Mgbakọ Distrikti Bụ Oge Anyị Na-eji Ọṅụ Efe Chineke
1. Olee otú ememme ndị Izrel si yie mgbakọ distrikti ndị anyị na-aga n’oge a?
1 Josef, Meri, ụmụ ha, na ndị ọzọ na-aga Jeruselem mgbe ọ bụla a na-eme ememme ndị Juu na-eme kwa afọ. N’oge ndị a, ma ha ma ndị ọzọ na-efe Jehova na-ahapụ ihe ndị dịịrị ha ma gaa ebe ha ga-eri nri ime mmụọ, nke bụ́ ihe ka mkpa ná ndụ ha. Oge ememme ndị a na-enye ha ohere ichebara ihe ndị Jehova meere ha echiche, kwurịta ịdị mma ya ma tụgharịa uche n’Iwu ya. Mgbakọ distrikti anyị na-abịanụ ga-enyekwa anyị ohere ime ihe ndị ahụ ma jiri obi ụtọ fee Jehova.
2. Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji kwadebe maka mgbakọ distrikti na-abịanụ?
2 Ọ Dị Mkpa Ịkwadebe Akwadebe: Jizọs na ndị ezinụlọ ha na-eji ụkwụ aga ihe dị ka narị kilomita abụọ iji si Nazaret gaa Jeruselem ma lọta. Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị ụmụnne ole Jizọs nwere, ma anyị nwere ike iji uche anyị ghọta ụdị mgbalị Josef na Meri mere iji kwadebe ndị ezinụlọ ha niile ma hụ na ha gara ememme ndị ahụ. Ì meela ndokwa niile i kwesịrị ime iji hụ na ị gaara ụbọchị atọ niile nke mgbakọ distrikti a na-abịanụ? Iji hụ na ị gara mgbakọ a, o nwere ike ịdị mkpa ka i were ezumike n’ọrụ gị n’oge ahụ, ma ọ bụ ka ị gwa onye ị na-arụrụ ọrụ ka o nye gị ohere ịga, ma ọ bụkwanụ ka ị gaa gwa onye nkụzi nwa gị na nwa gị agaghị abịa akwụkwọ n’ụbọchị ndị ahụ. Ì dejupụtala fọm a ga-eji enye gị ụlọ (ya bụ, Room Request Form) ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa? Ì nwere ike inyere otu onye nwere mkpa pụrụ iche n’ọgbakọ unu aka, ka o nwee ike gaa mgbakọ, n’echeghị ka yanwa gwa gị agwa?—1 Jọn 3:17, 18.
3. Gịnị mere oge ememme ndị Izrel ji bụrụ oge ha ji enwe mkpakọrịta na-ewuli elu?
3 Mkpakọrịta Na-ewuli Elu: Oge ememme ndị Juu bụ oge ndị Juu na ndị ọzọ ha na ha na-efekọ Jehova ji enwe mkpakọrịta na-ewuli elu. O doro anya na Jizọs na ndị ezinụlọ ha na-atụ anya ịhụ ndị enyi ha ha na-ahụbeghị kemgbe. Ha na-atụkwa anya imete ndị enyi ọhụrụ n’ime ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu ga-abịa Jeruselem, ma ọ bụ ndị nke ha ga-ahụ n’ụzọ mgbe ha na-aga aga ma ọ bụ na-alọta alọta.
4. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị anaghị eji ụmụnna anyị egwuri egwu?
4 Otu ihe mere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, ji eme ndokwa ka anyị niile na-ezukọta gere okwu ndị a ga-ekwu ná mgbakọ distrikti, kama ibipụta ha n’akwụkwọ anyị, bụ ka anyị niile nwee ike ịgbarịta ibe anyị ume. (Hib. 10:24, 25) N’ihi ya, hụ na ị bịaruru n’Ụlọ Mgbakọ ahụ n’oge n’ụbọchị ọ bụla, ka gị na ụmụnna ndị ọzọ nwee ike ịkpakọrịta tupu onyeisi oche nnọkọ ekwuo ka mmadụ niile gaa nọdụ ala gere abụ olu ụtọ. Ka anyị na ụmụnna anyị nwee ike ịkpakọrịta, a na-agba onye ọ bụla ume iburu nri ehihie ya bịa n’ụlọ mgbakọ kama ịga zụwa nri mgbe a gbasara ihe omume nke ụtụtụ. Na anyị niile bụ ụmụnna dị n’otu bụ onyinye si n’aka Jehova, anyị ekwesịghịkwa iji onyinye a gwurie egwu.—Maị. 2:12.
