NDỊ ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi malite n’Ebel ruo na Jọn Onye Na-eme Baptizim mere ka ime uche Chineke bụrụ ihe mbụ ná ndụ ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ha nile nwụrụ, na-echere mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ịdị ndụ n’elu ala n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke. Mmadụ 144,000, bụ́ ndị ga-eso Kraịst chịa n’Alaeze eluigwe nke Chineke, aghaghịkwa ịnwụ tupu ha enwee ike ịnata ụgwọ ọrụ ha. Otú ọ dị, Mkpughe 7:9 na-egosi na, n’ụbọchị ikpeazụ ndị a, a ga-enwe “oké ìgwè mmadụ” ndị si ná mba nile bụ́ ndị na-agaghị anwụ kama ha ga-enwe ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala. Ì so n’ime ha?
Ịmata Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ
2. Olee ihe ndị mere tupu a ghọta n’ụzọ doro anya ndị bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ nke Mkpughe 7:9?
2 Na 1923, ndị ohu Jehova ghọtara na “atụrụ” ahụ dị n’ilu Jizọs nke dị na Matiu 25:31-46 na “atụrụ ọzọ” ahụ o zoro aka na ha dị ka e dekọrọ ya na Jọn 10:16 bụ ndị ga-enwe ohere ịdị ndụ n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi. Na 1931, a hụkwara na ndị ahụ a kọwara n’Ezikiel 9:1-11 dị ka ndị a kara akara n’egedege ihu bụ ndị nwere olileanya ịdị ndụ n’elu ala. Mgbe ahụ, na 1935, a matara na oké ìgwè mmadụ ahụ bụ akụkụ nke òtù atụrụ ọzọ ahụ Jizọs kwuru maka ya. Taa, oké ìgwè mmadụ a e meere amara eruwo ọtụtụ nde.
3. N’ihi gịnị ka okwu ahụ bụ́ “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ” na-ejighị ezo aka n’òtù ga-aga eluigwe?
3 Ná Mkpughe 7:9, a hụghị oké ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọ n’eluigwe. Ha ‘iguzo n’ihu ocheeze’ Chineke apụtaghị na ha ga-anọ n’eluigwe. Ọ bụ nanị na ha nọ n’ebe Chineke na-ahụ ha. (Abụ Ọma 11:4) E gosipụtara eziokwu ahụ bụ́ na oké ìgwè mmadụ ahụ “nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ” abụghị òtù ga-aga eluigwe site n’iji ọnụ ọgụgụ ha a na-akapịghị ọnụ tụnyere ihe e dere ná Mkpughe 7:4-8 na Mkpughe 14:1-4. N’ebe ahụ, e kpughere na ọnụ ọgụgụ ndị e si n’ụwa were gaa eluigwe dị 144,000.
4. (a) Gịnị bụ ‘oké mkpagbu ahụ’ oké ìgwè mmadụ ahụ dị ndụ gabiga? (b) Dị ka e kwuru ná Mkpughe 7:11, 12, olee ndị na-ekiri oké ìgwè mmadụ ahụ ma sonyere ha n’ofufe?
4 Mkpughe 7:14 na-ekwu banyere oké ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ndị a bụ ndị si n’oké mkpagbu ahụ na-apụta.” Ha dị ndụ gabiga nsogbu kasị njọ e nwetụworo n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. (Matiu 24:21) Mgbe ha ga-eji obi ekele na-ekwu na nzọpụta ha sitere n’aka Chineke na Kraịst, mgbe ahụ, ihe nile e kere eke na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’eluigwe ga-esonyere ha n’ikwu, sị: “Amen! Ka ngọzi na otuto na amamihe na ekele na nsọpụrụ na ike na ume dịrị Chineke anyị ruo mgbe nile ebighị ebi. Amen.”—Mkpughe 7:11, 12.
