Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/05 p. 4-5
  • Keleenụ Jehova n’Etiti Mkpọkọta Bara Ụba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Keleenụ Jehova n’Etiti Mkpọkọta Bara Ụba
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-echere Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Na-eso Kraịst Site n’Igosi Nkwanye Ùgwù
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Mgbakọ Distrikti Bụ Oge Anyị Na-eji Ọṅụ Efe Chineke
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Ì Jikerela Maka Oriri Ime Mmụọ?
    Ozi Alaeze Anyi—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 9/05 p. 4-5

Keleenụ Jehova n’Etiti Mkpọkọta Bara Ụba

1, 2. Olee ohere mgbakọ distrikti na-enye anyị, oleekwa ụzọ ndị anyị pụrụ isi mee nke a?

1 Mgbakọ distrikti ndị anyị na-enwe kwa afọ na-enye anyị ohere magburu onwe ya ito Jehova. Anyị na-enwe mmetụta yiri nke Devid, bụ́ onye bụrụ, sị: “M ga-ekele Gị n’etiti mkpọkọta bara ụba: n’etiti otu ndị nwere ume ka m ga-eto Gị.” (Ọma 35:18) Ná Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi” bụ́ nke na-abịanụ, olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na dị ka ndị dị n’otu, anyị na-ewetara Jehova otuto?

2 Otu ụzọ anyị pụrụ isi mee nke a bụ site n’ejiji anyị nakwa site n’àgwà anyị. Kọmitii na-ahazi mgbakọ n’otu n’ime ebe ndị a na-anọ enwe mgbakọ kwuru, sị: “Uwe na ejiji ụmụnna bịara mgbakọ a amaka. Ha bịara n’ụlọ mgbakọ nọdụ ala n’ezi oge ma soro ụmụ ha nọrọ. Ha kpakwara àgwà dị mma n’oge nile ha nọrọ n’ala mgbakọ ahụ.” Site n’ejiji anyị, otú anyị si emekọ ihe ọnụ, na àgwà anyị, onye ọ bụla n’ime anyị ga-eso eme ka a na-enye Chineke otuto ndị magburu onwe ha otú ahụ, bụ́kwa nke ruuru Chineke anyị.—1 Pita 2:12.

3, 4. Olee otú imeru ihe n’ókè ga-esi enyere anyị aka iji ejiji n’ụzọ kwesịrị ndị ozi Kraịst ma n’oge anyị nọ n’ala mgbakọ ma n’oge nnọkọ nke ụbọchị ọ bụla gasịrị?

3 Ejiji Anyị: Ka anyị wee na-eyi uwe ma na-eji ejiji n’ụzọ na-ewetara Jehova otuto, anyị aghaghị ịbụ ndị na-emeru ihe n’ókè. (1 Tim. 2:9) Akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi kwuru na peeji nke 132, sị: “Onye na-emeru ihe n’ókè na-eche echiche ka ọ ghara ịkpasu ndị ọzọ iwe n’ụzọ na-adịghị mkpa nakwa ịghara ịdọta mmasị na-ekwesịghị ekwesị n’ebe onwe ya nọ.” N’ọtụtụ mba, iji ejiji na-adịghị mma aghọọla ihe juru ebe nile. Otú ọ dị, Jehova na-enwe ekele maka mgbalị anyị na-eme ịhụ na anyị nọchitere anya ya nke ọma. (Ọrụ 15:14) Mgbe anyị gbakọtara n’ihu Jehova, anyị kwesịrị iji ejiji otú ga-egosi na anyị nọ n’ihu Onye kachasị elu ma n’eluigwe ma n’ụwa. (1 Ihe 29:11) N’ihi ya, anyị kwesịrị izere ibu akpa, iyi uwe, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e ji akpọsa siga ma ọ bụ ihe ndị yiri ya, ebe ọ bụ na ezi Ndị Kraịst adịghị ese siga.

4 Ọ dịkwa mkpa ka anyị lebara ọdịdị anyị anya mgbe a gbasasịrị nnọkọ nke ụbọchị ọ bụla. Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịchọ iyi uwe ndị dị mfe n’ahụ́ n’oge anyị na-atụrụ ndụ ma ọ bụ mgbe anyị na-eri nri n’ụlọ nri, ọ dị mkpa ka uwe anyị na ejiji anyị ka bụrụkwa nke kwesịrị ndị “na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke.” (1 Tim. 2:10) Ihe ndị na-ewu ewu n’ụwa abụghị ihe a na-adabere na ya wee na-ekpebi ma uwe ò kwesịrị ekwesị ma ọ bụ na ò kwesịghị ekwesị. (1 Jọn 2:16, 17) N’akwụkwọ Ndị Kraịst anyị na-ebipụta, e nwere foto ụmụ nwoke na nke ụmụ nwanyị nọ n’ọnọdụ dịgasị iche iche, bụ́ ndị yi uwe kwesịrị ekwesị a haziri nke ọma, ndị anyị ga-ewere dị ka ihe nlereanya. Anyị iyi baajị anyị n’oge nile anyị nọ n’obodo anyị gara mgbakọ na ya ga-eme ka anyị na-echeta na anyị bụ ndị ozi Kraịst ma n’ehihie ma n’abalị.—2 Kọr. 6:3, 4.