5. Gịnị ga-enyere anyị aka ịmụta ọtụtụ ihe ná mgbakọ a?
5 Oge Ịmụta Ihe: Jizọs malitere n’oge ọ bụ nwata na-amụta ọtụtụ ihe banyere Nna ya nke bi n’eluigwe ma ha gaa ememme ndị Juu. (Luk 2:41-49) Gịnị ga-enyere anyị na ndị ezinụlọ anyị aka ịmụta ọtụtụ ihe n’ihe omume ndị a ga-eme ná mgbakọ ahụ? Gbalịa ka gị na mmadụ ghara ịna-akparịta ụka ma ọ bụ ka ị ghara ịna-agagharị mgbe a na-ekwu okwu. Ekwela ka ekwe ntị gị dọpụ gị ma ọ bụ ndị ọzọ uche. Lekwasị onye na-ekwu okwu anya, na-edetukwa ihe ndị dị gị mkpa. Gị na ndị ezinụlọ gị nọkọta ka i nwee ike hụ na ụmụ gị na-ege ntị. Ọ bụrụ na a gbasaa n’ụbọchị ọ bụla, gị na ndị ọzọ kwurịta ihe ndị e kwuru tọrọ unu ụtọ.
6. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche banyere uwe na ejiji anyị?
6 Uwe na Ejiji: Mgbe Jizọs na ndị ezinụlọ ha na ndị Juu ndị ọzọ na-aga Jeruselem maka ememme ha, ọ gaghị esiri ndị ahịa ndị na-abụghị ndị Juu, bụ́ ndị na-aga n’okporo ụzọ ahụ, ike ịmata na ha bụ ndị Juu n’ihi na ha na-eyi uwe mwụda a dụnyere ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala ya, dụnyekwa eriri na-acha anụnụ anụnụ n’elu ebe ahụ a dụnyere ihe ahụ dị yọrị yọrị. (Ọnụ Ọgụ. 15:37-41) Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst enweghị uwe e ji mara ha, ma ndị mmadụ maara na ha na-eji ejiji dị mma ma na-adị ọcha n’anya. Anyị kwesịrị ịhụ na uwe na ejiji anyị dị mma mgbe anyị na-abịa mgbakọ na mgbe anyị na-ala nakwa mgbe anyị nọ n’ala mgbakọ. Ya bụrụgodị mgbe a gbasara ihe omume nke ụbọchị ọ bụla, anyị kwesịrị iji ejiji dị mma ma hụ na anyị yi baajị anyị mgbe niile. Anyị mee otú a, ọ ga-eme ka anyị dị iche ná ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova, meekwa ka ndị mmadụ kwuo okwu ọma banyere anyị.
7. Gịnị mere anyị ji kwesị ichewe echiche inye aka rụọ ọrụ ná mgbakọ?
7 A Chọrọ Ndị Ọrụ Afọ Ofufo: A chọrọ ọtụtụ ndị ga-enye aka rụọ ọrụ ka mgbakọ ahụ nwee ike gaa nke ọma. Ì nwere ike inye aka? (Ọma 110:3) Ọrụ a na-arụ ná mgbakọ anyị bụ ozi dị nsọ, o sokwa na-agbara ndị ọzọ àmà. Obi tọrọ manịja otu ụlọ ezumezu a nọ mee mgbakọ ụtọ nke ukwuu n’ihi otú ụmụnna si debe ebe ahụ ọcha nke na o detaara ụmụnna akwụkwọ ozi ekele, sị: “Ana m ekele unu n’ihi na ná ndị niile na-eji ebe a enwe nnọkọ, ọ bụ nke unu kacha pụọ iche. Ọ dịla anya m nụwara na e nweghị ndị na-edebe ebe ha nọ nwee nnọkọ ọcha karịa Ndịàmà Jehova, n’ihi na ha na-edebe ebe ahụ ọcha karịa otú ọ dị na mbụ. Unu mere ka ụlọ ezumezu anyị a makwuo mma, ndị bịakwara debe ya ọcha bụ ndị ezigbo mmadụ, obi dịkwa anyị nnọọ ụtọ ịmata ha.”
8. Olee ihe ndị ga-eme ka anyị nwee ohere ịgbara ndị mmadụ àmà n’ebe anyị ga-aga mgbakọ?
8 Ohere Ịgba Àmà: Ọtụtụ ndị bi n’obodo ebe anyị gara mgbakọ ga-ahụ anyị ka anyị jiri ejiji dị mma, hụkwa baajị anyị yi. Nke a nwere ike ime ka ha chọọ ịmata ndị anyị bụ, anyị ejirikwa ohere ahụ kọọrọ ha banyere mgbakọ ahụ anyị bịara. Otu nwata dị afọ anọ ji akwụkwọ ọhụrụ e wepụtara ná mgbakọ ha gara gaa n’otu ụlọ nri mgbe a gbasara ihe omume ma gosi ya nwaanyị na-ebutere ndị mmadụ nri ebe ahụ. Nke a mere ka ndị mụrụ nwa ahụ gwa nwaanyị ahụ ka ọ bịa gere okwu a ga-ekwu ná mgbakọ ahụ.
9. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị ji ndokwa Jehova meere anyị kpọrọ ihe otú ahụ Jizọs na ndị ezinụlọ ha si jiri ya kpọrọ ihe?
9 Oge ememme ndị Juu bụ oge na-enye ha ọṅụ, ndị ji ife Chineke kpọrọ ihe na-atụsikwa anya ike ịga ememme ndị ahụ. (Diut. 16:15) Obi dị Jizọs na ndị ezinụlọ ya ụtọ ịchụ ihe ọ bụla n’àjà iji gaa ememme ndị ahụ ma rite ezigbo uru na ha. Otú ahụkwa ka ịga mgbakọ distrikti anyị si atọ anyị ụtọ, n’ihi na anyị weere ya ka onyinye si n’aka Nna anyị nke eluigwe, onye hụrụ anyị n’anya. (Jems 1:17) Ugbu a bụ oge ịkwadebe maka ohere a anyị na-enwe kwa afọ iji ọṅụ fee Jehova!
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche Banyere Mgbakọ Distrikti
◼ Oge Ihe Omume: N’ụbọchị atọ ahụ dum, ihe omume ga na-amalite ma o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere itoolu nke ụtụtụ. Mgbe a mara ọkwa na a na-aga ịmalite ịkpọ abụ olu ụtọ, anyị niile kwesịrị ịnọdụ ala ka e nwee ike ịmalite ihe omume a n’ụzọ dị ùgwù. Ihe omume nke ụbọchị Fraịdee na Satọdee ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji ise ka ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi, ebe nke ụbọchị Sọnde ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere anọ nke uhuruchi.
◼ Ịdọba Ụgbọala: N’ebe niile a ga-eme mgbakọ, ndị atendantị ga-egosi ndị mmadụ ebe ha ga-adọba ụgbọala ha. Biko soro ntụziaka ha.—1 Kọr. 14:40.
◼ Ịchọtara Ndị Ọzọ Oche: Ndị i nwere ike ịchọtara oche bụ naanị ndị gị na ha so n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ụlọ, nakwa ndị ị na-amụrụ Baịbụl bịara mgbakọ ahụ.—1 Kọr. 13:5.
◼ Nri Ehihie: Biko, buru nri ehihie gị bịa n’ụlọ mgbakọ kama ịga zụwa nri mgbe a gbasara ihe omume nke ụtụtụ. I nwere ike jiri obere igbe nri ga-abali n’okpuru oche buru nri gị bịa. A chọghị ka e bubata igbe nri ndị buru oké ibu, ihe ndị na-akụwa akụwa, na mmanya na-aba n’anya n’ụlọ mgbakọ.
◼ Onyinye: Anyị nwere ike igosi obi ụtọ anyị nwere maka mgbakọ anyị site n’inye onyinye afọ ofufo maka ọrụ zuru ụwa ọnụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ma ọ bụ ná mgbakọ distrikti. E nwee onye chọrọ iji akwụkwọ ndọrọ ego nye onyinye ná mgbakọ, o kwesịrị ide okwu abụọ bụ́ “Watch Tower” n’ebe a na-ede aha onye ga-adọrọ ego ahụ.
◼ Ihe Ọghọm na Ihe Mberede: Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee onye nọ n’ala mgbakọ, biko, gwa onye atendantị nọ nso. Onye atendantị ahụ ga-akpọga ya n’Ebe Ịnara Ọgwụ ozugbo, ka ndị nlekọta ahụ́ ike ruru eru anyị nwere na ngalaba ahụ lebara onye ahụ ahụ́ na-adịghị anya ma nyere ya aka.
◼ Itinye Ihe A Na-ekwu na Teepụ: E kwesịghị ịkwụnye ihe ọ bụla e ji etinye okwu na teepụ n’ọkụ eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu ndị dị n’ala mgbakọ. Ma e nwere ike itinye ihe ndị a na-eme na teepụ naanị ma ọ bụrụ na ọ gaghị adọpụ ndị ọzọ uche.
◼ Oche E Ji Akwagharị Nwa Ọhụrụ: E kwesịghị ibubata oche e ji akwagharị nwa ọhụrụ n’ụlọ mgbakọ. Ma e nwere ike bubata oche e ji ejide ụmụaka ka ha ghara ịda, dewe ya n’ebe ndị mụrụ ha nọ.
