Otú Ị Ga-esi Ruo Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Ndị I Setịpụụrụ Onwe Gị
1. Olee ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto setịpụụrụ onwe ha?
1 Dị ka Onye Kraịst na-eto eto, obi abụọ adịghị ya na ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ na ọchịchọ i nwere irube isi n’okwu Jizọs bụ́ “buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ,” bụ́ nke ọ gwara Ndị Kraịst nile, na-ekpebi ụdị ihe mgbaru ọsọ ndị ị na-esetịpụrụ onwe gị ná ndụ. (Mat. 6:33) Ihe mgbaru ọsọ gị pụrụ ịbụ ịmụbakwu oge ị na-etinye n’ozi ubi site n’iwere ọrụ ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ site n’ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ụfọdụ pụrụ ibu n’obi na ha ga-ewepụta onwe ha iso na-ewu ihe owuwu ná mba dị iche iche, ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ, ma ọ bụ ije ozi ala ọzọ. Lee nnọọ ka ihe ndị a si bụrụ ezigbo ihe mgbaru ọsọ ndị kwesịrị ịja mma!
2. Gịnị pụrụ inyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị i setịpụụrụ onwe gị?
2 Otu ihe ga-enyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị i setịpụụrụ onwe gị bụ idetu ha edetu. Ụlọ Nche July 15, 2004 kwuru, sị: “Echiche nkịtị na-edo anya mgbe [i] kwupụtara ya ekwupụta. N’ihi ya, [ị] pụrụ ịchọ idetu ihe mgbaru ọsọ [gị] na otú [ị] ga-esi eru ha edetu.” Tụkwasị na nke ahụ, ihe mgbaru ọsọ ndị ị ga-ebu ụzọ ruo tupu i ruo ihe mgbaru ọsọ ukwu ndị i setịpụrụ pụrụ inyere gị aka ịma ma ị̀ na-enwe ọganihu, ọ pụkwara inyere gị aka ịhụ na i ruru ihe mgbaru ọsọ ukwu ahụ i setịpụrụ.
3. Kwuo ụfọdụ ihe mgbaru ọsọ a pụrụ iru ngwa ngwa bụ́ ndị pụrụ inyere mmadụ aka iru eru maka baptizim.
3 Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị A Pụrụ Iru Ngwa Ngwa: Ọ bụrụ na e mebeghị gị baptizim, chọpụta ihe ndị i kwesịrị ime iji ruo ihe mgbaru ọsọ ahụ. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka ị ghọtakwuo ozizi Bible ndị bụ́ isi nke ọma. Ya bụrụ otú ahụ, setịpụ ihe mgbaru ọsọ nke ịmụ akwụkwọ Bible Na-akụzi nke ọma, ma hụ na ị gụrụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile e zoro aka na ya. (1 Tim. 4:15) Setịpụkwa ihe mgbaru ọsọ nke ịgụchapụ Bible dum, malite na Jenesis ruo ná Mkpughe, dị ka a na-achọ n’aka ndị Betel na ụmụ akwụkwọ Gilead. Ị gụchaa ya, hụ na ị nọgidere na-agụ Bible kwa ụbọchị. (Ọma 1:2, 3) Lee nnọọ otú nke a ga-esi nyere gị aka inwe ọganihu n’ọgbakọ! Hụ na mgbe ọ bụla ị chọrọ ịgụ Bible na mgbe ọ bụla ị chọrọ ịmụ ihe, ị na-eji ekpere amalite ma na-emechi ya. Na-agbalịkwa itinye ihe ndị ị mụtara n’ọrụ mgbe nile.—Jems 1:25.
4. Olee ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ iru ngwa ngwa, bụ́ ndị Onye Kraịst chọrọ ije ozi Betel ma ọ bụ ozi ala ọzọ pụrụ isetịpụrụ onwe ya?
4 Ọ bụrụ na i meelarị baptizim, olee ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ i nwere ike ịchụso? Ọ̀ dị gị mkpa ime ka otú i si ezi ozi ọma kakwuo mma? Dị ka ihe atụ, ị̀ pụrụ ime ya ihe mgbaru ọsọ gị ime ka otú i si eji Okwu Chineke eme ihe n’ozi ubi kakwuo mma? (2 Tim. 2:15) Olee otú ị pụrụ isi jechiwekwuo ozi anya? Setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ị pụrụ iru ngwa ngwa dị ka afọ ndụ gị na ọnọdụ gị si dị. Nke a ga-enyekwara gị aka iru ihe mgbaru ọsọ ukwu ndị i setịpụrụ, bụ́ ndị ga-ewe gị oge iji ruo ha.
5. Olee otú isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ iru ngwa ngwa si nyere otu nwanna nwoke aka iru ihe mgbaru ọsọ ya nke ije ozi na Betel?
5 Akụkọ Banyere Onye Nwerela Ihe Ịga nke Ọma: Mgbe Tony, bụ́ onye dị afọ 19, letara otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, ọ malitere nwewa ọchịchọ ije ozi na Betel. Ma, n’oge ahụ, ụzọ ndụ ya ka jọrọ njọ, ọ rarabeghịdị onwe ya nye Chineke. Tony bịara kpebie ime ka ndụ ya kwekọọ n’ụzọ Jehova ma setịpụ ihe mgbaru ọsọ nke iru eru maka baptizim. Mgbe o mechara baptizim, o setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, e mesịakwa ọsụ ụzọ oge nile. O denyere akara ụbọchị ndị ọ chọrọ ịmalite rụwa ha na kalenda ya. Cheedị banyere ụdị ọṅụ o nwere mgbe ọ rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ ruo nwa oge, a kpọzie ya ka ọ bịa jewe ozi na Betel!
6. Olee ihe pụrụ inyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị ị setịpụụrụ onwe gị?
6 Gị onwe gị pụkwara iru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị i setịpụụrụ onwe gị ka ị na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ụzọ. Jiri ekpere debe “ọrụ gị nile” n’ihu Jehova ma gbalịsie ike ịrụzu ha.—Ilu 16:3; 21:5.