Igosipụta na Ha Ruru Eru
5. Olee otú anyị pụrụ isi mata ihe a chọrọ iji soro n’oké ìgwè mmadụ ahụ?
5 Ichebe oké ìgwè mmadụ ahụ gabiga oké mkpagbu ahụ ga-ewere ọnọdụ n’ikwekọ n’ụkpụrụ ezi omume Jehova. A tụlere àgwà ndị e ji amata ndị a ga-anapụta n’ụzọ doro anya n’ime Bible. N’ihi ya, ọ ga-ekwe ndị hụrụ ezi omume n’anya omume ime ihe ugbu a iji gosipụta na ha ruru eru ịlanarị. Gịnị ka ha na-aghaghị ime?
6. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji jiri oké ìgwè mmadụ ahụ tụnyere atụrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị?
6 Atụrụ na-adị nwayọọ ma na-erube isi. Ya mere, mgbe Jizọs sịrị na ya nwere atụrụ ọzọ ndị na-esoghị n’òtù ga-aga eluigwe, o bu n’uche ndị, ọ bụghị nanị na ha ga-achọ ịdị ndụ n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi kamakwa ga na-erube isi n’ozizi ya. “Atụrụ m na-ege ntị n’olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m.” (Jọn 10:16, 27) Ndị a bụ ndị na-ege Jizọs ntị n’ezie ma jiri nrubeisi na-eme ihe o kwuru, na-aghọ ndị na-eso ụzọ ya.
7. Àgwà dịgasị aṅaa ka ọ dị ụmụazụ Jizọs mkpa ịzụlite?
7 Olee àgwà ndị ọzọ ọ dị mkpa ka onye ọ bụla n’ime ndị a na-eso ụzọ Jizọs zụlite? Okwu Chineke na-aza, sị: “[Yipụnụ] ụdị mmadụ ochie ahụ bụ́ nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga, . . . [yikwasịkwanụ] ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” (Ndị Efesọs 4:22-24) Ha na-azụlite àgwà ndị na-akwalite ịdị n’otu nke ndị ohu Chineke—“ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.”—Ndị Galeshia 5:22, 23.
8. Gịnị ka oké ìgwè mmadụ ahụ ga-enweta ka ha na-akwado ihe ahụ fọdụrụnụ?
8 Oké ìgwè mmadụ ahụ na-akwado ndị ahụ nwere olileanya ịga eluigwe bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha dị nta, ndị na-ebute ụzọ n’ọrụ nkwusa ahụ. (Matiu 24:14; 25:40) Atụrụ ọzọ ahụ na-enye nkwado a, ọ bụ ezie na ha maara na ha ga-enweta mmegide n’ihi na, ná mmalite nke ụbọchị ikpeazụ ndị a, Kraịst Jizọs na ndị mmụọ ozi ya chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe. Nke a pụtara na “ahụhụ ga-adịrị ụwa . . . n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:7-12) N’ihi ya, Setan na-eme ka mmegide ọ na-emegide ndị ohu Chineke ka ọgwụgwụ usoro ihe a na-eru nso ka njọ.
9. Olee otú ndị ohu Chineke nweruru ihe ịga nke ọma n’ikwusa ozi ọma ahụ, n’ihi gịnịkwa?
9 N’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ, ọrụ nkwusa ahụ nọgidere na-aga n’ihu. Malite na nanị puku ndị nkwusa Alaeze ole na ole e nwere mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, e nwere ọtụtụ nde ugbu a, n’ihi na Jehova kwere nkwa, sị: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma.” (Aịsaịa 54:17) Ọbụna otu onye so n’ụlọikpe dị elu nke ndị Juu matara na a pụghị ịkwụsị ọrụ Chineke. Ọ gwara ndị Farisii na narị afọ mbụ banyere ndị na-eso ụzọ, sị: “Hapụnụ ha; (n’ihi na, ọ bụrụ na atụmatụ a ma ọ bụ ọrụ a sitere n’aka mmadụ, a ga-eme ka ọ daa; ma ọ bụrụ na o sitere n’aka Chineke, unu agaghị enwe ike ime ka ha daa;) ma ọ bụghị ya, a pụrụ ịhụ, ma eleghị anya, na unu bụ n’ezie ndị na-alụso Chineke ọgụ.”—Ọrụ 5:38, 39.
10. (a) Gịnị ka “akara” ahụ a kara ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ pụtara? (b) Olee otú ndị ohu Chineke si erube isi ‘n’olu ahụ sitere n’eluigwe’?
10 E gosiri ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ dị ka ndị a kara akara maka nlanarị. (Ezikiel 9:4-6) “Akara” ahụ bụ ihe àmà na-egosi na ha raara onwe ha nye Jehova, bụrụ ndị e mere baptizim dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs, na-agbalịsikwa ike ịzụlite àgwà yiri nke Kraịst. Ha na-erube isi ‘n’olu ahụ sitere n’eluigwe’ nke na-ekwu banyere alaeze ụwa Setan nke okpukpe ụgha, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya, nakwa ma ọ bụrụ na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.”—Mkpughe 18:1-5.
11. N’ụzọ dị aṅaa dị mkpa ka ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ si egosipụta na ha bụ ndị ohu Jehova?
11 Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ndị nọ n’okpukpe dị iche iche nke ụwa a na-egburịta ibe ha n’agha, ọtụtụ mgbe nanị n’ihi na ha si ná mba dị iche! Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ụmụ Chineke na ụmụ Ekwensu pụtara ìhè site n’eziokwu a: Onye ọ bụla nke na-adịghị anọgide na-eme ezi omume esiteghị na Chineke, otú ahụ ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya. . . . Anyị kwesịrị inwe ịhụnanya maka ibe anyị; ọ bụghị dị ka Ken, onye sitere n’ajọ onye ahụ ma gbuo nwanne ya.”—1 Jọn 3:10-12.
12. N’oké mkpagbu ahụ, gịnị ka Jehova ga-eme “osisi” okpukpe ndị na-amịpụta mkpụrụ na-abaghị uru?
12 Jizọs kwuru, sị: “Osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ, ma osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru; osisi ọma apụghị ịmị mkpụrụ na-abaghị uru, osisi rere ure apụghịkwa ịmị ezi mkpụrụ. A na-egbutu osisi ọ bụla na-adịghị amị ezi mkpụrụ ma tụba ya n’ime ọkụ. Ya mere, n’ezie unu ga-amata ndị ahụ site ná mkpụrụ ha.” (Matiu 7:17-20) Mkpụrụ okpukpe dị iche iche nke ụwa a na-amịpụta na-eme ka a mata ha dị ka “osisi” ndị rere ure, ndị Jehova ga-ebibi n’isi nso n’oké mkpagbu ahụ.—Mkpughe 17:16.
13. Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ si egosi na ha “na-eguzo n’ihu ocheeze” Jehova n’ịdị n’otu?
13 Mkpughe 7:9-15 na-adọrọ uche gaa n’isi ihe ndị na-eduga ná nchebe nke oké ìgwè mmadụ ahụ. E gosiri ha ebe ha “na-eguzo n’ihu ocheeze” Jehova n’ịdị n’otu, na-akwado ọbụbụeze eluigwe na ala ya. Ha “asawokwa uwe mwụda ha ma mee ka ha na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ,” bụ́ nke na-egosi na ha kwetara n’àjà mkpuchi mmehie nke Jizọs. (Jọn 1:29) Ha ararawo onwe ha nye Chineke ma gosipụta nke a site n’ịbụ ndị e mikpuru n’ime mmiri. N’ihi ya, ha dị ọcha n’anya Chineke, bụ́ nke uwe mwụda ahụ na-acha ọcha sere onyinyo ya, ha “na-ejekwara ya ozi dị nsọ ehihie na abalị.” Ọ̀ dị ụzọ ndị ị pụrụ isi mee ka ndụ gị kwekọkwuo n’ihe a kọwara n’ebe a?
Uru Ndị Ha Na-erite Ugbu A
14. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime uru ndị pụrụ iche ndị ohu Jehova na-erite ọbụna ugbu a?
14 Ma eleghị anya ị hụwo uru ndị pụrụ iche ndị na-ejere Jehova ozi na-erite ọbụna ugbu a. Dị ka ihe atụ, mgbe ị bịara mata banyere nzube ezi omume nke Jehova, ị ghọtara na e nwere olileanya magburu onwe ya maka ọdịnihu. Ya mere, ugbu a, i nwere ezi nzube ná ndụ—ijere ezi Chineke ahụ ozi n’atụmanya na-enye ọṅụ nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Ee, Eze Jizọs Kraịst “ga-edugakwa [oké ìgwè mmadụ ahụ] n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.”—Mkpughe 7:17.
15. Olee otú Ndịàmà Jehova si erite uru n’ịgbaso ụkpụrụ Bible n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na omume?
15 Uru magburu onwe ya oké ìgwè mmadụ ahụ na-erite bụ ịhụnanya, ịdị n’otu, na nkwekọrịta nke a na-ahụ n’etiti ndị ohu Jehova n’ụwa nile. Ebe anyị nile na-eri otu nri ime mmụọ ahụ, anyị nile na-erube isi n’otu iwu na ụkpụrụ ndị ahụ a na-achọta n’Okwu Chineke. Ọ bụ ya mere na echiche nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ mba adịghị ekewa anyị. Ọzọkwa, anyị na-anọgide na-agbaso ụkpụrụ omume dị elu ndị Chineke chọrọ n’aka ndị ya. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) N’ihi ya, kama inwe esemokwu, adịghị n’otu, na omume rụrụ arụ nke jupụtara n’ụwa, ndị Jehova nwere ihe a pụrụ ịkpọ paradaịs ime mmụọ. Rịba ama otú e si kọwaa nke a n’Aịsaịa 65:13, 14.
16. N’agbanyeghị nsogbu ndị a na-enwekarị ná ndụ, ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ nwere olileanya dị aṅaa?
16 Ee e, ndị ohu Jehova bụ́ mmadụ ezughị okè. Nsogbu ndị a na-enwekarị ná ndụ a na-adị n’ime ụwa a, dị ka inwe ihe isi ike ma ọ bụ ịbụ ndị e gburu n’agha nke mba dị iche iche n’enweghị ihe ha mere, na-emetụtakwa ha. Ha na-arịakwa ọrịa, na-enwe nhụjuanya, ma na-anwụ anwụ. Ma ha nwere okwukwe na n’ime ụwa ọhụrụ, Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:4.
17. N’agbanyeghị ihe pụrụ ime anyị ugbu a, ọdịnihu dị aṅaa dị ebube na-echere ndị na-efe ezi Chineke ahụ ofufe?
17 Ọ bụrụgodị na ị nwụọ ugbu a n’ihi ime agadi, ọrịa, ihe mberede, ma ọ bụ mkpagbu, Jehova ga-eme ka i si n’ọnwụ bilie ịdị ndụ n’ime Paradaịs. (Ọrụ 24:15) Mgbe ahụ, ị ga-anọgide na-anụ ụtọ oriri ime mmụọ ahụ n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst. Ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ ga-ebukwu ibu ka ị na-ahụ ka nzube ya na-enwe mmezu dị ebube. Ngọzi dị iche iche a na-ahụ anya Jehova ga-enye mgbe ahụ ga-eme ka ịhụnanya i nwere n’ebe ọ nọ bukwuo ibu. (Aịsaịa 25:6-9) Lee ọdịnihu dị ebube na-echere ndị Chineke!
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• Ihe omume dị aṅaa nke dị ịrịba ama ka Bible na-ejikọta ya na oké ìgwè mmadụ ahụ?
• Ọ bụrụ na anyị chọrọ n’ezie ka a gụnye anyị n’oké ìgwè mmadụ ahụ Chineke meere amara, gịnị ka anyị na-aghaghị ime ugbu a?
• Olee otú ngọzi oké ìgwè mmadụ ahụ na-enweta ugbu a na ndị ha ka ga-enweta n’ime ụwa ọhụrụ Chineke dịruru gị mkpa?
[Foto dị na peeji nke 123]
Ọtụtụ nde ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ na-efe ezi Chineke ahụ ofufe n’ịdị n’otu