Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Onwe Onye Maka Afọ Ije Ozi Ọhụrụ
1 Ị̀ na-enwe obi ụtọ n’ihe ndị ị rụzuworo n’ụzọ ime mmụọ? Ọ dị mma ịnọgide na-aga n’ihu n’ụzọ ime mmụọ, ma nke a na-achọ mgbalị. Isetịpụrụ onwe anyị na ezinụlọ anyị ihe mgbaru ọsọ dị iche iche na-enye aka. Ihe mgbaru ọsọ bụ ebe a na-elekwasị anya wee na-eme mgbalị. Iji na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ, ihe mgbaru ọsọ anyị aghaghị ikwekọ ná nzube ya. N’ihi nke a, anyị na-eme ka echiche anyị kwekọọ na nke Jehova ma na-achụso ihe mgbaru ọsọ nke ọchịchị Chineke, dị nnọọ ka Jizọs mere. (Jọn 17:4) Anyị ga-esi otú a nweta ọṅụ na afọ ojuju dị ukwuu ná ndụ anyị nke ijere Jehova ozi.—Jọn 15:10, 11.
2 Ihe mgbaru ọsọ ndị dị aṅaa ka i nweworo ike iru n’ihe banyere ịkwalite ihe ndị metụtara Alaeze n’ime afọ ije ozi gara aga? A pụrụ ịhụ eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ ndị ruru ihe mgbaru ọsọ ha setịpụụrụ onwe ha site n’ọnụ ọgụgụ nke ndị e mere baptizim. Ọzọkwa, ọtụtụ iri puku mmadụ debara aha ha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka na nke oge nile. Ọtụtụ mekwara ndokwa ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ụfọdụ ụmụnna ruru ihe mgbaru ọsọ onwe onye ha mgbe a kpọrọ ha ịbịa jee ozi na Betel ma ọ bụ ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi.
3 Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Ị Pụrụ Itụle: È nwere ihe mgbaru ọsọ ndị kwesịrị ekwesị ndị ị pụrụ iru? Ka ndị ọhụrụ wee nwee ezi ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, ịbịachi nzukọ anya na idenye aha ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-abụ ihe mgbaru ọsọ ndị dị nnọọ mma. Ọ bụrụ na ị zawabeghị ajụjụ mgbe nile ná nzukọ, ọ́ gaghị adị mma ka i mee ka nke ahụ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị? Ndị ọzọ pụrụ irite uru site n’ihe ị mụrụ na nnyocha ndị i mere, ha ga-emekwa ka gị onwe gị ghọta eziokwu ahụ nke ọma karị.—Hib. 10:24, 25.
4 Ì ruwo eru ịmalite ikere òkè n’ozi ubi? Ị̀ na-eme nke ahụ n’oge nile? Ị̀ na-agụ akwụkwọ ndị a na-ebipụta ozugbo e nwetara ha, ka i wee na-agbaso nduzi nile sitere n’aka ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi? Ọ bụrụ na i ruworị ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ, ọ̀ bụ na nraranye na ime baptizim agaghị abụ ihe mgbaru ọsọ ndị kwesịrị ekwesị ka ị tụlee?
5 Ị̀ na-eduzi ọmụmụ Bible? Ì kpewo ekpere maka enyemaka n’ịmalite otu? Ì tinyewo uchu n’ịgazu nletaghachi nile, na-agwa ndị nwere mmasị bụ́ ndị ị na-ezute ka gị na ha malite inwe ọmụmụ ihe? Ọ bụrụ na onye ị na-eduziri ọmụmụ ihe eruwo eru ikere òkè n’ozi ubi, ị̀ na-enye ya ọzụzụ n’ozi ahụ?
6 Ì setịpụwo ihe mgbaru ọsọ nke awa ole ị ga na-etinye n’ọnwa ọ bụla? Ka ị̀ nwalewo ozi ọsụ ụzọ inyeaka? Ma eleghị anya, ị nọrịị n’ọnọdụ ga-enye gị ohere ịmalite ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile, na-eji awa 70 kwa ọnwa ezi ndị ọzọ ozi ọma ahụ. Ka oge na-aga, ị pụrụ inwe ọṅụ nke inweta abamuru nile nke ọzụzụ pụrụ iche a na-enye n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ. Ụmụnna nwoke kwesịrị ịdị na-eme mgbalị iru eru inweta ihe ùgwù nke ije ozi dị ka ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye.—1 Tim. 3:1.
7 Ihe mgbaru ọsọ onwe onye ndị anyị na-esetịpụrụ onwe anyị kwesịrị ime ka anyị bịaruo Jehova nso karị, nyekwara anyị aka ikere òkè n’ụzọ zuru ezu karị n’ime uche ya. Pọl sịrị na ya nọ ‘na-echefu ihe ndị dị n’azụ ma na-amatị onwe ya gaa n’ihe ndị dị n’ihu.’ Ọ gbara anyị ume inwe echiche ziri ezi banyere ịchụso ihe ndị metụtara ọchịchị Chineke ka ọ ga-abụ ‘ruo n’ókè anyị nweworo ọganihu, anyị ga-anọgide na-eje ije n’usoro n’otu ụkpụrụ a.’—Fil. 3:13, 16.