5, 6. Olee otú anyị pụrụ isi gosi nkwanye ùgwù maka nri ime mmụọ Jehova nyere anyị?

5 Kwanyere Nri Ime Mmụọ Jehova Kwadebere Ùgwù: Eze nwe eluigwe na ala emeworo anyị oké oriri. (Aịsa. 25:6; 1 Kọr. 10:21) Ọ bụrụ na anyị weere nri ime mmụọ Jehova kwadebere dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, anyị ga-eme ka ihe mgbaru ọsọ anyị bụrụ ịbịazu ụbọchị atọ dum nke mgbakọ ahụ. Ì meela ndokwa maka ụlọ obibi na ụgbọ njem ma nata ikike maka ịgha ọrụ? Ì meela ndokwa maka ịdị na-akwadebe n’oge ma na-abịarute n’ala mgbakọ n’oge iji nwee ike ịchọta oche, soro ụmụnna gị kpakọrịta, ma sorokwa ha nye Jehova otuto site n’abụ nakwa ekpere mmeghe?—Ọma 147:1.

6 Ọ bụrụ na anyị nwere nkwanye ùgwù maka nri a Jehova kwedebeere anyị, ọ ga-eme ka anyị gee ntị nke ọma mgbe ihe omume na-aga n’ihu ma zere ịkpanyere ndị ọzọ ụka, iri ihe, ma ọ bụ ịnọ na-agagharị n’ime ụlọ mgbakọ n’ụzọ na-enweghị isi. Ndị nne na nna ekwesịghị iyinye ụmụ ha akpụkpọ ụkwụ na-eme mkpọtụ na ihe ndị yiri ya n’ihi na ha na-adọpụ uche ndị ọzọ. Jehova si n’aka òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche enye anyị nri ime mmụọ dị anyị mkpa n’oge a. (Mat. 24:45) Ọ dịghị onye n’ime anyị kwesịrị ịhapụ nke ọ bụla n’ime ya. Ndị nne na nna kwesịrị ịhụ na ha na ụmụ ha nọkọrọ ọnụ ma nyere ha aka irite uru nke ọma n’ihe a na-ekwu.—Deut. 31:12.

7. Gịnị ka a na-arịọ anyị arịrịọ ime banyere nri ehihie, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

7 A na-atụ aro ka anyị jiri nri ehihie anyị bịa kama isi n’ala mgbakọ na-apụ iji zụrụ ihe oriri n’oge nkwụsịtụ nke ehihie. Ọ bụ ihe kwesịrị ịja mma na ihe ka ọtụtụ ná ndị bịara mgbakọ n’afọ gara aga gbasoro ntụziaka a nke ọma. Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ma ọ bụrụ na onye ọ bụla emee otú ahụ n’afọ a! Ma, biko echefula ihicha ihe ọ bụla wụrụ n’ala na idebe ala ụlọ mgbakọ ọcha. (Hib. 13:17) Ndokwa a na-enye anyị ohere magburu onwe ya iso ụmụnna anyị nwee mkpakọrịta na-ewuli elu, ọ na-emekwa ka e nwee udo na ịdị n’otu bụ́ nke na-ewetara Jehova otuto.—Ọma 133:1.

8, 9. Olee ohere ọzọ mgbakọ a na-enye anyị iji too Jehova?

8 Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi: Mgbe anyị na-aga n’ala mgbakọ nakwa mgbe anyị si na ya na-ala, anyị nwere ọtụtụ ohere nke iji egbugbere ọnụ anyị too Jehova. (Hib. 13:15) Ma ànyị na-eri nri n’ụlọ nri ma ọ bụ soro onye nwe ụlọ anyị bi na ya ma ọ bụ onye na-arụ na họtel ma ọ bụ onye anyị na ya bakọrọ n’otu ụgbọ njem na-akparịta ụka, ka anyị chọọ ohere anyị ga-eji gbaara ha àmà. Ọmarịcha ihe ime mmụọ ndị anyị mụtara ná mgbakọ ahụ ga-ejupụta n’obi nakwa n’uche anyị. Ka anyị kọtụrụ ndị anyị ga-ezute mgbe anyị na-anọghị n’ozi ihe ndị ahụ.—1 Pita 3:15.

9 Anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-atụ anya ohere a anyị nwere iji gọzie Jehova “n’ime mkpọkọta mmadụ nile.” (Ọma 26:12) Ka anyị nile jiri otu olu kelee Jehova ná Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi.”

