Uwe A Haziri nke Ọma Na-egosi na Anyị Na-asọpụrụ Chineke
1. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ekele maka mgbakọ distrikti anyị na-abịanụ?
1 N’oge na-adịghị anya, anyị ga-enwe ihe ùgwù nke ịbụ ndị ọbịa Jehova ná Mgbakọ Distrikti “Nye Chineke Otuto” nke afọ 2003. Lee ekele anyị na-enwe na Jehova kpọrọ anyị maka oké oriri ime mmụọ dị otú ahụ! Anyị pụrụ igosipụta nsọpụrụ anyị nwere n’ebe ọ nọ na ekele anyị nwere maka ndokwa ime mmụọ ya site n’ụzọ anyị si eji ejiji.—Ọma 116:12, 17.
2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-adị ọcha ma na-eji ejiji dị mma?
2 Ịdị Ọcha na Ịdị Mma n’Anya: Ọdịdị anyị kwesịrị igosipụta na anyị na-agbaso ụkpụrụ nke Chineke anyị, bụ́ onye dị ọcha ma na-eme ihe n’usoro. (1 Kọr. 14:33; 2 Kọr. 7:1) Ahụ́ anyị, ntutu isi anyị, na mbọ anyị kwesịrị ịdị ọcha, anyị kwesịkwara iji ejiji dị mma. Ndị mmadụ na-ejikarị ejiji na-adịghị mma taa. Otú ọ dị, nanị n’ihi na onye na-eme ihe nkiri sịnịma ma ọ bụ egwuregwu adịghị eji ejiji dị mma abụghị ihe mere Onye Kraịst ga-eji dị otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị na-achụso ejiji ndị na-ewu ewu, ọ ga-esiri ndị mmadụ ike ịhụ ọdịiche dị n’etiti ndị na-ejere ezi Chineke ahụ ozi na ndị na-adịghị ejere ya ozi.—Mal. 3:18.
3. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ọdịdị anyị ga-ekwekọ na ndụmọdụ dị na 1 Timoti 2:9, 10?
3 Uwe Ndị Kwesịrị Ndị Ozi Bụ́ Ndị Kraịst: Mgbe Pọl onyeozi degaara Onye Kraịst bụ́ onye nlekọta bụ́ Timoti akwụkwọ, ọ gbara ume ka “ụmụ nwanyị jiri uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, . . . n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke, ya bụ, site n’ezi ọrụ.” (1 Tim. 2:9, 10) Iji jide n’aka na ejiji anyị bụ nke a haziri nke ọma, anyị ga-eji nlezianya chebara ya echiche. Uwe anyị kwesịrị ịdị mma n’anya, dị ọcha, ma kwesị ekwesị—o kwesịghị ịbụ nke na-ahụ ụzọ ma ọ bụ nke na-akpali agụụ mmekọahụ.—1 Pita 3:3.
4, 5. Olee ịdọ aka ná ntị ọ dị mkpa ka ndị ikom na ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst gbasoo?
4 Pọl dọkwara aka ná ntị banyere imebiga ihe ókè ma a bịa “n’ụdị dị iche iche nke ịkpa isi na ọlaedo ma ọ bụ nkume pel ma ọ bụ ejiji dị nnọọ oké ọnụ.” (1 Tim. 2:9) Imeru ihe n’ókè n’ihe banyere ịgba ọla, ime ntecha, na iji ihe ndị ọzọ e ji achọ mma eme ihe bụ ụzọ amamihe dị na ya nke ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst ga-agbaso.—Ilu 11:2.
5 Ụkpụrụ dị na ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst metụtakwara ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst. Ụmụnna nwoke kwesịrị izere iji ụdị ejiji ndị na-egosipụta echiche nke ụwa. (1 Jọn 2:16) Dị ka ihe atụ, n’ala ụfọdụ, uwe owoghoro bụ ihe na-ewu ewu, ma ụdị ejiji a ekwesịghị onye ozi Chineke.
6. (a) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ dị elu ma a bịa n’uwe na ejiji mgbe anyị na-aga mgbakọ ma na-ala ala, mgbe anyị nọ n’ala mgbakọ, na mgbe e mechisịrị ihe omume n’ụbọchị nke ọ bụla? (b) Olee baajị e kwesịrị iyi?
6 Mgbe A Na-eme Ihe Ndị Ọzọ n’Oge E Mechisịrị Ihe Omume: Mgbe ihe ka ọtụtụ n’ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-abịa igere ihe omume ná mgbakọ, ha na-esetịpụ ihe nlereanya magburu onwe ya n’ihe banyere uwe na ejiji. Otú ọ dị, akụkọ a na-enweta na-egosi na ụfọdụ ndị adịghịzi elebara ejiji ha anya mgbe ha na-aga mgbakọ ma ọ bụ na-ala ala ma ọ bụkwanụ mgbe ha na-eme ihe ndị ọzọ n’oge e mechisịrị ihe omume. N’ezie, ọdịdị anyị—ma ọ̀ bụ n’oge ihe omume na-aga n’ihu ma ọ bụ n’oge ndị ọzọ—na-emetụta otú ndị ọzọ si ele ndị Chineke anya. Ebe ọ bụ na anyị na-eyi baajị mgbakọ anyị, anyị kwesịrị mgbe nile iji ejiji n’ụzọ kwesịrị onye ozi bụ́ Onye Kraịst. (Ọ bụ nanị baajị nzukọ a wepụtara ka e kwesịrị iji mee ihe. N’oge gara aga, ụfọdụ ndị eyiwo baajị ndị ha ji aka ha mee, bụ́ ndị nwere ọdịdị na àgwà dị iche. E kwesịghị iji baajị dị otú ahụ mee ihe. Ọ bụrụ na ọgbakọ achọọ inwetakwu baajị na ọ́bọ́ ya, ha kwesịrị ịtụ ọda maka ha site n’alaka ụlọ ọrụ, na-eji fọm Literature Request, S-14, mee ihe.) Nke a na-akpalikarị ndị ọzọ ịja anyị mma ma na-eme ka anyị nwee ike ịgba àmà.—1 Kọr. 10:31-33.
7. Olee mmetụta uwe na ejiji anyị a haziri nke ọma pụrụ inwe n’ebe ndị ọzọ nọ?
7 Dị nnọọ ka ịmụmụ ọnụ ọchị pụrụ isi mee ka ihu anyị gbasapụkwuo, n’ụzọ dị otú ahụ, uwe na ejiji a haziri nke ọma na-eme ka ozi anyị na-ezi na nzukọ anyị na-anọchite anya ya, nwee ùgwù. A pụrụ ịkpali ụfọdụ ndị ga-ahụ anyị n’oge Mgbakọ Distrikti “Nye Chineke Otuto” nke afọ a ịjụ ihe mere anyị ji dị iche, ha pụkwara ikwu n’ikpeazụ, sị: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo [ma hụ] na Chineke nọnyeere unu.” (Zek. 8:23) Ka onye ọ bụla n’ime anyị gosi na anyị na-enye Jehova nsọpụrụ site n’uwe na ejiji anyị.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Jie Ejiji n’Ụzọ Dị Ùgwù
▪ Mgbe ị na-aga mgbakọ
▪ Mgbe ị nọ n’ala mgbakọ
▪ Mgbe ị na-eme ihe ndị ọzọ n’oge e mechisịrị ihe omume