Ejiji Dị Ọcha nke Kwesịrị Otuto
1. N’ịkwadebe maka mgbakọ distrikti, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chebara ejiji anyị echiche?
1 “Ndịàmà Jehova kasị mma! Ndị òtù unu nwere obiọma ma na-eji ejiji dị mma, ha na-akwanyekwara mmadụ ùgwù nke ukwuu.” Nke ahụ bụ ihe otu onye nnọchiteanya họtel kwuru banyere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị n’otu mgbakọ distrikti e nwere n’afọ gara aga. Ná mgbakọ ọzọ, otu onye ọrụ họtel kwuru, sị: “O doro anya na ndị òtù unu na-eji ejiji iji wetara Chineke otuto.” Ee, ndị ọzọ na-ahụ ndị bịara mgbakọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ejiji ‘n’ụzọ kwesịrị ozi ọma ahụ,’ nke a na-akpalikarịkwa ndị nọ n’èzí ịja anyị mma ma na-eme ka o doo anya na anyị bụ ndị ozi Chineke. (Fil. 1:27) Ka anyị na-akwadebe maka mgbakọ distrikti, o kwesịrị ekwesị ichebara ejiji anyị echiche tupu anyị agawa.
2. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ịma aka iji ejiji n’ụzọ na-egosi ịdị ọcha?
2 “Amamihe nke sitere n’elu bu ụzọ dị ọcha,” ka Jems onye na-eso ụzọ dere. (Jes. 3:17) Igosipụta ịdị ọcha n’ejiji anyị pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ụwa rụrụ arụ nke Setan na-eme ka ndị mmadụ nakwere ụdị ejiji ndị gabigara ókè, ndị na-akpali agụụ anụ ahụ́, na ndị gbapụrụ nnọọ iche, bụ́ ndị na-ekwesịghị ekwesị. (1 Jọn 2:15-17) N’ihi ya, mgbe anyị na-eme mkpebi banyere uwe na ejiji, ọ dị anyị mkpa irube isi na ndụmọdụ Bible bụ́ “ịjụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa na ibi ndụ n’uche zuru okè . . . n’ime usoro ihe dị ugbu a.” (Taị. 2:12) Anyị ekwesịghị mgbe ọ bụla ịkpasu ndị ọzọ iwe n’ihi ejiji anyị, ma hà bụ ụmụnna anyị, ndị na-arụ ọrụ na họtel na n’ụlọ nri, ma ọ bụ ndị ọzọ na-ekiri ihe anyị na-eme.—1 Kọr. 10:32, 33.
3. Olee ajụjụ ndị ga-enyere anyị aka inyocha ejiji anyị?
3 Uwe Na-agabigaghị Ókè, nke A Haziri nke Ọma: Mgbe ị na-ejikere ịga mgbakọ, jụọ onwe gị, sị: ‘Ejiji m ọ̀ bụ nke na-agabigaghị ókè, ka ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ lewe m anya n’ụzọ na-adịghị mkpa? Ọ̀ na-egosi na m na-echebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche? Olu uwe m ọ̀ gbadara ala nke ukwuu? Uwe elu m ọ̀ gbagoro elu otú a ga na-ahụ afọ m anya? Uwe m ọ̀ na-ahụ ụzọ ma ọ bụ na-akpa m akpa? Uwe m ọ̀ dị ọcha ma bụrụ nke na-adịghị esi ísì ọjọọ? Mgbe m na-eri nri ụtụtụ na họtel, n’ụlọ nri, ma ọ bụ na-ezu ike mgbe ihe omume gasịrị, ejiji m ọ̀ ga-adị ọcha dị ka nke onye ozi, ka uwe m ọ̀ ga-abụ nke dị gháá ghàà gháá, nke na-ewu ewu, nke a na-edozighị edozi, na nke na-agaghị ekwesị onye bịara mgbakọ nke yi baajị? Uwe m na-eyi n’oge ntụrụndụ ọ̀ ga-eme ka ihere mee m ịgbara ndị ọzọ àmà n’oge m na-anọghị n’ozi?’—Rom 15:2, 3; 1 Tim. 2:9.
4. Olee otú ndị ọzọ pụrụ isi nyere anyị aka iji ejiji dị ọcha?
4 Anyị pụrụ irite uru site n’aro nke Ndị Kraịst tozuru okè. Ndị bụ́ nwunye kwesịrị ịjụ di ha otú ndị ọzọ pụrụ isi lee uwe ha anya. Ndị nne na nna na-asọpụrụ Chineke pụrụ inyere ụmụ ha ndị dị afọ iri na ụma aka n’ihe banyere nke a. Ọzọkwa, ndị inyom meworo agadi, bụ́ ndị nwere àgwà ịsọpụrụ Chineke, pụrụ ‘ime ka ụmụ agbọghọ nwee uche ziri ezi ma bụrụ ndị dị ọcha’ n’ejiji ha “ka e wee ghara ikwujọ okwu Chineke.” (Taị. 2:3-5) Akwụkwọ anyị na-enwe foto ndị na-enye aka ịkọwa ejiji na-agabigaghị ókè, nke a haziri nke ọma.
5. Olee otú anyị nile pụrụ isi wetara Jehova otuto ná mgbakọ?
5 Na-ewetara Jehova Otuto: Mgbakọ distrikti na-enye anyị nile, ọ bụghị nanị ndị nwere ihe omume, ohere magburu onwe ya iji too Jehova. N’ezie, omume Ndị Kraịst na okwu ọnụ anyị ga-ewetara ya nsọpụrụ. Ma, ihe mbụ ọtụtụ ndị na-ekiri ihe anyị na-eme na-ahụ n’ebe anyị nọ bụ uwe na ejiji anyị. Ka anyị nile wetara Jehova otuto site n’iji ejiji dị ọcha, nke kwesịrị otuto.—Ọma 148:12, 13.
Igbe dị na peeji nke 6]
Ihe Ndị Ga-enye Aka Iji Ejiji Kwesịrị Otuto
◼ Okwu Chineke
◼ Inyocha onwe onye
◼ Aro nke ndị ọzọ
◼ Akwụkwọ Ndị Kraịst