◼ Ihe Nkiri: Ọ gaghị adị mma ka ụmụnna nwaanyị fụrụ ịchafụ ndị buru ibu n’ehihie Sọnde mgbe a na-eme ihe nkiri, n’ihi na ọ ga-eme ka ndị nọ ha n’azụ ghara ịhụ ihe a na-eme. Ha ekwesịghị ime otú ahụ, nke ka nke, n’ihi otú e si arụ Ụlọ Mgbakọ ugbu a.—1 Kọr. 10:24.
◼ Sent: Anyị ga-egosi na anyị na-echebara ndị ọzọ echiche ma ọ bụrụ na anyị eselatatụ aka n’otú anyị si agba sent. Nke a bụ n’ihi ndị ísì sent na-enye nsogbu n’ahụ́.—Fil. 2:4.
◼ Ebe A Na-ere Nri/Ndị Na-ere Ihe ná Mpụga Ụlọ Mgbakọ: Ị gaa ebe a na-ere nri, kpaa ezi àgwà iji sọpụrụ aha Jehova. Ọ gaghị adị mma ịga riwe nri ma ọ bụ zụwa ihe mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na e nwere ihe ị chọrọ ịzụ, ọ ga-akacha mma ịzụ ya tupu ihe omume amalite ma ọ bụ mgbe a gbasara.
◼ Ozi Afọ Ofufo: Anyị ga-enwekwu obi ụtọ ma anyị gaa mgbakọ ma ọ bụrụ na anyị ewepụta onwe anyị gaa nye aka rụọ ọrụ ndị dị mkpa ka a rụọ n’ala mgbakọ. (Ọrụ 20:35) Onye ọ bụla chọrọ inye aka kwesịrị ịga na Ngalaba Na-ahụ Maka Ozi Afọ Ofufo n’ala mgbakọ ahụ. Ụmụaka ndị na-erubeghị afọ iri na isii nwekwara ike inye aka. Ha kwesịrị ịrụ ọrụ ebe onye ọzọ ga-elebara ha anya, o nwere ike ịbụ nne ha ma ọ bụ nna ha ma ọ bụ onye ọzọ toro eto nne ha ma ọ bụ nna ha kwetara ka o lebara ha anya.
◼ Ụlọ Obibi: (1) Gosi na i nwere àgwà e ji mara onye mmụọ Chineke na-edu mgbe ị gara ka e nye gị ụlọ n’ebe a na-eme mgbakọ. (2) Anọla n’ụlọ obibi ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ nyere gị ya. Nọrọ naanị n’ebe ha nyere gị ụlọ. (3) Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, anọtela aka n’abalị n’ụlọ e nyere ụmụnna ndị nwaanyị ma ọ bụ hie ebe ahụ. Ụmụnna nwaanyị ekwesịghịkwa ime otú ahụ. (4) Ọ bụrụ na e nwee nsogbu n’ebe e nyere gị ụlọ, hụ na ị gwara ndị na-ahụ maka ụlọ ozugbo. (5) Ọ bụrụ na e nyere gị ụlọ na họtel, mee ihe otú ndị họtel ahụ chọrọ ka e si na-eme. (6) Esila nri n’ebe a na-achọghị ka a nọrọ sie nri. (7) Esila nri mgbe ihe omume na-aga n’ihu n’ihi na nke ahụ anaghị egosi na i ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.—Luk 10:38-42.
◼ Ụgbọala: Mgbe a na-achọta ụgbọala a ga-eji aga mgbakọ n’afọ a, mmadụ niile kwesịrị icheta na ndụ bụ ihe dị nsọ. Ndị okenye kwesịrị ịhụ na ụgbọala a chọtara bụ nke ahụ́ dị mma, taya ya, brek ya, na ọkụ ya kwesịrị ịdịcha mma. Ọ bụ eziokwu na inweta ụgbọala ahụ́ dị mma nwere ike ịdị oké ọnụ, ọ ka mma inweta ụgbọala ga-eburu mmadụ ebe ọ na-aga n’udo. Ọ dịkwa mma ịchọta ọkwọ ụgbọala na-agaghị esi ọnwụ ma a gwa ya mee ihe ndị a dị mkpa: na ọ gaghị ebu karịa ka o kwesịrị ibu, ọ gaghị agba ọnwụ ọnwụ, ọ ga-ezu ike nke ọma n’abalị ga-abọta ụbọchị ọ ga-ebu unu aga mgbakọ, nakwa na ọ gaghị aṅụ mmanya na-aba n’anya tupu ya anyawa ụgbọala nakwa mgbe ọ na-anya ụgbọala. Unu ejikwala okwu ịgaru ala mgbakọ n’udo egwuri egwu; meenụ ihe niile unu nwere ike ime iji zere ọdachi.—Ilu 22:3.