Ndị Ntorobịa—Gịnị Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Unu?
1 Jehova maara ụzọ ọrụ nwere nzube na ihe mgbaru ọsọ a pụrụ iru eru si dị mkpa n’iweta obi ụtọ. (Lee Jenesis 1:28; 2:15, 19.) Taa, Jehova enyewo ndị ya ọrụ ime nkwusa na izi ihe. Anyị nwekwara ihe mgbaru ọsọ ikpeazụ nke inweta ndụ ebighị ebi na Paradaịs. Ka ọ dị ugbu a, ọ dị anyị mkpa isetịpụ ihe mgbaru ọsọ na-aga n’ihu n’ihu ma ọ bụrụ na anyị ga-ezere iche ume na ihe onwunwe anyị ihu n’ebe na-ekwesịghị ekwesị.—1 Kọr. 9:26.
2 Ihe Mgbaru Ọsọ Ezi Uche Dị na Ha Maka Ndị Na-eto Eto: Ndị ntorobịa kwesịrị inwe ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke ndị a pụrụ iru dị ka ikike ha n’otu n’otu si dị. (1 Tim. 4:15) Ụfọdụ ndị ka bụ nnọọ nwata eruwo ihe mgbaru ọsọ nke ịkpọ aha akwụkwọ Bible nile n’isi ọbụna tupu ha amụta ịgụ ihe. Site n’ọmụmụ ihe ezinụlọ, ụmụaka na-amụta ịkwadebe maka nzukọ ka ha nwee ike iru ihe mgbaru ọsọ nke ịza azịza ndị bara uru na idenye aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Mgbe ụmụaka na-esonyere ndị mụrụ ha n’ozi ubi, ha na-amụta ikere òkè n’ịgba àmà ka ha na-enwe ọganihu n’iru ihe mgbaru ọsọ nke ịghọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptism. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị idebe n’ihu obere ụmụaka ha ihe mgbaru ọsọ nke nraranye na baptism.
3 Ọ bụrụ na ị nọ n’afọ iri na ụma, gịnị ka ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ gị gụnyere? “Chetakwa Onye keworo gị” site n’ilekwasị anya n’ihe mgbaru ọsọ ndị dị mkpa n’ezie ná ndụ. (Ekli. 12:1; Abụ Ọma 71:17) Gịnị ma ị sụọ ụzọ inyeaka n’ọnwa ndị i nwere oge ezumike ụlọ akwụkwọ? Ì chewo echiche banyere iwere ozi ahụ oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile? Gịnị banyere ịmụta asụsụ ọhụrụ ka ọ ga-abụ n’ọdịnihu ị pụrụ inyere ìgwè na-asụ asụsụ ọzọ ma ọ bụ ọgbakọ dị n’ógbè unu ma ọ bụ n’ebe ọzọ aka? Ọtụtụ ndị na-eje ozi ugbu a na Betel ma ọ bụ dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ma ọ bụ ndị ozi ala ọzọ setịpụrụ ozi oge nile pụrụ iche dị ka ihe mgbaru ọsọ ha mgbe ha ka nọ n’ụlọ akwụkwọ. Gịnị ma i mee otu ihe ahụ n’onwe gị?
4 Mgbe ị ka bụ nwata, gbalịa iṅomi ihe nlereanya Jisọs. Ọbụna mgbe ọ bụ nwata dị afọ 12, o kwuru okwu n’ezoghị ọnụ banyere ihe ime mmụọ. (Luk 2:42-49, 52) Isetịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ bara uru maka inwe ọmụmụ ihe onwe onye, ịgụ Bible kwa ụbọchị, na iso ndị Kraịst tozuru okè na-akpachi anya ná nzukọ na n’ozi ga-enyere gị aka inweta nkà izi ndị ọzọ ihe banyere Alaeze Chineke n’ụzọ Jisọs mere.