[Igbe dị na peeji nke 5]

Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Mgbakọ Distrikti

◼ Oge Ihe Omume Ga-amalite: N’ụbọchị Friday, ihe omume ga-amalite n’elekere 9:20 nke ụtụtụ, ebe ọ ga-amalite n’elekere 9:00 nke ụtụtụ n’ụbọchị Saturday na Sunday. Minit ole na ole tupu ihe omume amalite, onyeisi oche nnọkọ ahụ ga-anọdụ ala n’elu ikpo okwu ka a na-akpọ abụ olu ụtọ nke ga-eduga ná mmalite nnọkọ. Anyị nile kwesịrị ịnọdụ ala n’oge ahụ ka ihe omume ahụ wee nwee ike ịmalite n’ụzọ dị ùgwù. N’ụbọchị Friday, a ga-emechi ihe omume n’elekere 4:55 nke uhuruchi, n’ụbọchị Saturday, a ga-emechi ya n’elekere 4:35 nke uhuruchi, ebe nke Sunday ga-abụ n’elekere 3:40 nke uhuruchi.

◼ Ịdọba Ụgbọala: Biko gbasoo ntụziaka ndị atendantị n’ebe a na-adọba ụgbọala iji hụ na ihe gara n’usoro.

◼ Ịchọta Oche: Ị pụrụ ịchọta oche nanị maka ndị gị na ha so n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ebe.

◼ Onyinye: Ịkwadebe mgbakọ distrikti na-efu ego buru ibu. Anyị pụrụ igosi ekele anyị site n’inye onyinye afọ ofufo maka ọrụ zuru ụwa ọnụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ma ọ bụ n’ala mgbakọ. N’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla e nyere n’onyinye, e kwesịrị ide “Watch Tower” dị ka ndị ọ bụ ha ga-adọrọ ego ahụ.

◼ Nri Ehihie: A na-atụ aro ka i jiri nri ehihie gị bịa kama isi n’ala mgbakọ na-apụ n’oge nkwụsịtụ nke ehihie iji zụta ihe ị ga-eri. Ị pụrụ ịnọ n’ime ụlọ mgbakọ rie nri gị. Biko emetọsịla ebe ahụ, ma ọ bụ hapụ ihe ndị e ji kechie ihe n’ala. Ịnọ n’ime ụlọ mgbakọ rie nri ga-eme ka mmadụ nile nwee ike inwe mkpakọrịta na-ewuli elu ma nọrọ ya mgbe nnọkọ nke ehihie ga-amalite kpọmkwem. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, a pụrụ iji obere igbe nri nke pụrụ ịba n’okpuru oche tinye nri ahụ. A chọghị ka e webata igbe nri ndị buru ibu, na ihe ndị dị ka karama na-akụwa akụwa n’ime ụlọ mgbakọ.

◼ Itinye Ihe Ndị A Na-ekwu na Teepu: E kwesịghị ịkwụnye ngwá ọ bụla e ji etinye ihe na teepu n’ebe a na-akwụnye ngwá eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu ndị e ji eme ihe n’ala mgbakọ. A pụkwara iji ha mee ihe nanị n’ụzọ na-agaghị adọpụ uche ndị ọzọ.

◼ Ise Foto: Ọ bụrụ na ị chọrọ ise foto, ị kwesịghị iji ọkụ foto mee ihe mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ahapụla ụlọ mgbakọ mgbe ihe omume na-aga n’ihu ịga see foto, i kwesịghịkwa ịkpọ ndị ọrụ ha bụ ise foto ka ha bata n’ime ala mgbakọ see gị foto.—Jọn 2:16.

◼ Pager na Ekwe Ntị: E kwesịrị ịgbanyụlata ha otú ha na-agaghị adọpụ uche ndị mmadụ.

◼ Ihe Ọghọm na Ọnọdụ Mberede: Ọ bụrụ na e nwee onye nọ n’ala mgbakọ daa ọrịa nke chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa banyere ya, biko gwa onye atendantị nọ nso, bụ́ onye ga-eme ka ndị na-arụ n’Ebe Ịnara Ọgwụ mara ozugbo, ka ndị nlekọta ahụ́ ike ruru eru anyị nwere ná ngalaba ahụ lebara ọnọdụ ahụ anya ma nye aka.

◼ Ụlọ Obibi Ndị Dị n’Ala Mgbakọ: Gosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ mgbe ị na-enweta ụlọ ozugbo ị bịarutere n’ala mgbakọ. Anọla n’ụlọ ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị Ngalaba Na-ahụ Maka Ebe Obibi nyere gị ya. Sie nri nanị n’ebe ndị a kwadoro ka a nọrọ na-esi nri. N’oge gara aga, ahụla ebe ụfọdụ ndị nọ na-esi nri mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Nke a adịghị egosi na ha nwere ekele maka ihe ime mmụọ.—Luk 10:38-42.

◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Wepụtara: E kwesịghị ịgba ọsọ, ịkwa aka, na ịzọ ụ̀zọ́ maka akwụkwọ ọhụrụ ndị e wepụtara. Kwụrụ n’ahịrị n’ụzọ dị n’usoro. A na-eme mgbalị iji hụ na ndị bịara mgbakọ nwetara akwụkwọ ọhụrụ ndị e wepụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya